Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?
Ihe Baịbụl Kwuru
Mmụọ nsọ bụ ike Chineke ji arụ ọrụ. (Maịka 3:8; Luk 1:35) Chineke na-ezipụ mmụọ nsọ ebe ọ bụla ọ chọrọ ka o mezuo uche ya.—Abụ Ọma 104:30; 139:7.
E si n’okwu Hibru bụ́ ruʹach na okwu Grik bụ́ pneuʹma sụgharịta okwu bụ́ mmụọ e dere na Baịbụl. N’ọtụtụ ebe e dere okwu abụọ a na Baịbụl, ihe a na-ekwu banyere ya bụ ike Chineke ji arụ ọrụ, ya bụ, mmuọ nsọ. (Jenesis 1:2) Ma, o nwekwara ebe ndị e dere ha na Baịbụl, ya abụrụ ihe ndị ọzọ ka a na-ekwu. Dị ka ihe ndị a:
Ume ndụ.—Habakọk 2:19; Mkpughe 13:15.
Ifufe.—Jenesis 8:1; Jọn 3:8.
Ihe na-eme ka ihe ndị dị ndụ nwee ike ịnọgide na-adị ndụ.—Job 34:14, 15.
Otú mmadụ si ele ihe anya ma ọ bụ àgwà mmadụ.—Ọnụ Ọgụgụ 14:24.
Ndị mmụọ, ma Chineke ma ndị mmụọ ozi sokwa.—1 Ndị Eze 22:21; Jọn 4:24.
Ihe a niile bụ ihe ụmụ mmadụ na-anaghị ahụ anya, ma, a na-ahụ ihe ndị ha na-eme ná ndụ mmadụ anya. Ọ bụ otú a ka mmụọ nsọ dị. Akwụkwọ bụ́ An Expository Dictionary of New Testament Words, nke W. E. Vine dere kwuru banyere ya. Ọ sịrị: “Ọ dị ka ifufe. A naghị ahụ ya anya, a naghịkwa emetụ ya aka, ma ọ na-akpa ike.”
N’ebe ụfọdụ na Babụl, e kwukwara banyere ihe mmụọ nsọ mere ka ihe “aka” ya ma ọ bụ “mkpịsị aka” ya mere. (Abụ Ọma 8:3; 19:1; Luk 11:20; tụlee Matiu 12:28.) Otú ahụ omenkà na-eji aka ya ma ọ bụ mkpịsị aka ya arụ ọrụ ka Chineke ji mmụọ nsọ arụ ọrụ. Lee ihe ụfọdụ Chineke ji mmụọ nsọ mee ka ha kwe omume ma ọ bụ mee ka ha dịrị:
Eluigwe na ụwa.—Abụ Ọma 33:6; Aịzaya 66:1, 2.
Baịbụl.—2 Pita 1:20, 21.
Ọrụ ebube ndị ohu ya rụrụ n’oge ochie na ozi ọma ha kwusara.—Luk 4:18; Ọrụ Ndịozi 1:8; 1 Ndị Kọrịnt 12:4-11.
Ndị rubeere ya isi ịkpa àgwà ọma.—Ndị Galeshia 5:22, 23.
Mmụọ nsọ abụghị onye
Otú a Baịbụl si kpọọ mmụọ nsọ “aka” Chineke, “mkpịsị aka” ya, ma ọ bụ “ume” ya gosiri na mmụọ nsọ abụghị onye. (Ọpụpụ 15:8, 10) Aka omenkà agaghị anọ iche na-arụ ọrụ, omenkà anọrọ iche. Otú ahụkwa ka ọ dị mmụọ nsọ. Ọ naghị arụ ọrụ n’onwe ya. Ọ bụ Chineke ji ya arụ ọrụ. (Luk 11:13) Baịbụl jikwa mmụọ nsọ tụnyere mmiri, kwuokwa gbasara ya mgbe ọ na-ekwu banyere okwukwe na ịma ihe. Ihe a niile e ji mmụọ nsọ tụnyere gosiri na ọ bụghị onye.—Aịzaya 44:3; Ọrụ Ndịozi 6:5; 2 Ndị Kọrịnt 6:6.
Baịbụl gwara anyị aha Chineke na aha Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. Ma, e nweghị ebe ọ gwara anyị ihe bụ́ aha mmụọ nsọ. (Aịzaya 42:8; Luk 1:31) Mgbe Stivin bụ́ onye e mechara gbuo n’ihi na ọ bụ Onye Kraịst hụrụ eluigwe n’ọhụụ, ọ hụrụ naanị Chineke na Jizọs, o nweghị onye ọzọ ọ hụrụ mere ha atọ. Baịbụl kwuru, sị: “Ebe o jupụtara na mmụọ nsọ, o legidere anya n’eluigwe ma hụ ebube Chineke, hụkwa ka Jizọs guzo n’aka nri Chineke.” (Ọrụ Ndịozi 7:55) Ọ bụ mmụọ nsọ mere ka Stivin hụ ọhụụ ahụ.
Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere mmụọ nsọ
Ụgha: Mmụọ nsọ bụ onye. Ọ bụ onye nke atọ n’Atọ n’Ime Otu dị ka e kwuru na 1 Jọn 5:7, 8 na Baịbụl King James.
Eziokwu: Na Baịbụl King James, e dere ihe a: “E nwere Nna ahụ, Okwu ahụ, na Mmụọ Nsọ n’eluigwe, ha atọ bụkwa otu. E nwekwara ihe atọ na-agba àmà n’ụwa.” Ma, ndị na-eme nchọpụta chọpụtara na ọ bụghị Jọn onyeozi dere ihe ahụ, n’ihi ya, o kwesịghị ịdị na Baịbụl. Otu prọfesọ aha ya bụ Bruce M. Metzger kwuru gbasara ihe ahụ e dere na Baịbụl King James. Ọ sịrị: “O doro anya na ihe a abụghị eziokwu nakwa na o kwesịghị ịdị n’Agba Ọhụrụ.”—A Textual Commentary on the Greek New Testament.
Ụgha: Ime baptizim n’aha nke mmụọ nsọ na-egosi na mmụọ nsọ bụ onye.
Eziokwu: Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na Baịbụl sị na e mere ihe n’aha onye a kpọrọ aha ya, ọ na-egosi na e mere ihe ahụ n’ike onye ahụ. (Diuterọnọmi 18:5, 19-22; Esta 8:10) O yikwara ka mmadụ ịsị na iwu kwuru ihe. Ihe a apụtaghị na iwu bụ mmadụ na-ekwu okwu. N’ihi ya, a sị na e mere mmadụ baptizim “n’aha” nke mmụọ nsọ, ọ pụtara na onye ahụ ghọtara na Chineke na-eji mmụọ nsọ emezu uche ya.—Matiu 28:19.
Ụgha: Ndịozi Jizọs na ndị ọzọ na-eso ụzọ ya n’oge ochie kwetara na mmụọ nsọ bụ onye.
Eziokwu: Ọ bụghị ihe Baịbụl kwuru, o nweghịkwa akụkọ ihe mere eme kwuru otú ahụ. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: ‘Ọ bụ ná nnọkọ e nwere na Kọnstantinopụl n’afọ 381 ka a nọ kwuo na Mmụọ Nsọ bụ Chi.’ Mgbe e kwuru ihe a bụ mgbe ihe karịrị narị afọ abụọ na iri ise (250) gacharala onyeozi ikpeazụ nwụrụ.