Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE?

Ihe Mere Baịbụl Ji Dịgide

Ihe Mere Baịbụl Ji Dịgide

Mbọ niile a gbara ka Baịbụl ghara ịdịgide kụrụ afọ n’ala. Ọ bụ ya mere Baịbụl nwere ike iji ruo gị aka taa. Ọ bụrụ na i nweta nke a sụgharịrị nke ọma, obi kwesịrị isi gị ike na ihe ị na-agụ bụ kpọmkwem ihe dị na Baịbụl mbụ e dere. * Ma, gịnị mere Baịbụl ji dịgide n’agbanyeghị na o nwere ike irekasị, na e nwere ndị chọrọ ibibi ya, nweekwa ndị chọrọ ịgbanwe ihe e dere na ya? Olee ihe mere Baịbụl ji dị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ?

“O doola m anya ugbu a na Baịbụl bụ onyinye Chineke nyere anyị”

Pọl onyeozi dere na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Ọtụtụ ndị na-amụ Baịbụl achọpụtala na ihe a Pọl dere bụ eziokwu. Ha kweere na ihe mere Baịbụl ji dịgide bụ n’ihi na ọ bụ Okwu Chineke, nakwa na Chineke hụkwara na ọ dịgidere ruo taa. Faizal, bụ́ nwoke anyị kwuru gbasara ya n’isiokwu mbụ n’Ụlọ Nche a, mechara kpebie ịmụ Baịbụl ka o jiri aka ya chọpụta ma ihe a gwara ya gbasara Baịbụl ọ̀ bụ eziokwu. Ihe ọ chọpụtara juru ya anya. Ọ chọpụtara na ọtụtụ ihe a na-akụzi na chọọchị ndị Krisendọm esighị na Baịbụl. Ihe ọ gụtara na Baịbụl gbasara ihe mere Chineke ji kee ụwa metụrụ ya n’ahụ́.

O kwuru, sị: “O doola m anya ugbu a na Baịbụl bụ onyinye Chineke nyere anyị. A sịdị kwuwe, ebe Chineke kere eluigwe na ụwa, ọ̀ bụzi inye anyị akwụkwọ, hụkwa na ọ dịgidere, ka ọ na-agaghị emeli? M kwuo na ọ gaghị emeli ya, ihe m na-ekwu bụ na Chineke abụghị Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ònyekwanụ ka m bụ ikwu ụdị ihe a?”—Aịzaya 40:8.

^ para. 3 Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị Nke Ọma?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche May 1, 2008.