Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Nne Na Nna Kwuru

Ihe Ndị Nne Na Nna Kwuru

Ihe Ndị Nne Na Nna Kwuru

Ka ụmụ gị na-etolite, olee otú ị ga-esi akụziri ha na irubere ndị ọzọ isi bara ezigbo uru? Olee otú ị ga-esi akụziri ha ịrụ ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ, bụ́ ndị ga-enyere ha aka ma ha too? Legodị ihe ụfọdụ ndị nne na nna nọ ebe dị iche iche n’ụwa kwuru.

ỊRỤ ỌRỤ N’ỤLỌ NA ỊKPA ÀGWÀ ỌMA

“Ma n’ụtụtụ ma ná mgbede, anyị na ụmụ anyị na-erikọ nri. N’oge ndị ahụ, anyị na-ekwurịta ihe onye nke ọ bụla ga-eme n’ụbọchị ma ọ bụkwanụ otú ụbọchị si gaa. Anyị si otú ahụ na-akụziri ụmụ anyị ka ha na-ege ndị ọzọ ntị. Ha hụ otú mụ na mama ha si emeda obi ege ha ntị, ya emee ka onye nke ọ bụla na-akwanyekwuru ibe ya ùgwù.”​—Richard, onye bi na Briten.

“Ọ na-atọ anyị ezigbo ụtọ ịhụ otú ụmụ anyị si akwanyere ibe ha ùgwù na otú ha si eji aka ha edozi nsogbu ha na ibe ha na-enwe. Ha na-akwanyekwara ndị dimkpa ùgwù ma ha na ha na-akpa nkata.”​—John, onye bi na Saụt Afrịka.

“Ezughị m okè, mgbe ụfọdụkwa m na-eme ihe na-akpasu ụmụ m iwe n’amaghị ama. Mgbe ọ bụla m mere ụdị ihe a, m na-agba mbọ rịọ ha ka ha gbaghara m.”​—Janelle, onye bi n’Ọstrelia.

“Anyị na-akụziri ụmụ anyị otú e si arụ ọrụ ụfọdụ ndị dị n’ụlọ. Ihe ndị anyị na-akụziri ha ka ha na-eme bụ ihe ndị ga-abara mmadụ niile nọ n’ụlọ anyị uru, o sokwa na-eme ka ihe na-aga siriri werere n’ezinụlọ anyị. Ha mechaakwa ihe ndị ahụ, obi na-adị ha ụtọ.”​—Clive, onye bi n’Ọstrelia.

“Ọ dịghị mfe, ma ọ dị mkpa ka anyị kụziere ha ka ha na-ege ibe ha ntị, na-akwanyere ibe ha ùgwù, ma na-agbaghara ibe ha.”​—Yuko, onye bi na Japan.

ỊDỊ ỌCHA NA IMEGA AHỤ́

“Mgbe ụmụ anyị ka dị obere, anyị na-akụziri ha ka ha na-asa ahụ́. Anyị mekwara ka ịsa ahụ́ na-atọ ha ụtọ. Otú anyị si mee ya bụ na anyị na-azụtara ha ncha ndị dị ka nwa bebi na sapo ndị yiri ụmụ anụmanụ.”​—Edgar, onye bi na Meksiko.

“Mgbe anyị bi n’ebe pọmpụ na-adịghị, m na-agba mbọ hụ na m dewere ncha na mmiri e ji akwọ aka n’ebe onye ọ bụla ga-ahụ ha, ka onye ọ bụla si esi na-abata nwee ike ịkwọ aka ya tupu ya abata n’ime ụlọ.”​—Endurance, onye bi na Naịjirịa.

“Anyị na-enye ụmụ anyị ezigbo nri kwa ụbọchị, anyị na-agwakwa ha ihe mere iri ezigbo nri ji dị mkpa. M siwe nri, ụmụ anyị na-achọ ịma ihe ndị m ji na-esi ya. N’ihi ya, m na-agwa ha ka ha bịa nyere m aka sie nri, anyị na-ejikwa oge ndị ahụ akparịta ụka.”​—Sandra, onye bi na Briten.

“Mmega ahụ́ dị ezigbo mkpa, anyị na-agbalịkwa na-emega ahụ́ ka ụmụ anyị nwee ike ịmụta ya. Ha na-enwe obi ụtọ ma anyị na ha na-egwu egwuregwu ndị dị ka ịgba ọsọ, igwu mmiri, ịkụ tenis, ịtụ bọl, ma ọ bụkwanụ ịgba ígwè. Ha achọpụtala na imega ahụ́ dị mkpa, dịkwa ụtọ.”​—Keren, onye bi n’Ọstrelia.

