Jenesis 8:1-22

  • Mmiri talatara n’ụwa (1-14)

    • Noa zipụrụ otu nduru (8-12)

  • Noa na ezinụlọ ya si n’ụgbọ pụta (15-19)

  • Nkwa Chineke kwere banyere ụwa (20-22)

8  Ma Chineke chetara Noa na anụ ọhịa niile na anụ ụlọ niile ya na ha nọ n’ụgbọ ahụ.+ Chineke wee mee ka ifufe fee n’ụwa, mmiri ahụ amalite ịta.  Nnukwu mmiri niile dị na mbara igwe na ọnụ ụzọ mmiri niile dị n’eluigwe mechiri. Mmiri nke si n’eluigwe na-ezo wee kwụsị izo.+  Mmiri wee jiri nwayọọ nwayọọ na-ata n’ụwa. Mgbe otu narị ụbọchị na iri ise (150) gachara, mmiri ahụ atalatala.  N’abalị iri na asaa n’ọnwa nke asaa, ụgbọ ahụ kwụsịrị n’ugwu dị n’Ararat.  Mmiri ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-atalata ruo n’ọnwa nke iri. N’abalị mbụ n’ọnwa nke iri, a hụwara elu ugwu dị iche iche.+  Mgbe ụbọchị iri anọ gachara, Noa meghere windo+ ahụ ọ rụnyere n’ụgbọ ahụ  ma zipụ otu ugoloọma. Ugoloọma ahụ nọ na-efegharị n’èzí, na-efebatakwa, ruo mgbe mmiri tara n’ụwa.  Mgbe e mechara, Noa zipụrụ otu nduru ka o wee mata ma mmiri ọ̀ tawala n’ala.  Ma nduru ahụ ahụghị ebe ọ bụla ọ ga-ebere. N’ihi ya, o feere lọghachikwute ya n’ụgbọ ahụ maka na mmiri ka kpuchiri ụwa niile.+ O wee sepụta aka ya nwụrụ ya nwụbata n’ime ụgbọ ahụ. 10  O cheere ụbọchị asaa ọzọ ma si n’ụgbọ ahụ zipụ nduru ahụ ọzọ. 11  Mgbe nduru ahụ feere bịakwute ya ná mgbede, ọ hụrụ na ọ kpụ akwụkwọ oliv ọ tụbitara ọhụrụ n’ọnụ ya. Noa wee mara na mmiri ataala n’ụwa.+ 12  O cheere ụbọchị asaa ọzọ wee zipụ nduru ahụ. Ma ọ lọghachikwuteghị ya ọzọ. 13  N’abalị mbụ n’ọnwa nke mbụ n’afọ nke narị isii na otu (601),+ mmiri ataala n’ụwa. Noa wee wepụ ihe e ji kpuchie elu ụgbọ ahụ ma hụ na ala akọwala. 14  N’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa nke abụọ, ụwa akọọla. 15  Chineke gwaziri Noa, sị: 16  “Si n’ụgbọ ahụ pụta, gị na nwunye gị na ụmụ gị na ndị nwunye ụmụ gị.+ 17  Chịrị ụdị anụ niile dị ndụ pụta,+ ma anụ ndị na-efe efe ma anụ ụlọ ma anụ ọhịa ma anụ niile na-arị arị, ka ha wee mụọ ọmụmụ n’ụwa, ka ha baa ụba ma dị ọtụtụ n’ụwa.”+ 18  Noa na ụmụ ya+ na nwunye ya na ndị nwunye ụmụ ya wee si n’ụgbọ ahụ pụta. 19  Ihe niile dị ndụ, anụ niile na-arị arị, anụ niile na-efe efe, na ihe niile na-agagharị agagharị n’ụwa si n’ụgbọ ahụ pụta. Ha pụtara n’ụdị ha dị iche iche.+ 20  Noa wee rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà+ ma were ụfọdụ n’anụ niile dị ọcha nakwa ụfọdụ n’anụ niile na-efe efe dị ọcha+ chụọ àjà a na-esu ọkụ n’ebe ịchụàjà ahụ.+ 21  Jehova wee malite ịnụrụ ísì ọma àjà ahụ na-esi. Jehova kwuziri n’obi ya, sị: “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ+ n’ihi mmadụ, n’ihi na ihe dị mmadụ n’obi malite n’oge ọ bụ nwata bụ ihe ọjọọ.+ E nweghịkwa mgbe m ga-ebibi ihe niile dị ndụ ọzọ otú m mere.+ 22  Malite ugbu a gawa, e nweghị mgbe a ga-akwụsị inwe oge ịgha mkpụrụ na oge iwe ihe ubi n’ụwa, nakwa oge oyi na oge okpomọkụ, oge ọkọchị na oge udu mmiri, nakwa ehihie na abalị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji