Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Bụ n’Ezie Okwu Chineke E Si n’Ike Mmụọ Nsọ Dee

Baịbụl Bụ n’Ezie Okwu Chineke E Si n’Ike Mmụọ Nsọ Dee

Baịbụl Bụ n’Ezie Okwu Chineke E Si n’Ike Mmụọ Nsọ Dee

OLEE kpọmkwem ihe Pọl onyeozi bu n’uche mgbe o kwuru na Baịbụl si “n’ike mmụọ nsọ Chineke”? (2 Timoti 3:16) Ebe ọ bụ na Pọl dere akwụkwọ ahụ n’asụsụ Grik, otú o si dee okwu ahụ bụ “Chineke kunyere ume.” N’ihi ya, ihe okwu Pọl pụtara bụ na Chineke ji mmụọ nsọ ya duzie ndị dere Baịbụl ka ha dee naanị ihe Ọ chọrọ ka ha dee.

Pita onyeozi kwuru na ndị a dere Baịbụl “kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” (2 Pita 1:21) Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi jikwa kpọọ akwụkwọ ndị dị na Baịbụl “ihe odide ndị . . . dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta site n’okwukwe i nwere n’ime Kraịst Jizọs.”—2 Timoti 3:15.

Ọtụtụ ndị ekwetụghị na ọ bụ Chineke chepụtara Baịbụl. Ndị na-akatọ Baịbụl ekwuola ihe ndị na-adịghị mma banyere Baịbụl, mgbe mgbe, n’ihi ihe onye na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie bụ́ Saa Chals Mastịn kpọrọ “oké nleda anya a na-eleda akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl.” Ụfọdụ weere ha naanị dị ka “akụkọ ifo oge ochie ndị a chịkọtara ọnụ.”

Tụlee Ihe Akaebe Ndị E Nwere

Ebe ọ dị otú ahụ, è nwere ike ịtụkwasị Baịbụl obi? Ọ dị mkpa ka i mee mkpebi ziri ezi n’okwu a. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ ozi si n’aka Chineke dị na Baịbụl n’ezie, ọ ga-abụ nzuzu—ma ọ́ bụdịghị ihe ga-akpatara mmadụ ọnwụ—ileghara ya anya. Ị gaghị ekwechakwa ka o duzie ndụ gị na ihe ndị i kweere ma ọ bụrụ na i were ya naanị dị ka okwu mmadụ kama ịbụ Okwu Chineke.—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

Olee otú i nwere ike isi mee mkpebi ziri ezi n’okwu a? Olee otú i si ekpebi ma ị̀ ga-atụkwasị ndị ị matara ọhụrụ obi ma ọ bụ na ị gaghị atụkwasị ha? Ọ dị otu ihe doro anya. O siri ezigbo ike ịtụkwasị onye ị na-amachaghị obi. Ọ bụ naanị mgbe ị na-amata ndị mmadụ nke ọma karị mgbe oge na-aga ka ị ga-amata ma hà na-akwụwa aka ọtọ ma kwesị ntụkwasị obi. I nwere ike isi otú ahụ mata Baịbụl. Anabatala n’ajụghị ase ozizi ndị a na-ejighị n’aka ma ọ bụ ọbụna ndị e ji ịkpọasị na-ezi, bụ́ ndị na-ekwu ihe ndị na-adịghị mma banyere Baịbụl. Wepụta oge tụlee ihe akaebe ndị na-akwado ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ na o si “n’ike mmụọ nsọ Chineke.”

Nkatọ Ndị Sịrị na Ha Na-akwado Baịbụl Na-akatọ Ya

Ike agwụla gị n’ihi ihe ụfọdụ ndị sịdịrị na ha na-akwado Baịbụl na-ekwu, nke bụ́ na ihe Baịbụl kwuru abụghị eziokwu nakwa na e kwesịghị ịtụkwasị ya obi. Akwụkwọ bụ́ New Dictionary of Theology kwuru na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-akọwa Baịbụl taa “ga-ekwu na Akwụkwọ Nsọ bụ naanị akwụkwọ ụmụ mmadụ,” n’agbanyeghị na ha sịrị na ha bụ Ndị Kraịst.

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta okpukpe na-ekwu na ọ bụghị ndị Baịbụl kwuru na ha dere akwụkwọ ndị dị na Baịbụl dere ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-ekwu na ọ bụghị Aịzaya onye amụma dere akwụkwọ Aịzaya. Ha na-ekwu na e dere akwụkwọ Baịbụl ahụ ogologo oge Aịzaya nwụchara. Akwụkwọ bụ́ Concise Bible Commentary, nke Lọta Klak dere, kwuru na ọ bụ “akwụkwọ ọtụtụ ndị dere n’ime ọtụtụ narị afọ.” Ma, ikwu otú ahụ bụ ileghara eziokwu ahụ bụ́ na Jizọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya kwuru ugboro ugboro na ọ bụ Aịzaya dere akwụkwọ ahụ.—Matiu 3:3; 15:7; Luk 4:17; Jọn 12:38-41; Ndị Rom 9:27, 29.

Nke ka njọ bụ na ndị na-akatọ Baịbụl, dị ka otu onye na-enye nkọwa bụ́ J. R. Dumelo, na-ekwu na amụma ndị dị n’akwụkwọ Daniel “bụ nnọọ ihe ndị merela eme nke onye dere ya dere ka à ga-asị na ọ bụ amụma e buru n’oge ochie.” Ọzọkwa, ikwu otú ahụ pụtara na ha leghaara akaebe Jizọs Kraịst gbara n’onwe ya anya. Jizọs dọrọ aka ná ntị banyere ihe ọ kpọrọ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, nke Daniel onye amụma kwuru banyere ya, ka o guzo n’ebe nsọ.” (Matiu 24:15) Onye Kraịst ò kwesịrị ikwere na Jizọs Kraịst n’onwe ya so na-aghọgbu ndị mmadụ, ya bụ, na ọ kwadoro ihe merela eme a kọrọ ka à ga-asị na ọ bụ amụma? Mbanụ.

