Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ndị Rom 15:13​—“Ka Chineke Onye Na-enye Olileanya Ahụ, Mejupụta Ụnụ n’Ọṅụ na n’Udo”

Ndị Rom 15:13​—“Ka Chineke Onye Na-enye Olileanya Ahụ, Mejupụta Ụnụ n’Ọṅụ na n’Udo”

 “Ka Chineke onye na-eme ka anyị nwee olileanya mee ka unu nwee ọṅụ na udo zuru ezu ebe ọ bụ na unu tụkwasịrị ya obi, ka ike mmụọ nsọ wee mee ka unu nwee olileanya.”​—Ndị Rom 15:13, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Ka Chineke onye na-enye olileanya ahụ, mejupụta ụnụ n’ọṅụ na n’udo, site n’okwukwe ụnụ nwere na ya. Ya mee ka olileanya ụnụ bawanye ụba, site n’ike nke Mmụọ Nsọ.”​—Ndị Rom 15:13, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik

Ihe Ndị Rom 15:13 Pụtara

 Pọl onyeozi ji okwu ndị a na-arịọ Chineke ka o mee ka Ndị Kraịst ibe ya “nwee ọṅụ na udo.” Enwere ihe jikọrọ ọṅụ na udo na olileanya Chineke na-enye na ike mmụọ nsọ.

 Ọ bụ na Baịbụl ka anyị na-amụta gbasara olileanya a Chineke na-enye. Dị ka Ndị Rom 15:4 si kwuo, “e dere ihe niile e dere n’oge gara aga ka e jiri ha kụziere anyị ihe, ka obi anyị na-atachi na nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.” Ọ bụ Baịbụl gwara anyị na Chineke kwere nkwa iwepụrụ anyị nsogbu niile na-echi anyị ọnụ n’ala taa, dị ka ịda ogbenye, ikpe na-ezighị ezi, ọrịa na ọnwụ. (Mkpughe 21:4) Chineke ga-esi n’aka Jizọs Kraịst mezuoro anyị ihe a niile. Ọ bụ ya mere anyị ji nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.​—Ndị Rom 15:12.

 Anyị nwere ike ‘inwe ọṅu a’ Chineke na-enye ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Chineke obi. Ka anyị na-amụtakwu gbasara Chineke, ka obi na-esikwu anyị ike na anyị nwere ike ịdabere n’ebe ọ nọ kpam kpam. (Aịzaya 46:10; Taịtọs 1:2) Olileanya a Chineke na-enye na-eme ka mmadụ nwee udo na ọṅụ, ọbrụrụgodi na ihe na-esiri ya ike.​—Ndị Rom 15:12.

 E nwere ihe jikọrọ udo na ọṅụ na “mmụọ nso,” nke bụ́ ike Chineke ji arụ ọrụ. a Chineke na-eji mmụọ nsọ ya emezu nkwa ndị o kwere, nke a na-emekwa ka anyị nwee olileanya. Mmụọ nsọ nwere ike inyere mmadụ aka ịna-enwe ọṅụ na udo.​—Galeshia 5:22.

Ihe Ndị Gbara Ndị Rom 15:13 Gburugburu

 Ọ bụ Ndị Kraịst bi na Rom ka e degaara akwụkwọ Ndị Rom. Ụfọdụ n’ime Ndị Kraịst ndị ahụ bụ ndị Juu, ebe ụfọdụ n’ime ha n’abụghị. Pọl gbara ha niile ume ka ha gbasie mbọ ike na-adị n’udo n’abanyeghị na agbụrụ ha na omenala ha dị iche iche.​—Ndị Rom 15:6.

 Pọl chetaara Ndị Kraịst bi na Rom na ọ dịla anya Chineke kwuru na oge na-abịa mgbe ndị si ná mba niile ga-eji otu obi na-efe ya. Iji mee ka ihe a ọ na-ekwu dokwuo ha anya, Pọl gwara ha ihe e dere n’ụzọ ebe anọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru b. (Ndị Rom 15:​9-12) Ihe Pọl na-ekwu bụ na ọ bụghị naanị ndị Juu ka ozi ọma Kraịst ziri ga-abara uru. Olileanya a ga-abara ma ndị Juu ma ndị na-abụghị ndị Juu uru. N’ihi ya, ndị niile nọ n’ọgbakọ ahụ dị na Rom kwesịrị ‘ịnabata ibe ha,’ ya bụ, iji obi ha niile na-ele ndị ọzọ ọbịa.​—Ndị Rom 15:7.

a Ọ bụrụ na i chọrọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị bụ Mmụọ Nsọ?

b A na-akpọkwa Akwụkwọ Nsọ Hibru Agba Ochie.