Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: OLEE MGBE ỊKPỌASỊ NA-AGAGHỊ ADỊKWA N’ỤWA?

Ịkpọasị Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Ịkpọasị Bụ Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

E NWERE otu nwoke aha ya bụ Jonathan. A mụrụ ya n’Amerịka, ma nne na nna ya bụ ndị Koria. Ọ sịrị na mgbe ya bụ nwata, ndị mmadụ kpọrọ ya asị maka na onye hụrụ ya ga-ama na ya bụ onye Koria. O mechara ghọọ dọkịta n’otu obodo dị n’ebe ugwu Alaska, n’Amerịka. N’obodo ahụ, ọtụtụ ndị ọ na-agwọ ọrịa yikwara ndị Koria. O chere na o nweghị onye ga-akpọkwa ya asị n’ebe ahụ ọ gara biri.

Ma, ihe ọ na-atụghị anya ya mere otu ụbọchị mgbe ọ na-agwọ otu nwaanyị ọrịa. Nwaanyị ahụ dị afọ iri abụọ na ise. Mgbe nwaanyị ahụ nwetara onwe ya, lee Jonathan anya n’ihu ma hụ na ọ bụ onye Koria, ọ kpọrọ ya iyi. Ihe a nwaanyị ahụ mere bụ ihe a kụziiri ya kemgbe ọ dị obere. A kụziiri ya ka ọ kpọọ ndị Koria asị. Ihe a nwaanyị ahụ mere wutere Jonathan. Nke a mere ka ọ ghọta na mgbalị niile ahụ o mere ka ọ nọrọ n’ebe ọ na-enweghị onye ga-akpọ ya asị kụrụ afọ n’ala.

Ihe a mere Jonathan na-egosi anyị na o nweghị ebe ịkpọasị na-adịghị. E nwere ike ikwu na ebe  ọ bụla ndị mmadụ nọ, a ga-enwerịrị ndị kpọrọ ibe ha asị.

N’agbanyeghị na ịkpọasị zuru ebe niile, ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ dịghị mma. Oleezi otú ihe a ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ dịghị mma si ju ebe niile? Ọ ga-abụ na ihe kpatara ya bụ na imerime ndị na-ekwu na ịkpọasị adịghị mma chere na hanwa akpọghị ndị ọzọ asị. Gịnwakwanụ? Ì so ná ndị chere na ha akpọghị ndị ọzọ asị?

Ọ GBASARA ONYE Ọ BỤLA N’IME ANYỊ

Ma ànyị kwere ma ànyị ekweghị, ọ naghị adịrị anyị mfe ịmata na anyị kpọrọ ndị ọzọ asị n’obi anyị. Baịbụl kwuru ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ.” (Jeremaya 17:9) N’ihi ya, obi anyị nwere ike ịghọgbu anyị, anyị echee na o nwetụdịghị ndị anyị kpọrọ asị. Ma ọ bụkwanụ anyị nwere ike iche na o nwere ezigbo ihe mere anyị ji kpọọ ụfọdụ ndị asị.

Ọ bụrụ na ọ bụ gị ka ndị a na-abịakwute n’abalị, olee ihe obi gị ga-agwa gị?

Dị ka ihe atụ, weregodị ya na ị na-aga n’ụzọ n’abalị, gị ahụ ụmụ okorobịa abụọ ndị na-abịakwute gị. Ị hụtụbeghị ụmụ okorobịa ahụ mbụ, ha gbara agba, ọ dịkwa gị ka ò nwere ihe otu onye n’ime ha ji n’aka.

Ị̀ ga-ekwu n’obi gị na ụmụ okorobịa ahụ na-abịa ime gị ihe ọjọọ? Ọ bụ eziokwu na ihe ndị mere gị n’oge gara aga nwere ike ime ka i chee na agwọ dị n’akịrịka. Ma ọ̀ bụ ihe ndị ahụ ga-eme ka i kwuo na ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị ọjọọ? Ajụjụ ọzọ ka mkpa bụ, Olee agbụrụ ma ọ bụ obodo ị ga-eche na ụmụ okorobịa ahụ si? Ihe ọ bụla ị zara ga-egosi ihe dị gị n’obi. O nwere ike igosi na o nwere ndị ị kpọrọ asị n’obi gị.

Ọ bụrụ na anyị agwa onwe anyị eziokwu, anyị ga-ekweta na o nwere ndị anyị kpọrọ asị n’obi anyị, ọ bụrụgodị na anyị akpọchaghị ha asị otú ndị ọzọ kpọrọ ha. Baịbụl kwuru ihe mere ụmụ mmadụ ji akpọkarị ụfọdụ ndị asị. Ọ sịrị: “Mmadụ na-ele anya n’elu ahụ.” (1 Samuel 16:7, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ihe a Baịbụl kwuru gbasara anyị niile. Ọ bụ ya na-emekarị ka anyị na-akpọ ndị ọzọ asị. Ma ajụjụ bụzi, Ò nwere mgbe anyị ga-akwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị? Ò nwere mgbe ịkpọasị na-agaghịzi adị n’ụwa?