Jenesis 3:1-24

  • Otú mmadụ si mehie (1-13)

    • Ụgha mbụ (4, 5)

  • Ikpe Jehova mara ndị nnupụisi (14-24)

    • Amụma e buru gbasara nwa nwaanyị ahụ (15)

    • A chụpụrụ mmadụ ahụ n’Iden (23, 24)

3  Agwọ+ kacha dị akọ* n’anụ ọhịa niile Jehova Chineke kere. O wee sị nwaanyị ahụ: “Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?”+  Nwaanyị ahụ wee sị agwọ ahụ: “Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a.+  Ma Chineke gwara anyị gbasara mkpụrụ si n’osisi dị n’etiti ubi a,+ sị: ‘Unu erila mkpụrụ si na ya, unu emetụkwala ya aka ka unu ghara ịnwụ.’”  Agwọ ahụ sịziri nwaanyị ahụ: “Unu agaghị anwụ.+  N’ihi na Chineke ma na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu adị ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.”+  Nwaanyị ahụ wee hụ na mkpụrụ osisi ahụ dị mma oriri nakwa na ọ na-agụ agụụ ma e lee ya anya. N’eziokwu, osisi ahụ mara mma ile anya. Nwaanyị ahụ wee ghọrọ mkpụrụ ya rie.+ Mgbe e mechara, o nyetụrụ di ya mgbe ya na ya nọ, di ya erie.+  Anya ha abụọ meghere, ha amata na ha gba ọtọ. N’ihi ya, ha dụkọtara akwụkwọ osisi fig ma jiri ha kpuchie úkwù ha.+  Mgbe e mechara, nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ olu Jehova Chineke mgbe ọ na-agagharị n’ubi ahụ n’oge ifufe ji efe n’ụbọchị.* Ha wee gaa zoo n’agbata osisi ndị dị n’ubi ahụ ka Jehova Chineke ghara ịhụ ha.  Jehova Chineke wee kpọwa nwoke ahụ, na-asị ya: “Olee ebe ị nọ?” 10  N’ikpeazụ, nwoke ahụ sịrị: “Anụrụ m olu gị n’ubi a, ma egwu nọ na-atụ m maka na m gba ọtọ. Ọ bụ ya mere m ji gaa zoo.” 11  Chineke wee sị: “Ònye gwara gị na ị gba ọtọ?+ Ì riela mkpụrụ si n’osisi ahụ m nyere gị iwu ka ị ghara iri?”+ 12  Nwoke ahụ sịrị: “Ọ bụ nwaanyị ahụ ị kpọnyere m ka mụ na ya biri. O nyere m mkpụrụ si n’osisi ahụ, mụ erie.” 13  Jehova Chineke wee sị nwaanyị ahụ: “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwaanyị ahụ zara, sị: “Agwọ ahụ duhiere m, m wee rie mkpụrụ osisi ahụ.”+ 14  Jehova Chineke wee sị agwọ ahụ:+ “Ebe ọ bụ na i mere ihe a, ana m abụ gị ọnụ n’ime anụ ụlọ niile na anụ ọhịa niile. Ọ bụ afọ gị ka ị ga-eji na-agagharị, ị ga na-erikwa ájá n’oge niile ị dị ndụ. 15  M ga-eme ka gị+ na nwaanyị ahụ+ dịrị n’iro,+ meekwa ka nwa* gị+ na nwa* ya+ dịrị n’iro. Nwa ya ga-egwepịa gị isi,+ ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”+ 16  Chineke sịrị nwaanyị ahụ: “M ga-eme ka ahụ́ na-egbusi gị mgbu ike mgbe ị dị ime. Ahụ́ ga na-egbu gị mgbu mgbe ị na-amụ nwa. Gị na di gị ịnọ ga na-agụsi gị agụụ ike, di gị ga na-achịkwa gị.” 17  Chineke sịkwara Adam:* “Ebe ọ bụ na i gere nwunye gị ntị ma rie mkpụrụ si n’osisi ahụ m nyere gị iwu banyere ya,+ sị, ‘Erila mkpụrụ si na ya,’ ana m abụ ala ọnụ n’ihi gị.+ N’ụbọchị niile ị ga-adị ndụ, ị ga na-arụgbu onwe gị n’ọrụ tupu gị erie ihe ọ ga-emepụta.+ 18  Ọ ga na-epuru gị ogwu na uke, ọ bụkwa ihe ndị puru n’ala ka ị ga na-eri. 19  Ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na ọ bụ ebe i si.+ N’ihi na ị bụ ájá, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.”+ 20  Mgbe e mechara, Adam gụrụ nwunye ya Iv,* n’ihi na ọ ga-abụ nne onye ọ bụla dị ndụ.+ 21  Jehova Chineke ji akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe gbadara agbada ka ha yiri.+ 22  Jehova Chineke wee sị: “Lee, mmadụ ahụ dịzi ka anyị. Ọ marala ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.+ Ugbu a, ka o wee ghara ịmatị aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi nke ndụ+ rie ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,—” 23  Jehova Chineke wee chụpụ ya n’ogige Iden+ ahụ ka ọ gaa kọwa ihe n’ala, bụ́ ebe o si.+ 24  N’ihi ya, ọ chụpụrụ mmadụ ahụ ma dowe ndị cherob+ n’ebe ọwụwa anyanwụ ogige Iden, dowekwa mma agha nke na-enwu ọkụ ma na-atụgharị atụgharị. O dowere ha ebe ahụ ka ha nọchie ebe e si abanye n’ebe osisi nke ndụ dị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mara ihe; aghụghọ.”
Ma ọ bụ “n’oge mgbede.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Adam pụtara “Mmadụ.”
Iv pụtara “Onye Dị Ndụ.”