“Otú kacha mma ndị mụrụ ụmụ ga-esi azụ ụmụ ha bụ iwepụta oge ka ha na ha na-anọ. A gaghị eji inye ụmụaka ego, ịzụtara ha ihe, ma ọ bụkwanụ ịkpọ ha eme njem tụnyere ya. Ọ na-abụ ụmụ m gawa akwụkwọ mụ agawa ọrụ, ha lọtazie n’ehihie, mụ na ha anọrọ.”​—Romina, onye bi n’Ịtali.

ỊDỌ AKA NÁ NTỊ

“Anyị achọpụtala na e nweghị otu ụzọ a ga-asị na ọ bụ ya kacha mma isi dọọ ụmụaka aka ná ntị. Ihe ga-ekpebi otú a ga-esi adọ ha aka ná ntị bụ ụdị ihe ha mere. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike bụrụ okwu nkịtị ha na ndị mụrụ ha kwurịtara, ma ọ bụkwanụ ịnapụ ha ihe ndị a na-enyebu ha.”​—Ogbiti, onye bi na Naịjirịa.

“Ọ na-abụ anyị gwa ụmụ anyị ihe ha ga-eme, anyị agwa ha ka ha kwuo ihe ahụ anyị gwara ha mee. Ihe anyị ji eme ya bụ ka anyị jide n’aka na ha ghọtara ihe anyị kwuru. Ha mee ihe anyị sịrị ha emela, anyị emee ha ihe anyị kwuru na anyị ga-eme ha. Ọ bụ ihe ndị nne na nna kwesịrị ịna-eme ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ụmụ ha na-erubere ha isi.”​—Clive, onye bi n’Ọstrelia.

“Achọpụtala m na m hulata na-ele nwa m anya n’ihu mgbe m na-agwa ya na ihe o mere adịghị mma, ọ na-aka ege m ntị. Ọ na-ahụkwa otú ihu m dị. Nke ahụ na-emekwa ka ọ na-aghọtakwu ihe m na-ekwu.”​—Jennifer, onye bi n’Ọstrelia.

“Anyị na-agbalị ka anyị ghara ịgwa ụmụ anyị na ha anaghị anụ ntị, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ha anaghị emekarị ihe anyị gwara ha mee. Anyị anaghịkwa abara nwa anyị mba n’ihu ụmụ nne ya. Anyị nwere ike takwunyere ya ihe anyị chọrọ ịgwa ya ma ọ bụkwanụ kpọpụ ya iche gwa ya ihe ahụ.”​—Rudi, onye bi na Mozambik.

“Ụmụaka na-achọkarị ịna-eme ihe ọ bụla ha hụrụ ndị ọzọ na-eme. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị kụziere ụmụ anyị ka ha ghara ịna-akpa àgwà ọjọọ ụmụ akwụkwọ ibe ha na-akpa, ghara ịna-eme ihe ndị na-adịghị mma a na-egosi na tiivi, na fim ma ọ bụkwanụ n’Ịntanet. Kama, ka ha na-akpa ezigbo àgwà dị ka Baịbụl kwuru. A kụziere ụmụaka Okwu Chineke, ọ ga-eme ka ha ghara ịna-eme ihe ndị na-adịghị mma.”​—Grégoire, onye bi na Demokratik Ripọblik of Kọngo.

“Ị gwa ụmụ gị na ị ga-eme ha ihe dị otú a ma ha mee ihe dị otú a, gbalịa mee ihe ahụ i kwuru na ị ga-eme ha ma ha mee ihe ahụ ị sịrị ha emela. Ị kwesịghịkwa iji iwe na-adọ ụmụ gị aka ná ntị.”​—Owen, onye bi n’Ingland.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]

“Unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”​—Ndị Kọlọsi 3:21

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

IHE NDỊ MERE N’EZINỤLỌ ỤFỌDỤ

Otú Naanị M Si Na-azụ Ụmụ M

Ajụjụ ọnụ a gbara Lucinda Forster

Ebe ọ bụ naanị gị na-azụ ụmụ gị, olee ihe kacha esiri gị ike?

Ịzụ ụmụ adịghị mfe. Ma, ọ na-akacha esi ike ma ọ bụrụ naanị otu onye na-azụ ha. Ohere anaghị apụtara m, ike na-agwụkarịkwa m. Ịkụziri ụmụaka otú ha ga-esi na-akpa ezigbo àgwà na-ewe oge. Mgbe ụfọdụ, anyị anaghịdị enwe ohere ịkọwa akụkọ ma ọ bụ tụrụwa ndụ. Ọtụtụ mgbe, m na-ahapụ ike m kwesịrị izu ka m nwee ike rụchaa ọrụ ndị dị n’ụlọ.

