Gaa n'Isiokwu

Olee Ihe Mere Ndịàmà Jehova Na-eji Agaghachi na nke Ndị Sịburu Ha, “Enweghị M Mmasị”?

Olee Ihe Mere Ndịàmà Jehova Na-eji Agaghachi na nke Ndị Sịburu Ha, “Enweghị M Mmasị”?

 Ndịàmà Jehova hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya, ọ bụ ya mere ha na-eji aga ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụkwa ya mere ha na-eji agaghachi na nke ndị sịburu na ‘ha enweghị mmasị.’ (Matiu 22:37-39) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ mere anyị ji na-eme ihe Ọkpara ya nyere n’iwu nke bụ́ “ịgba àmà nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:42; 1 Jọn 5:3) Ọ bụ ya mere anyị ji na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ọtụtụ ugboro, otú ahụ ndị amụma Chineke mere n’oge ochie. (Jeremaya 25:4) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị agbata obi anyị nọ mere anyị ji ezi mmadụ niile ma ndị na-enweghị mmasị ná mbụ, “ozi ọma nke a nke alaeze” bụ nke na-azọ ndụ.—Matiu 24:14.

 Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ anyị laghachi na nke ndị na-achọbughị ige ntị, ha na-ege ntị. Lee ihe atọ mere anyị na-eji agaghachi:

  •   Ndị mmadụ nwere ike ịkwapụ na-ebe ha bibu.

  •   Ndị ọzọ bi n’ụlọ ahụ nwere ike inwe mmasị n’ozi anyị.

  •   Ihe nwere ike ịgbanwe ná ndụ mmadụ. Ihe ndị na-eme n’ụwa ma ọ bụkwanụ otú ihe si dịrị mmadụ nwere ike ime ka ụfọdụ ndị chọwa otú ha ga-esi gboo “mkpa ime mmụọ ha.” O nwekwara ike ime ka ha bido ige ntị n’ozi ọma. (Matiu 5:3) Mgbe ụfọdụ, ndị na-emegide anyị nwedịrị ike ịgbanwe, otú ahụ Pọl onyeozi mere.—1Timoti 1:13.

 Mana, anyị anaghị amanye ndị mmadụ ige ntị n’ozi ọma anyị. (1 Pita 3:15) Anyị maara na ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme ma a bịa n’ihe gbasara ife Chineke.—Diuterọnọmi 30:19, 20.