Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A na-eji oge agbamakwụkwọ enwe mgbakọ

INDONESHIA

Ha Akwụsịghị Ịna-enwe Ọmụmụ Ihe

Ha Akwụsịghị Ịna-enwe Ọmụmụ Ihe

N’oge ahụ a machibidoro anyị iwu, ọtụtụ ọgbakọ na-enwe ọmụmụ ihe n’ụlọ ụmụnna anyị. Ọtụtụ ọgbakọ anaghị abụ abụ n’ọmụmụ ihe ka a ghara ịmata ihe ha na-eme. O nwere mgbe ụmụnna anyị na-enwe ọmụmụ ihe n’ebe ụfọdụ, ndị uwe ojii abata. Ma, nke a emeghị ka ụjọ tụọ ha.

Ụmụnna anyị na-ejikarị oge ndị ezinụlọ dị iche iche bịara ịnọrị nakwa mgbe ụmụnna anyị chọrọ ịgba akwụkwọ enwe mgbakọ. Nwanna Tagor Hutasoit kwuru, sị: “Ihe di na nwunye na-emekarị bụ, ha debanyechaa alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ, ha anata ndị uwe ojii ikike ka ha nwee oriri agbamakwụkwọ buru ibu. N’oge a na-enwe oriri agbamakwụkwọ ahụ, ndị ahụ lụrụnụ na-anọ n’ikpo okwu, ụmụnna anyị ejiri Baịbụl na-agwa ndị nọ ebe ahụ okwu, otu onye kwuchaa, onye ọzọ ekwuo.”

N’otu mgbakọ, otu onye uwe ojii bịakwutere Nwanna Tagor jụọ ya, sị:

“Ọtụtụ agbamakwụkwọ na-ewe naanị awa abụọ ma ọ bụ atọ, gịnị mere nke unu ji esi n’ụtụtụ ruo ná mgbede?”

Nwanna Tagor gwara ya, sị: “Ụfọdụ ndị di na nwunye nwere ọtụtụ nsogbu ma chọọ ka e were Okwu Chineke nyere ha aka.”

Onye uwe ojii ahụ kwere n’isi, sị: “Ihe i kwuru bụ eziokwu, o doola m anya ugbu a.”

Ụmụnna anyị ji oge ọtụtụ ụmụnna anyị gbara akwụkwọ kwuo okwu ụfọdụ e kwuru ná Mgbakọ Distrikti nke afọ 1983 n’ámá egwuregwu dị na Jakata. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ “Ịdị n’Otu Alaeze.” Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku mmadụ anọ bịara ya, e mekwara otu narị mmadụ na iri abụọ na ise baptizim n’ebe zoro ezo tupu mgbakọ a amalite. Ka oge na-aga, mgbe ndị ọchịchị kwụsịlatara nsogbu ha na-enye anyị, ụmụnna anyị nwere mgbakọ ndị ka nke ahụ. O nwedịrị nke puku mmadụ iri na ise bịara.

Ịrụ Alaka Ụlọ Ọrụ n’Oge A Machibidoro Anyị Iwu

N’agbata afọ 1981 na afọ 1999, alaka ụlọ ọrụ anyị degaara gọọmenti Indoneshia akwụkwọ ugboro ugboro ka ha wepụ iwu ahụ a machibidoro anyị. Ụmụnna anyị ndị nọ ná mba dị iche iche degakwaara gọọmenti Indoneshia na ndị na-anọchite anya ha n’obodo ọzọ akwụkwọ jụọ ha ihe mere e ji machibido Ndịàmà Jehova iwu n’Indoneshia. Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu na gọọmenti chọrọ ka e wepụ iwu ahụ a machibidoro anyị. Ma, onyeisi Ngalaba Na-eduzi Okpukpe Ndị Kraịst ekweghị.

N’afọ 1990, ụmụnna anyị kpebiri ịrụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ n’ebe zoturu ezo. N’afọ ahụ, Òtù Na-achị Isi kwadoro ka a zụta otu ala dị nso n’obere obodo a na-akpọ Bogọ. Obodo a dị n’ebe ndịda Jakata. Isi na Jakata gaa ya dị kilomita iri anọ. Ma ụmụnna anyị ndị ma otú e si arụ ụlọ n’Indoneshia ebughị ibu. N’ihi ya, olee otú a ga-esi arụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ a?

Ngalaba na-ahụ maka ịrụ ụlọ n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin nakwa n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia sere otú a ga-esi rụọ alaka ụlọ ọrụ ahụ. Ihe dị ka narị ụmụnna abụọ sí mba dị iche iche wepụtara onwe ha rụọ ọrụ afọ abụọ a rụrụ alaka ụlọ ọrụ ahụ.

