Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Nwere Ndị Pastọ?

Ndịàmà Jehova Hà Nwere Ndị Pastọ?

 Ndịàmà Jehova na-eme otú Ndị Kraịst e nwere n’oge ndịozi Jizọs mere. Anyị enweghị ndị pastọ. Onye ọ bụla e mere baptizim n’ọgbakọ anyị bụ onye Chineke họpụtara ijere ya ozi, anyị niile na-ekwusakwa ozi ọma. Anyị nwere ọgbakọ dị iche iche, ihe dị ka otu narị mmadụ nọkwa n’ọgbakọ nke ọ bụla. Ndị ikom ma nke a na-akọ na-ahazi otú ihe si aga n’ọgbakọ ọ bụla. A na-akpọ ha “ndị okenye.” (Taịtọs 1:5) A naghị akwụ ha ụgwọ maka ọrụ ha na-arụ.