Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Ihe A M Koteere Onwe M?

Gịnị Bụ Ihe A M Koteere Onwe M?

Akwụkwọ Ozi Si Benin

Gịnị Bụ Ihe A M Koteere Onwe M?

EBI M ná mba Benin nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Afrịka. Ị pụtahaala n’ụtụtụ, ị ga na-anụ ísì osikapa na stuu n’ebe niile. Ebe i lere anya, ị ga-ahụ ụmụ nwaanyị ndị bu nnukwu ibu n’isi na-aga ebe ha na-aga. Ị ga-anụkwa ọchị ndị mmadụ na-achị, nụkwa ka ndị bịara ịzụ ahịa na-ekwe ọnụ ahịa. Anwụ achasiwekwala ike n’agbanyeghị na ihe a ka bụ ụtụtụ.

Mgbe ụmụaka hụrụ m, ha kpọrọ m Yovo. Ihe a bụ ihe ha na-akpọ onye ọcha. Ha malitekwara ịgụrụ m egwú, na-agbakwa ya agba. Ọ bụ otú ha na-eme ma ha hụ onye ọcha. Otú ha si malite egwú ahụ bụ “Yovo, Yovo, ị̀ bọọla chi?” Ihe ha kwuru mgbe ha chọrọ ịkwụsị egwú ahụ bụ, “Chọọrọ anyị ihe maka egwú anyị gbaara gị?” Achọpụtara m na e nwere otu nwata nwoke na-esoghị ha na-agụ egwú ahụ. Mgbe m hapụrụ ụmụaka ahụ gawa ebe m na-aga, o sooro m ma jiri aka na-agwa m okwu. O yiri ka ọ̀ na-asụrụ m asụsụ ndị ogbi. N’oge m nọ n’Amerịka, m mụtatụrụ otú e si asụpe mkpụrụ akwụkwọ n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka. Ma ihe bụ́ nsogbu bụ na a naghị asụ Bekee ná mba Benin. Ihe a na-asụ na ya bụ French.

M jisiri ike were mkpịsị aka sụpeere nwata nwoke ahụ aha m. Mgbe m gwachara ya aha m, ọ mụmụrụ ọnụ ọchị, jide m n’aka ma duru m gawa n’obere ụzọ e si aga n’ụlọ ha. Anyị mechara ruo n’ụlọ ha. E ji blọk rụọ ya, ọ dịkwa ọnụ ụlọ abụọ. Ndị ezinụlọ ha pụtara gbaa m okirikiri. Ha niile na-asụ asụsụ ndị ogbi. Gịnịzi ka m ga-eme? M jikwa mkpịsị aka m sụpeere ha aha m ma deere ha n’akwụkwọ na m si mba ọzọ bịa ikwusa ozi ọma n’ebe a, nakwa na m ga-abịaghachi n’ụlọ ha mgbe ọzọ. Ụfọdụ ndị agbata obi ha ndị na-anụ ihe pụtakwara. Ka m na-ekwu okwu, ha na-ekwe n’isi. M nọ na-ajụ onwe m, sị, ‘Gịnị bụ ihe a m koteere onwe m?’

Mgbe m laruru ụlọ, m nọ na-ekwu n’obi m na a ga-enweta onye ga-enyere ndị ahụ aka ka ha mata nkwa Chineke, nke bụ́ na ‘a ga-emeghe ntị nke ndị ntị chiri.’ (Aịzaya 35:5) M metụrụ nchọpụta ma hụ na mgbe a gụrụ ndị mmadụ ọnụ n’oge na-adịbeghị anya, e nwere puku mmadụ iri na puku abụọ bụ́ ndị ogbi na ndị ntị chiri ná mba a. O juru m anya mgbe m chọpụtara na ọ bụ Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka ka a na-akụziri ndị ogbi n’ụlọ akwụkwọ ha, ọ bụghị Asụsụ Ndị Ogbi nke French. Ma o wutere m nke ukwuu mgbe m chọpụtara na o nweghịdị Onyeàmà Jehova nọ ná mba a nke ma Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka. M gwara otu Onyeàmà Jehova bụ́ onye Benin, sị, “Ọ dị m ka ya bụrụ na e nwere Onyeàmà Jehova ma Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka, ka ọ bịa kụziwere ha Baịbụl.” Ihe ọ zara m bụ, “À na-achọ onye ga-akụziri ha Baịbụl achọ mgbe gịnwa nọ ebe a?” Ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. Ihe m meziri bụ na m ziri ozi ka e wetara m akwụkwọ mmadụ nwere ike iji mụọ asụsụ ndị ogbi n’onwe ya nakwa diiviidi Ndịàmà Jehova mepụtara maka ndị ogbi. Chineke zakwara ekpere m n’ihi na otu Onyeàmà Jehova nke maara Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka nke ọma si Kamerun kwafeta mba Benin.