Ọ bụ nwanna Hosea Mansur, bụ́ onye Indoneshia, na-aga ahụrụ anyị ndị gọọmenti. O kwuru, sị: “Mgbe ndị gọọmenti bụ́ ndị Alakụba hụrụ H.M. n’okpu ígwè m kpu, ha chere na mkpụrụ akwụkwọ ahụ bụ́ H pụtara ‘Hājjī,’ nke bụ́ aha a na-etu ndị garala leta ala nsọ ndị Alakụba dị na Meka. Ihe a ha hụrụ n’okpu m mere ka ha na-asọpụrụ m. O mekwara ka ọ dịrị anyị mfe ịhazi ọrụ anyị nke ọma.”

Ihe a bụ alaka ụlọ ọrụ a rụrụ n’oge a machibidoro anyị iwu

E nyefere Jehova alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ a n’abalị iri na itoolu n’ọnwa Julaị afọ 1996. Ọ bụ Nwanna John Barr, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu e ji nyefee ya Jehova. Ndị bịara maka inyefe ya Jehova dị narị mmadụ abụọ na iri asatọ na ise. Otu narị mmadụ na iri na asatọ n’ime ha bụ ma ndị si n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche ma ndị bụbu ndị ozi ala ọzọ si mba dị iche iche, ma mmadụ iri ise na itoolu na-eje ozi na Betel dị n’Indoneshia. Ụbọchị abụọ e nyefechara Jehova alaka ụlọ ọrụ ahụ, puku mmadụ asatọ na narị asaa na iri itoolu na atọ bịakwara Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” e nwere na Jakata.

Jehova Anapụta Ndị Ya

N’afọ 1998, onyeisi ala Indoneshia kemgbe ọtụtụ afọ aha ya bụ Soeharto (Suharto) gbara arụkwaghị m, si otú ahụ mee ka e nwee gọọmenti ọhụrụ. Nke a mere ka ụmụnna anyị gbasikwuo mbọ ike ka e wepụ iwu ahụ a machibidoro anyị.

N’afọ 2001, odeakwụkwọ ukwu Indoneshia aha ya bụ Djohan Effendi bịara legharịa anya na Betel anyị dị na Bruklin. N’oge ahụ, ya na mmadụ atọ só n’Òtù Na-achị Isi nwere nnọkọ. Ihe ndị ọ hụrụ masịrị ya. O kwukwara na Ndịàmà Jehova nwere aha ọma n’ebe niile n’ụwa. Maazị Effendi chọrọ ka e wepụ iwu ahụ, ma o kwuru na tupu e wepụ ya, ọkàikpe ukwu Indoneshia aha ya bụ Marzuki Darusman ga-akwadorịrị ka e mee otú ahụ.

Ọkàikpe ukwu ahụ chọkwara ka e wepụ iwu ahụ, ma ndị na-achọghị iji anya ahụ anyị só ya arụ ọrụ na-adọla ya azụ n’ihi na ha ma na onye ọzọ ga-anọchi ya n’oge na-adịghị anya. N’ikpeazụ, n’abalị mbụ n’ọnwa Jun afọ 2001, ọkàikpe ukwu ahụ kpọrọ Nwanna Tagor Hutasoit ka ọ bịa n’ọfis ya. Nwanna Tagor kwuru, sị: “Ọ bụ n’otu ọfis ahụ ka a nọ nye m akwụkwọ kwuru na a machibidola Ndịàmà Jehova iwu n’ihe dị ka afọ iri abụọ na ise gara aga. Ma n’ụbọchị ahụ, bụ́ ụbọchị ikpeazụ ọkàikpe ukwu ahụ ga-arụ ọrụ n’ọfis ahụ, o nyere m akwụkwọ kwuru na e wepụla iwu ahụ a machibidoro Ndịàmà Jehova.”

N’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Mach afọ 2002, Ngalaba Na-ahụ Maka Okpukpe n’Indoneshia debanyere aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro. Onyeisi ngalaba ahụ gwara onye na-anọchite anya alaka ụlọ ọrụ anyị, sị: “Ọ bụghị akwụkwọ a e debanyere aha okpukpe unu na ya nyere unu ikike ikpe okpukpe unu. Ọ bụ Chineke nyere unu ikike a. Naanị ihe akwụkwọ a na-egosi bụ na gọọmenti anabatala okpukpe unu. Ugbu a, unu nwere ikike niile okpukpe ndị ọzọ nwere, gọọmenti kwụkwa unu n’azụ.”