Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Ịgba Ohu?

Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Ịgba Ohu?

Echiche Baịbụl

Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Ịgba Ohu?

OTU n’ime ihe gbara ọkpụrụkpụ Baịbụl na-akụziri ndị mmadụ bụ ka ha hụ ndị agbata obi ha n’anya. Ma, anyị agaghị asị na anyị hụrụ mmadụ n’anya ma ọ bụrụ na anyị ejiri onye ahụ mere ohu. Ọ bụ ya mere o ji agbagwoju ụfọdụ ndị anya ma ha gụwa Baịbụl gụta ebe e kwuru okwu ịgba ohu.

N’oge ochie, Chineke hapụrụ ndị na-efe ya ka ha nwee ndị ohu. (Jenesis 14:14, 15) N’oge ndịozi Jizọs nọ n’ụwa, e nwedịrị Ndị Kraịst ụfọdụ nwere ndị ohu, nweekwa ndị nke bụ́ ndị ohu n’onwe ha. (Faịlimọn 15, 16) Nke a ọ̀ pụtaziri na Baịbụl kwadoro ịgba ohu?

Baịbụl Akwadoghị Omenala Ahụ

Tupu e bido ide Baịbụl, ụmụ mmadụ nwere omenala ndị ha na-eme, nweekwa ụzọ dị iche iche ha si akpata ihe ha na-eri. Ma, ihe ndị a ha na-eme abụghị uche Chineke. Ọ bụ eziokwu na Chineke mechara nye ụmụ mmadụ Iwu ka ha ghara ime ụfọdụ omenala ndị ahụ, e nwere ndị nke Chineke gbachiri nkịtị ka ha na-eme. Otu n’ime ha bụ ịgba ohu.

E nwere otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru gbasara omenala ndị Izrel n’oge ochie. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ihe mere ha ji na-eme ya bụ ka ha nyere ibe ha aka. E bu n’obi na ọ ga-eme ka a ghara inwe ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, ka a ghara imegbu ndị inyom di ha nwụrụ, ka a ghara inwe ndị na-enweghị ebe ha bi, nakwa ka a ghara imegbu ụmụ mgbei.” N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na Chineke gbachiri nkịtị ka a na-agba ohu, o nyere iwu ndị ọ ga-abụ e debe ha otú ahụ o kwuru, a gaghị na-emegbu ndị ohu.

Otú E Si Gbaa Ohu n’Oge Ochie

Legodị ụfọdụ ihe e kwuru n’Iwu Chineke si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel:

Onye tọrọ mmadụ ibe ya resị onye ọzọ, a ga-egbu ya. (Ọpụpụ 21:16) Ma, ọ bụrụ na onye Izrel ejighị ihe ọ na-eme kpọrọ ihe, nke mere ka o jiri mmadụ ibe ya ezigbote ụgwọ, n’agbanyeghị aka ndị Izrel ibe ya nyeerela ya, o nwere ike jiri aka ya resị onye ọzọ onwe ya ka ọ gbawara onye ahụ ohu. Onye ahụ nwedịrị ike mechaa kpata ego gbapụta onwe ya.—Levitikọs 25:47-52.

Levitikọs 25:39, 40 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye, o wee resị gị onwe ya, ị gaghị eji ya mere ohu. Ọ ga-ebinyere gị dị ka onye ọrụ e goro ego, dị ka onye ọbịa.” Ị̀ hụrụ na ihe a Chineke kwuru bụ ka e nwee ike inyere onye ụwa na-atụ n’ọnụ n’Izrel aka? Ụdị ịgba ohu a abụghị ụdị nke ahụ ndị mmadụ na-agbara ibe ha kemgbe ụwa.

Ọ bụrụ na onye zuru ohi enweghị ike ịkwụ ụgwọ ihe o zuru otú Iwu Mozis kwuru ka e si na-akwụ ya, e nwere ike resị ya onye ahụ o zuuru ihe ya ka ọ gbawara ya ohu. Ọ ga-esi otú a kwụọ ya ụgwọ ahụ o ji ya. (Ọpụpụ 22:3) Ọ bụrụ na ọ rụọrọ onye ahụ ọrụ ruru ihe o ji ya n’ụgwọ, o nwere ike hapụ ya ka ọ laa.

