Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLE NDỊ BỤ NDỊÀMÀ JEHOVA?

Olee Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Arụ Ihe Ndị Anyị Na-arụ?

Olee Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Arụ Ihe Ndị Anyị Na-arụ?

N’afọ ọ bụla, anyị na-ebipụta ọtụtụ narị nde Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-enyekwa ha ndị mmadụ. Anyị na-arụ alaka ụlọ ọrụ nakwa ebe ndị anyị na-anọ ebi akwụkwọ n’ụwa niile. Anyị nwekwara ọtụtụ puku ọmarịcha ụlọ ndị anyị na-anọ efe Chineke. Anyị na-akpọ ụlọ ndị a Ụlọ Nzukọ Alaeze. Olee otú anyị si enweta ego anyị ji arụ ihe ndị a niile?

Ọ bụ onyinye sí ndị mmadụ n’obi ka e ji arụ ihe ndị a niile. (2 Ndị Kọrịnt 9:7) Ụlọ Nche Bekee nke August 1879, kwuru, sị: “Anyị kweere na onye na-akwado mbipụta Ụlọ Nche bụ JEHOVA. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ dịghị mgbe a ga-arịọ ndị mmadụ ego ma ọ bụ gwa ha ka ha nye ego a ga-eji na-ebipụta ya.” Anyị ka kwụsiri ike n’ihe a Ụlọ Nche ahụ kwuru.

Ụfọdụ ndị na-eziga onyinye ha n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche, ndị ọzọ na-etinye nke ha n’igbe onyinye ndị na-adị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Ma, o nweghị onye anyị na-asị kwụọ otu ụzọ na ụzọ iri, anyị anaghịkwa ebugharị igbe ma ọ bụ efere onyinye ka ndị mmadụ tinye ego. Anyị kụziere mmadụ Baịbụl ma ọ bụ nye onye ahụ akwụkwọ anyị, anyị anaghị asị ya kwụọ ụgwọ. O nweghị onye n’ime anyị a na-akwụ ụgwọ maka ozi ọma ọ na-ezi, ma ọ bụ ihe ọ na-akụzi n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ maka aka o nyere rụọ ebe ndị anyị na-anọ efe Chineke. A sị ka e kwuwe, Jizọs gwara anyị, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) A bịa ná ndị na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’isi ụlọ ọrụ anyị, ma ndị só n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, o nweghị onye n’ime ha a na-akwụ ụgwọ ọnwa.

“Ọ bụ ego ndị a na-enye n’onyinye ka Ndịàmà Jehova ji arụ ihe niile ha na-arụ. Onye ọ bụla na-ekpebi ihe ọ ga-enye n’onyinye nakwa mgbe ọ ga-enye ya.”—Ọ bụ Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kwuru ihe a n’afọ 2011

A na-esikwa n’onyinye ndị e nyere agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Ndị mbụ soro ụzọ Kraịst gbataara ndị ọdachi dakwasịrị n’oge ha ọsọ enyemaka. (Ndị Rom 15:26) E nweekwa ebe ndị ọdachi kpara mkpamkpa taa, anyị na-aga rụọrọ ndị ụlọ ha dara ụlọ, rụghachi ụlọ ebe ndị anyị na-anọ efe ofufe, nye ndị mmadụ nri na uwe, nyekwara ndị merụrụ ahụ́ aka.