Ò Nwere Ihe O Mere?

I nwere ike ịjụ, sị: “Ò nwere ihe o mere ma ọ̀ bụ ndị ahụ a sịrị na ọ bụ ha dere akwụkwọ ndị dị na Baịbụl dere ha ma ọ̀ bụ na ọ bụghị ha?” Ee, o nwere nnọọ ihe o mere. Olee otú ị ga-esi were akwụkwọ kwuru na ọ bụ ékpé ikpeazụ enyi gị kere tupu ya anwụọ ma ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ bụghị ya dere ya n’ezie? Ka e were ya na ndị ọkachamara gwara gị na ọ bụ ndị ọzọ dere ya—na ọ bụ ndị enyi hụrụ enyi gị ahụ n’anya dere ihe ha chere bụ́ uche ya. Nke ahụ ọ́ gaghị eme ka ị ghara ijicha akwụkwọ ahụ kpọrọ ihe? Obi ọ̀ ga-esi gị ezigbo ike na ihe e dere na ya bụ nnọọ uche enyi gị?

Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị Baịbụl. Ka a sịkwa ihe mere na ọ naghị enye ọtụtụ ndị nsogbu n’obi—ọbụna ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst—ileghara ihe o kwuru banyere ịkwụwa aka ọtọ, izere ịkwa iko, na ihe ndị ọzọ, anya. Ị́ nụbeghị ọtụtụ mgbe ka ndị mmadụ na-ekwu okwu nlelị ndị dị ka, “Ma, nke ahụ bụnụ n’Agba Ochie!”—ka à ga-asị na ihe dị n’Agba Ochie enweghị ezigbo uru ọ bara. Ha na-ekwukwa nke a n’agbanyeghị na Pọl onyeozi kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ha na-akpọ Agba Ochie “ihe odide . . . dị nsọ” ndị si “n’ike mmụọ nsọ Chineke.”

I nwere ike ịsị: “O nweghị otú anyị ga-esi leghara ihe ndị ọkachamara na ndị ọkà mmụta niile kwuru anya.” Nke ahụ bụ eziokwu! Dị ka ihe atụ, ọ bụ ndị ọkà mmụta na-eme ihe n’eziokwu nyeere anyị aka inweta ihe odide ndị mbụ nke Baịbụl. O doro anya na e nwere obere ihe ndị e dehiere na Baịbụl n’oge a na-edepụtaghachi ya ugboro ugboro n’ime ọtụtụ narị afọ. Ma, cheta nke a: Ọ dị ezigbo ọdịiche dị n’ịmata na e nwere obere ihe ndị e dehiere mgbe a na-edepụtaghachi Baịbụl na iwere Baịbụl dum dị ka ihe ụmụ mmadụ chepụtara.

Nọgide Na-ekwere “Ihe Odide Ndị ahụ Dị Nsọ”

Tupu Pọl ekwuo na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ gwara Timoti ihe mere akwụkwọ ahụ si n’ike mmụọ nsọ ji dị oké mkpa. O kwuru, sị: “N’oge ikpeazụ, ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ, na-eduhie ndị mmadụ ma bụrụ ndị a na-eduhie.” (2 Timoti 3:1, 13) N’oge Pọl, ndị yiri ka hà bụ ‘ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi’ ejirila “arụmụka ire ụtọ” na-eduhie ndị mmadụ ma na-eme ka okwukwe ha nwere na Jizọs Kraịst ghara isikwa ike. (1 Ndị Kọrịnt 1:18, 19; Ndị Kọlọsi 2:4, 8) Iji chebe Timoti ka ha ghara imegharị ya anya, Pọl gbara ya ume ka ọ ‘nọgide n’ihe ndị ọ mụtara malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ n’ihe odide ndị ahụ dị nsọ’ sitere n’aka Chineke.—2 Timoti 3:14, 15.

Ọ dịkwa mkpa ka i mee otu ihe ahụ “n’oge ikpeazụ” a. Echela na ihe ndị nwere nnọọ ọgụgụ isi na-ekwu, nke na-abụkarị nnọọ “arụmụka ire ụtọ,” enweghị ike iduhie gị. Kama nke ahụ, dị ka Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ mere, chebe onwe gị site n’ịdabere kpamkpam n’ihe ị na-amụta na Baịbụl—nke bụ́ n’ezie Okwu Chineke nke si n’ike mmụọ nsọ.

Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka inwe okwukwe na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike igosi gị otú ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl sirila na-abara ndị mmadụ uru kemgbe ụwa; otú Baịbụl na sayensị si nwee otu olu mgbe Baịbụl na-ekwu ihe metụtara sayensị; otú Baịbụl si nwee otu olu, malite n’isi ruo ná njedebe; otú amụma ya dị iche iche sirila mezuo—nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ, detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ iji mata ihe nyeerela ọtụtụ nde mmadụ nwere obi eziokwu aka ịchọpụta na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’ezie.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Olee otú i si ekpebi ma ị̀ ga-atụkwasị ndị ị matara ọhụrụ obi ma ọ bụ na ị gaghị atụkwasị ha?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ọ bụ ndị ọkà mmụta na-eme ihe n’eziokwu nyeere anyị aka inweta ihe odide ndị mbụ nke Baịbụl