Iwu Chineke kwuru na ụmụ Izrel ekwesịghị imegbu ohu ha ma ọ bụkwanụ mesie ya ike. Ọ bụ eziokwu na mmadụ nwere ike taa ndị ohu ya ahụhụ maka ihe na-adịghị mma ha mere, ma Iwu ahụ kwuru na onye ahụ ekwesịghị ịta ha ahụhụ gafee ókè. Ọ bụrụ na mmadụ egbuo ohu ya, a ga-egbu ya. (Ọpụpụ 21:20) Ọ bụrụ na o mee ka ohu ya nwee nkwarụ, ya bụ, ọ bụrụ na ọ kụpụrụ ya ezé ma ọ bụ kụkpọọ ya anya, a ga-ahapụ ohu ahụ ka ọ laa.—Ọpụpụ 21:26, 27.

O nweghị onye Izrel na-agba ohu karịa afọ isii. (Ọpụpụ 21:2) A na-ahapụ ndị ohu ka ha laa n’afọ nke asaa. Iwu Mozis kwuru na n’afọ iri ise ọ bụla, ndị ohu niile nọ n’Izrel ga-ala ebe ha n’agbanyeghị afọ ole ha gbarala ohu.—Levitikọs 25:40, 41.

Ọ bụrụ na mmadụ asị ohu ya lawa, ọ ga-enye ya ihe ndị ọ ga-eji ala. Diuterọnọmi 15:13, 14 kwuru, sị: “Mgbe ị na-ahapụ ya ka ọ lawa wee bụrụ onye nweere onwe ya, agbawala ya aka mgbe ị na-ahapụ ya. Hụ na i nyere ya ihe si n’ìgwè ewu na atụrụ gị na ihe si n’ebe nzọcha mkpụrụ gị na ebe nzọchapụta mmanụ gị na ebe nzọchapụta mmanya gị.”

N’oge Jizọs nọ ndụ n’ụwa nakwa n’oge ndịozi ya, a na-agba ohu ná mba niile ndị Rom na-achị. Ná ndị e ziri ozi ọma n’oge ahụ, e nwere ụfọdụ nwere ndị ohu, nweekwa ndị nke bụ́ ndị ohu n’onwe ha. Ụzọ ndị abụọ a nabatara ihe a kụziiri ha ma ghọọ Ndị Kraịst. Jizọs Kraịst na ndịozi ya agwaghị ndị ha ziri ozi ọma ka ha hapụ ndị ohu ha ka ha laa, ka à ga-asị na ha chọrọ ka a kwụsị ịgba ohu. Kama, ha gwara ndị ohu na ndị nwere ndị ohu ka ha hụ ibe ha n’anya n’ihi na ọ bụ otu Chineke ka ha na-efe.—Ndị Kọlọsi 4:1; 1 Timoti 6:2.

Mgbe Ịgba Ohu Ga-akwụsị

Ọ bụrụ na anyị agụta ebe e kwuru okwu ịgba ohu na Baịbụl, anyị kwesịrị ileru anya n’ihe ndị gbara ya gburugburu otú ahụ anyị kwesịrị ime ma anyị gụta ihe ọ bụla gbagwojuru anyị anya na Baịbụl. Anyị wepụta oge gụọ ihe ndị e kwuru na Baịbụl, anyị ga-achọpụta na imegbu mmadụ adịghị Chineke mma.

Anyị mee otú ahụ, anyị ga-achọpụtakwa na ndị fere Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị nwere ndị ohu, echighị ndị ohu ha ọnụ n’ala otú ọtụtụ ndị si eche taa. Baịbụl kwukwara na oge na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha. Mgbe ahụzi ka onye ọ bụla ga-enwere onwe ya kpamkpam.—Aịzaya 65:21, 22.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Baịbụl ọ̀ kwadoro ka ndị nwere ndị ohu na-emegbu ndị ohu ha?​—Levitikọs 25:39, 40.

● Olee iwu e nyere Ndị Kraịst oge ochie gbasara otú ha kwesịrị isi na-emeso ndị ohu ha?​—Ndị Kọlọsi 4:1.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Imegbu mmadụ adịghị Chineke mma

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 29]

© G.M.B. Akash/Panos Pictures