Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Na-agwa Ndị Òtù Ha Aha Fim, Akwụkwọ, na Egwú Ndị Ha Ga-ezere?

Ndịàmà Jehova Hà Na-agwa Ndị Òtù Ha Aha Fim, Akwụkwọ, na Egwú Ndị Ha Ga-ezere?

 Mba. Ọgbakọ Ndịàmà Jehova anaghị aga nyochawa fim, akwụkwọ, na egwú dị iche iche ka ha mara ndị nke ha ga-asị ndị òtù ha zere. Gịnị mere ha anaghị eme otú ahụ?

  Baịbụl gwara onye ọ bụla n’ime anyị ka ọ zụọ “ikike nghọta” ya iji mata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.—Ndị Hibru 5:14.

  Baịbụl kwukwara ihe ndị ga-enyere Onye Kraịst aka ịma ụdị ihe ọ ga-eji atụrụ ndụ. a Dị ka ọ dị n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ, mkpa anyị bụ ‘ịna-achọpụta ihe dị Onyenwe anyị mma.’​—Ndị Efesọs 5:10.

  Baịbụl kwuru na ndị isi ezinụlọ nwere ikike iti iwu ụfọdụ n’ezinụlọ ha. N’ihi ya, ha nwere ike ikpebi ihe ndị ha na-achọghị ka ndị ezinụlọ ha jiri na-atụrụ ndụ. (1 Ndị Kọrịnt 11:3; Ndị Efesọs 6:1-4) Ma, o nweghị onye e nyere ikike ịmachi ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ Chineke ile fim ụfọdụ, ige egwú ụfọdụ, ma ọ bụ ịgụ akwụkwọ ụfọdụ.​—Ndị Galeshia 6:5.

a Dị ka ihe atụ, Baịbụl kagburu ihe ọ bụla na-akwalite ime mgbaasị, omume rụrụ arụ, ịkwa iko, ma ọ bụ ime ihe ike.​—Diuterọnọmi 18:10-13; Ndị Efesọs 5:3; Ndị Kọlọsi 3:8.