Gaa n'Isiokwu

Olee Otú Jizọs Si Azọpụta Anyị?

Olee Otú Jizọs Si Azọpụta Anyị?

Ihe Baịbụl kwuru

 Jizọs zọpụtara ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi mgbe o ji ndụ ya chụọ àjà. (Matiu 20:28) Ma, Baịbụl kpọrọ Jizọs “Onye Nzọpụta nke ụwa.” (1 Jọn 4:14) O kwukwara, sị: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ, n’ihi na aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyere ụmụ mmadụ, nke a ga-eji zọpụta anyị.”—Ọrụ Ndịozi 4:12.

 Jizọs ‘detụrụ ọnwụ ire maka mmadụ niile’ nwere okwukwe na ya. (Ndị Hibru 2:9; Jọn 3:16) N’ihi ya, “Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya,” ya alaghachi n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke. (Ọrụ Ndịozi 3:15) Mgbe Jizọs ruru ebe ahụ, o nweziri ike “ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe niile ịrịọrọ ha arịrịọ.”—Ndị Hibru 7:25.

Gịnị mere o ji dị anyị mkpa ka Jizọs rịọchitere anyị arịrịọ?

 Anyị niile bụ ndị mmehie. (Ndị Rom 3:23) Mmehie mere ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma, na-akpatakwara anyị ọnwụ. (Ndị Rom 6:23) Ma, Jizọs bụ ‘onye na-ekwu ọnụ ndị niile nwere okwukwe na ya.’ (1 Jọn 2:1, Bible Nsọ nke Union Version) Ọ na-ekwuchite ọnụ ha, na-arịọ Chineke ka ọ nụ ekpere ha ma gbaghara ha n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Matiu 1:21; Ndị Rom 8:34) Chineke na-eme ihe ahụ Jizọs rịọchiteere anyị n’ihi na ha kwekọrọ n’uche Ya. Chineke zitere Jizọs n’ụwa “ka e wee site n’aka ya zọpụta ụwa.”—Jọn 3:17.

Ọ̀ bụ onye kwerehaala na Jizọs a zọpụta ya?

 Mba. Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị ibu ụzọ kwere na Jizọs tupu enwewe ike ịzọpụta anyị. Ma, e nwere ihe ọzọ dị mkpa. (Ọrụ Ndịozi 16:30, 31) Baịbụl kwuru, sị: “Dị ka ahụ́ nke na-enweghị mmụọ bụ ihe nwụrụ anwụ, otú ahụkwa, okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ ihe nwụrụ anwụ.” (Jems 2:26) Ka e nwee ike ịzọpụta anyị, anyị kwesịrị:

  •   Ịmụta gbasara Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova.—Jọn 17:3.

  •   Inwe okwukwe na ha.—Jọn 12:44; 14:1.

  •   Irubere ha isi iji gosi na anyị nwere okwukwe na ha. (Luk 6:46; 1 Jọn 2:17) Jizọs kwuru na ọ bụghị onye ọ bụla na-akpọ ya “Onyenwe anyị” ka a ga-azọpụta, kama ọ bụ naanị ndị “na-eme uche Nna [ya] nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.”—Matiu 7:21.

  •   Ịnọgide na-egosi na anyị nwere okwukwe n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe. Jizọs mere ka nke a doo anya mgbe o kwuru, sị: “Onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13.