Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

INDONESHIA

Anyị Ekweghị Emebi Iwu Chineke

Daniel Lokollo

Anyị Ekweghị Emebi Iwu Chineke
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1965

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1986

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche nke na-ekweghị emebi iwu Chineke mgbe a na-akpagbu ya.

N’ABALỊ iri na anọ n’ọnwa Eprel afọ 1989, n’oge m na-eduzi ọmụmụ ihe na Maụmere, dị́ n’Agwaetiti Flọris, ndị uwe ojii batara ebe ahụ n’ike ma nwụchie mụ na ụmụnna atọ ọzọ.

Ndị na-eche anyị nche n’ụlọ mkpọrọ mere ihe niile ha nwere ike ime ka anyị kelee ọkọlọtọ. Mgbe anyị jụrụ, ha kụrụ anyị ihe ma gbaa anyị ụkwụ. Ha kpọpụtakwara anyị n’oké anwụ ruo abalị ise. O ruo n’abalị, anyị na-edina n’ala simenti n’obere ọnụ ụlọ mkpọrọ anyị nọ na ya. Nke a mere ka ezigbo oyi na-atụ anyị. Ike na-agwụcha anyị, ahụ́ na-afụkwa anyị ụfụ n’ihi ahụ́ e merụsịrị anyị. Anyị bịakwara ruo unyi. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ gwara anyị ugboro ugboro ka anyị mee ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Ma, anyị gwara ya, sị, “Ruokwa mgbe anyị ga-anwụ, anyị agaghị ekele ọkọlọtọ.” Obi dị anyị ụtọ ‘ịta ahụhụ n’ihi ezi omume’ otú ahụ ọ dị Ndị Kraịst oge mbụ.—1 Pita 3:14.