Ọtụtụ ndị bịaziri nụ na mụ amụwala asụsụ ndị ogbi. A gwara m ka m gaa zie otu nwa okorobịa aha ya bụ Brice ozi ọma. Nwa okorobịa a na-edere ndị mmadụ ihe na saịn bọọdụ. Mgbe m rutere, m hụrụ na e ji igu nkwụ rụọ ebe ọ na-anọ arụ ọrụ. Ezigbo ikuku na-abata na ya n’agbanyeghị oké anwụ na-achanụ. Ị hụ otú o si tekasịchaa ágbá n’ahụ́ ájá ụlọ ọrụ ya, ị ga-ama na ọ rụọla ọrụ a ọtụtụ afọ. Mgbe m batara n’ebe ahụ ọ na-arụ ọrụ, o hichaara m oche ka m nọdụ ọdụ, lewezie m anya ka m bido. M tinyeere ya otu diiviidi m ji bịa ka o kirie. O buuru oche ya bịa nso ka o kirie diiviidi ahụ. Ka ọ nọ na-ekiri ya, ọ nọ na-ekwu n’asụsụ ndị ogbi na ọ na-aghọta ihe ọ na-ekiri. Ọtụtụ ụmụaka gbakọrọ ebe ahụ, na-amatị olu ha ka ha soro kirie diiviidi ahụ. Otu nwatakịrị jụrụ, sị: “Gịnị mere ndị a ji na-ekiri fim a na-anaghị anụ ihe ọ na-ekwu?”

Ụbọchị ọ bụla m bịara ịhụ Brice, ndị na-agbakọta ka ha kirie diiviidi m ji bịa na-aka mmadụ ole bịara n’ụbọchị ndị gara aga m bịara. O teghị aka, Brice na ndị ọzọ amalite ịbịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ihe so nyere m aka ịmụtakwu asụsụ ndị ogbi bụ na m na-eji ya akọwara ha ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe. Mgbe ndị ogbi na-abịa ọmụmụ ihe bịara dịkwuo ọtụtụ, ụfọdụ n’ime ha malitere iji aka ha na-achọgharị m ka m kụziere ha Baịbụl. Dị ka ihe atụ, o nwere otu ụbọchị m bu ụgbọala m merela ochie na-aga n’ụzọ. M tinyere isi n’ebe ụzọ na-adịghị mma ebe m na-eze ewu na ézì ndị na-akpagharị n’ụzọ. Ka m nọ na-achọ otú m ga-esi pụta n’ebe ahụ, m nụrụ mkpọtụ n’azụ ụgbọala m, mụ echee na o mebiela ọzọ. Ma o mebighị emebi. Kama otu nwoke onye ogbi kụrụ aka n’ụgbọala m. Ọ chọrọ ka m kwụsị ka mụ na ya hụ. Ọ kụsiri aka ahụ ike maka na ọ maghị otú ọzọ ọ ga-esi mee ka m kwụsị.

Ka oge na-aga, a malitere inwe ọtụtụ ndị ogbi e ji Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka akụziri ihe n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ebe dị iche iche ná mba Benin. N’afọ a malitere inwe ebe ndị ogbi na-anọ ma e nwee Mgbakọ Distrikti nke Ndịàmà Jehova, eso m ná ndị ji asụsụ ndị ogbi kọwaara ha ihe a na-ekwu. Ná mgbakọ ahụ, m gbagooro n’ebe m ga-akwụrụ kọwaara ha ihe a na-ekwu. Ka m kwụ na-eche ka onye ga-ekwu okwu malite okwu ya, echetara m oge m malitere ikwusa ozi ọma n’ebe a. N’oge ahụ, m jụrụ onwe m, sị, ‘Ò nwere ndị ọzọ m ga-enyekwuru aka n’Afrịka a m bịara ikwusa ozi ọma?’ Ka m na-ele ndị ogbi ahụ bịara mgbakọ ahụ, o doro m anya na e nwere ndị m ga-enyekwuru aka, ya bụ, ndị ogbi. Anaghịzi m ajụ onwe m, ‘Gịnị bụ ihe a m koteere onwe m?’