Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma M Daa Mbà n’Obi?

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma M Daa Mbà n’Obi?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee, o nwere ike inyere gị aka, n’ihi na onye ga-akacha enyere gị aka bụ Chineke. Baịbụl kwuru na Chineke bụ “onye nkasiobi nke ndị obi dara mba.”​—2 Ndị Kọrịnt 7:6, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe Chineke na-enye ndị dara mbà n’obi

  •   Ike. Otú Chineke ga-esi akasi gị obi abụghị iwepụ nsogbu gị niile. Kama, ihe Chineke ga-emere gị bụ ịza ekpere i kpegaara ya ka o nye gị ike ị ga-eji die nsogbu ndị bịaara gị. (Ndị Filipaị 4:13) Obi kwesịrị isi gị ike na Jehova ga-aza ekpere gị n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Chineke nwedịrị ike ịnụ mkpu ị na-eti ka o nyere gị aka, a sịgodị na ị maghị otú ị ga-esi kọwaa ihe bụ́ nsogbu gị.​—Ndị Rom 8:26, 27.

  •   Ndị anyị ga-amụta ihe n’aka ha. Otu onye so dee Baịbụl kpegaara Chineke ekpere, sị: “Anọ m n’ime ogbu mmiri kpọkuo gị.” Ihe nyeere onye a so dee Baịbụl aka ka ọ kwụsị ịda mbà n’obi bụ na o chetara na Chineke na-agbaghara anyị mmehie. O kwuru, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo? N’ihi na ezi mgbaghara dị n’aka gị, ka e wee na-atụ egwu gị.”​—Abụ Ọma 130:1, 3, 4.

  •   Olileanya. Ọ bụ eziokwu na Chineke na-akasi anyị obi ugbu a, o kwekwara anyị nkwa na ya ga-ewepụ nsogbu niile na-akpatara anyị ịda mbà n’obi. Mgbe ọ ga-emezu nkwa a, “a gaghị echeta ihe mbụ niile [ma ịda mbà n’obi], ha agaghị abatakwa n’obi.”​—Aịzaya 65:17.

 Ihe ị ga-eburu n’obi: N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova ma na Chineke na-enyere ndị dara mbà n’obi aka, ha chọpụta na ịda mbà n’obi ha aghọọla ọrịa, ha na-aga ụlọ ọgwụ. (Mak 2:17) Ma, Ndịàmà Jehova anaghị agwa onye nwere ụdị ịda mbà n’obi a otú a ga-esi agwọ ya. Ọ bụ onye ahụ ka ọ dịịrị ikpebi otú a ga-esi agwọ ya.