Gaa n'Isiokwu

Ùnu Bụ Ndị Kraịst?

Ùnu Bụ Ndị Kraịst?

 Ee. Anyị bụ Ndị Kraịst. Lee ihe ndị mere anyị ji sị na anyị bụ Ndị Kraịst:

  •   Anyị na-agba mbọ ịkụzi ihe Jizọs Kraịst kụziri, na-agbakwa mbọ ịkpa àgwà ka ya.—1 Pita 2:21.

  •   Anyị kweere na ọ bụ n’aka Jizọs ka anyị ga-esi nweta nzọpụta, kwerekwa na “aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyere ụmụ mmadụ, nke a ga-eji zọpụta anyị.”—Ọrụ Ndịozi 4:12.

  •   A na-eme ndị na-aghọ Ndịàmà Jehova baptizim n’aha Jizọs.—Matiu 28:18, 19.

  •   Anyị na-ekpe ekpere n’aha Jizọs.—Jọn 15:16.

  •   Anyị kweere na Jizọs bụ Isi nke nwoke ọ bụla.—1 Ndị Kọrịnt 11:3.

 Ma, e nwere ihe ụfọdụ anyị ji dị iche na chọọchị ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst. Anyị kweere na Jizọs bụ Ọkpara Chineke dị ka Baịbụl kwuru, ọ bụghị Pesịn nke abụọ nke Atọ n’Ime Otu. (Mak 12:29) Anyị ekwetaghị na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, anyị ekwetaghịkwa na Baịbụl kwuru na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Anyị ekweghị na ndị na-edu ndú ná nzukọ Chineke kwesịrị inwe aha pụrụ iche a ga na-etu ha iji gosi na ha karịrị ndị ọzọ.—Ekliziastis 9:5; Ezikiel 18:4; Matiu 23:8-10.