Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmụọ Nsọ Ọ̀ Bụ Onye?

Mmụọ Nsọ Ọ̀ Bụ Onye?

Echiche Nke Bible

Mmụọ Nsọ Ọ̀ Bụ Onye?

GỊNỊ bụ mmụọ nsọ Chineke? N’okwu mmeghe nke Bible, Bible kwuru banyere mmụọ nsọ—nke a sụgharịkwara ịbụ “ike Chineke nke nọ n’ọrụ”—dị ka ihe ‘na-erugharị n’elu mmiri.’ (Jenesis 1:2, New World Translation of the Holy Scriptures) N’ihe e dekọrọ banyere baptizim Jizọs, ọ bụ eziokwu na a kọwara na Chineke nọ “n’eluigwe,” a hụrụ mmụọ nsọ ka ọ “na-efedata dị ka nduru” na-abịakwasị Jizọs. (Matiu 3:16, 17) Ọzọkwa, Jizọs kwuru banyere mmụọ nsọ dị ka “ihe inyeaka.”—Jọn 14:16.

Ihe ndị a na ihe ndị ọzọ Bible kwuru emeela ka ụfọdụ ndị kwere na mmụọ nsọ bụ onye, dị ka Chineke, Jizọs, na ndị mmụọ ozi sicha bụrụ. N’ezie, kemgbe ọtụtụ narị afọ, ihe ka ọtụtụ n’okpukpe Krisendọm ndị a ma ama n’ụwa na-ekwu na mmụọ nsọ bụ onye. N’agbanyeghị na o teela aka e ziwere ozizi a, ọ ka na-agbagwoju ọtụtụ ndị na-aga chọọchị anya, ụfọdụ n’ime ha ekwetaghịdị n’ihe ahụ ndị ụkọchukwu ha na-akụzi. Dị ka ihe atụ, ná nnyocha e mere na nso nso a, ihe karịrị ụzọ atọ n’ụzọ ise nke ndị a gbara ajụjụ ọnụ kweere na mmụọ Chineke bụ “ihe na-egosi na Chineke nọ ya ma ọ bụ ihe na-egosipụta ike Ya, ọ bụghị onye dị adị.” Ma, gịnị ka Bible kwuru?

Ihe Bible Kwuru

Onye ji obi ọcha agụ Bible enweghị ihe ọzọ ọ ga-ekwu ma ọ́ bụghị na mmụọ nsọ abụghị onye, dị ka ndị chọọchị na-ekwu na ọ bụ. Tụlee ihe ndị na-esonụ e dekọrọ na Bible.

1. N’oge Meri bụ́ nne Jizọs gara ileta nwanne ya nwanyị bụ́ Elizabet, Bible sịrị na nwa nọ n’akpa nwa Elizabet maliri elu, “Elizabet jupụtakwara na mmụọ nsọ.” (Luk 1:41) Ezi uche ọ̀ dị na ya na onye dị ndụ ‘ga-ejupụta’ n’ime onye ọzọ dị ndụ?

2. Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim na-agwa ndị na-eso ụzọ ya na Jizọs ga-anọchi ya, Jọn kwuru, sị: “Mụ onwe m, n’aka nke m, ji mmiri na-eme unu baptizim . . . , ma onye ahụ nke na-abịa n’azụ m dị ike karịa m, onye m na-erughị eru iyipụ akpụkpọ ụkwụ ya. Onye ahụ ga-eji mmụọ nsọ . . . mee unu baptizim.” (Matiu 3:11) O doro anya na Jọn adịghị ekwu na mmụọ nsọ bụ onye mgbe ọ sịrị na a ga-eji ya eme ndị mmadụ baptizim.