Gịnị ka ị na-eme iji hụ na gị na ụmụ gị na-ekwurịta okwu nke ọma?

Di na nwunye gbaa alụkwaghịm, ọ na-adị ụmụaka ka e nweghịzi onye ga na-elekọta ha, obi anaghịkwa adị ha mma. Achọpụtala m na ụmụ m mee ihe na-adịghị mma, m lee ha anya ma wetuo obi gwa ha okwu, ọ na-eme ka ha gee m ntị. Anaghị m agwa ha okwu mgbe ahụ iwe ji onye ọ bụla. M kwuwekwanụ gbasara ihe ahụ ha mere, anaghị m ekwu ya ka à ga-asị na ihe ha mere ajọgbuola onwe ya. Anyị kpawa otú ihe ga-esi aga n’ụlọ anyị, m na-agwa onye nke ọ bụla ka o kwuo uche ya. Ha kwuwe, m na-ege ha ntị ma gwa ha na aghọtara m ihe ha na-ekwu. Ana m ajụ ha otú ha si eme n’ụlọ akwụkwọ, ha kwuchaakwa, mụ ajaa ha mma maka mbọ ha na-agba. Anyị na-erikọ nri ọnụ, o nweghịkwa onye ya na ibe ya na-ese okwu. M na-agwakwa ha mgbe niile na m hụrụ ha na-anya.

Olee otú i si adọ ụmụ gị aka ná ntị?

Ndị nne na nna kwesịrị ime ka ụmụ ha mata ihe ndị ha kwesịrị ime na ihe ndị ha na-ekwesịghị ime. Ha kwesịkwara ịkwụrụ n’okwu ha. Anaghị m emesi ụmụ m ike, ma, anaghị m emere ha ọnụ mmiri mmiri. M na-eme ka ha ghọta na ihe ha mere adịghị mma. Tupu mụ adọwa ha aka ná ntị, m na-agwa ha ka ha kọọrọ m ihe mere ha ji mee ihe ha mere. Ọ bụrụ na m mejọrọ ihe, ya bụ, na aghọtachaghị m otú ihe ahụ si mee, m na-arịọ ha ka ha gbaghara m.

Olee otú i si akụziri ụmụ gị ka ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù?

M na-echetara ha ka ha na-eme ihe Jizọs kụziri, ya bụ, ka ha na-emeso ndị ọzọ otú ha chọrọ ka ha mesoo ha. (Luk 6:31) M na-agwa ha ka ha jiri aka ha na-edozi ihe ọ bụla na-esere ha. M na-akụzikwara ha ka ha na-emeda obi ala ekwu okwu ma a kpasuo ha iwe.

Olee ihe unu na-eme ma unu chọọ izurutụ ike?

Ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-enwe ego anyị ga-eji akpapụ akpapụ. N’ihi ya, anyị na-eji akwụkwọ akụkọ achọta ebe dị nso, nke na-agaghị efu oké ego, anyị nwere ike ịga lepụ anya. Anyị na-agakwa ebe a kụrụ ụdị osisi dị iche iche gaa hụ otú ha si eto. Anyị na-akụ ụdị akwụkwọ nri dị iche iche n’ugbo anyị, anyị na-agakwa ebe ahụ ewere ndị nke anyị ji esi nri. Ịtụrụ ndụ dị ezigbo mkpa, ọ sọkwa ya ya bụrụ naanị ịga na-elepụ anya n’ebe ọhaneze na-aga elepụ anya.

Olee ihe ndị na-eme gị obi ụtọ n’ezinụlọ unu?

E nwebeghị mgbe ọ dịịrị mụ na ụmụ m mfe, ma onye ọ bụla na ibe ya bụ nnu na mmanụ. Obi na-atọkwa anyị ezigbo ụtọ n’ihi ihe ọma Chineke na-emere anyị. Obi na-atọ m ụtọ ịhụ ka ụmụ m na-akpa ezigbo àgwà. Ụmụ m na-enwe mmasị ka mụ na ha na-anọ, mụnwa na-enwekwa obi ụtọ ma mụ na ha nọrọ. Ha na-ama mgbe obi dị m mma na mgbe iwe ji m, mgbe ụfọdụkwa, ha na-abịa makụọ m iji gosi na ha hụrụ m n’anya. Ihe ndị a na-eme m obi ụtọ. Ihe kacha eme anyị obi ụtọ bụ na Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya, n’ihi na mgbe ọ bụla ihe siiri anyị ike, ọ na-agbatara anyị ọsọ enyemaka. Ihe ndị m na-amụta na Baịbụl na-enyere m aka ịzụ ụmụ m otú dị mma.​—Aịzaya 41:13.

[Foto]

Lucinda na ụmụ ya abụọ bụ́ Brie na Shae