3. Mgbe Pita onyeozi gara ileta otu ọchịagha ndị Rom na ezinụlọ ya, o kwuru na Chineke ‘ji mmụọ nsọ na ike’ tee Jizọs mmanụ. (Ọrụ 10:38) Obere oge mgbe Pita kwusịrị nke a, “mmụọ nsọ dakwasịrị” ndị nile nọ n’ezinụlọ ọchịagha ahụ. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na o juru ọtụtụ ndị anya “n’ihi na a na-awụpụkwa onyinye ahụ a na-enye n’efu bụ́ mmụọ nsọ n’ahụ́ ndị mba ọzọ.” (Ọrụ 10:44, 45) N’ebe a kwa, okwu ndị e ji mee ihe ekwekọghị n’echiche bụ́ na mmụọ nsọ bụ onye.

Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ebe Okwu Chineke kwuru banyere ihe ndị na-abụghị onye dị ka à ga-asị na ha bụ onye. Ụfọdụ n’ime ha bụ amamihe, nghọta, mmehie, ọnwụ, na obiọma na-erughịrị mmadụ. (Ilu 8:1-9:6; Ndị Rom 5:14, 17, 21; 6:12) Jizọs n’onwe ya kwuru na “a na-anwapụta na amamihe ziri ezi site n’ụmụ ya nile,” ma ọ bụ site n’ihe ọma ndị ọ na-arụpụta. (Luk 7:35) O doro anya na amamihe abụghị onye nke nwere ụmụ nkịtị! N’otu aka ahụ, mmụọ nsọ abụghị onye nanị n’ihi na e nwere ebe ụfọdụ e kwuru banyere ya dị ka à ga-asị na ọ bụ onye.

Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?

N’ime Bible, a kọwara mmụọ nsọ Chineke dị ka ike Chineke nke nọ n’ọrụ. N’ihi nke a, ná nsụgharị ka zie ezie nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, a kpọrọ mmụọ Chineke “ike Chineke nke nọ n’ọrụ.” (Jenesis 1:2, New World Translation of the Holy Scriptures) Bible kwadosiri echiche a ike.—Maịka 3:8; Luk 1:35; Ọrụ 10:38.

N’ụzọ dị iche n’ihe ọtụtụ ndị kweere, Chineke anọzughị ebe nile n’otu oge. Kama nke ahụ, o bi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, ‘n’ọnọdụ obibi Ya guzosiri ike,’ ma ọ bụ n’ebe obibi ya. (1 Ndị Eze 8:39; 2 Ihe Emere 6:39) Akwụkwọ Nsọ kwuru kpọmkwem ebe Chineke bi, nke bụ́kwa ebe “ocheeze” ya dị. (1 Ndị Eze 22:19; Aịsaịa 6:1; Daniel 7:9; Mkpughe 4:1-3) Ma, ọ pụrụ ịnọ ‘n’ọnọdụ ya guzosiri ike’ mee ka ike ya nọ n’ọrụ rute ebe nile, ma n’eluigwe ma n’ụwa.—Abụ Ọma 139:7.

Laa azụ n’afọ 1879, ọkà mmụta Bible bụ́ Charles L. Ives nyere ihe atụ dabara adaba banyere ikike Chineke nwere ịnọ otu ebe ma na-egosipụta ike ya. O dere, sị: “Dị ka ihe atụ, anyị na-asị, ‘Mepee windo ka anyanwụ bata n’ime ụlọ.’ Ihe anyị na-ekwu abụghị ka anyanwụ n’onwe ya bata kama ọ bụ ka ìhè anyanwụ bata, bụ́ ìhè nke si n’anyanwụ.” N’otu aka ahụ, ọ dịghị Chineke mkpa ịga n’ebe ndị ọ chọrọ iji ike ya nọ n’ọrụ mee ihe. Nanị ihe ọ na-eme bụ iji mmụọ nsọ ya mee ihe, bụ́ nke pụrụ iru ebe ọ bụla ihe nile e kere eke nọ. Ịghọta ihe mmụọ nsọ bụ—ike Chineke dị egwu nke nọ n’ọrụ—pụrụ ime ka i nwee obi ike na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere.

Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?

Bible ọ̀ na-akụzi na mmụọ nsọ bụ onye?Ọrụ 10:44, 45.

▪ Gịnị bụ mmụọ nsọ?—Jenesis 1:2.

▪ Olee ebe mmụọ nsọ Chineke pụrụ iru?—Abụ Ọma 139:7.