Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnapụta Dị Ụmụ Mmadụ Mkpa!

Nnapụta Dị Ụmụ Mmadụ Mkpa!

Nnapụta Dị Ụmụ Mmadụ Mkpa!

NÁ MBEREDE, mmiri sọjuru ebe a na-egwu kool, bụ́ nke na-adịghị anya na Pittsburgh, Pennsylvania, U.S.A. Mmadụ itoolu ndị na-egwu kool wee tọ n’ime ime ala. Ha nọrọ ebe ahụ ụbọchị atọ. E mechaa, ha pụtara n’enweghị ihe mere ha. Olee otú e si kpọpụta ha?

Ihe ndị nyeere ndị kpọpụtara ha aka bụ maapụ ebe ahụ a na-egwu kool na ígwè e ji amata ebe ihe dị. Ha gwuru olulu nke mbara ya dị sentimita iri isii na ise, wee si na ya wedara ndị ahụ ihe yiri nkata n’ebe ahụ ha tọrọ. E ji ihe ahụ kpọpụta ha otu otu n’ebe ahụ ha gaara anọ nwụọ. Ahụ́ ruru ha niile ala, obi tọkwara ha ụtọ, ha nwekwara obi ekele na a kpọpụtara ha.

Ọtụtụ n’ime anyị agaghị atọ n’ime ala dị ka mmadụ itoolu ahụ na-egwu kool, ma ọ bụ nwee ọdachi ga-eme ka ọnwụ kụọrọ anyị aka n’ụzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, nnapụta dị anyị niile mkpa, n’ihi na ọrịa, ịka nká na ọnwụ na-akpa anyị aka ọjọọ. Otu nwoke kwesịrị ntụkwasị obi nke dịrị ndụ n’oge ochie, bụ́ Job, kwuru, sị: “Mmadụ nke nwaanyị mụrụ, ndụ ya na-adị mkpụmkpụ, jupụtakwa ná nsogbu. Ọ pụtawo dị ka okooko osisi, e wee bipụ ya, ọ na-agafekwa ọsọ ọsọ dị ka onyinyo, ọ naghịkwa adịgide.” (Job 14:1, 2) Kemgbe puku afọ atọ na narị ise o kwuru okwu a, ihe o kwuru na-eme, ka ò nwere onye n’ime anyị nwere ike imecha gbanahụ ọnwụ? N’agbanyeghị ebe anyị bi ma ọ bụ otú anyị si agbalị ka ahụ́ sie anyị ike, ọ dị anyị mkpa ka a napụta anyị n’ahụhụ, n’ịka nká, nakwa n’aka ọnwụ.

Ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ọzọ na-agbalịsi ike ka ndị mmadụ na-adị ndụ karịa afọ ole ha na-adịru. Otu òtù ndị ọrụ ebere kwuru na ebumnobi ha bụ “ime ka nnwụchu ọnwụ kwụsị” na “inyere ndị òtù ha aka ka ha gbasie mbọ ike ka ha ghara ịnwụ anwụ.” Ma, ka ọ dị ugbu a, mgbalị ndị nkà mmụta sayensị na-eme na ọchịchọ ndị mmadụ nwere ịdị ogologo ndụ emebeghị ka ụmụ mmadụ na-adị ndụ karịa afọ iri asaa ma ọ bụ iri asatọ ahụ Mozis kwuru na ha ga na-adị, kemgbe puku afọ atọ na narị ise gara aga.—Abụ Ọma 90:10.

Ma ì kwere ihe Job kwuru banyere ọnwụ na ndụ, ma ọ bụ na i kweghị, ka oge na-aga, gị onwe gị aghaghị ‘ịgafe ọsọ ọsọ dị ka onyinyo,’ hapụ ndị enyi gị, ndị ezinụlọ gị, ụlọ gị, na ihe niile i mere ná ndụ, nwụọ. Eze Sọlọmọn, bụ́ onye amamihe nke chịrị Izrel oge ochie, dere, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ, n’ihi na e chefuwo ihe niile a pụrụ icheta banyere ha.”—Ekliziastis 9:5.

Ọ bụ ezie na ọ dị mwute ikwu ya, ma nke bụ́ eziokwu, dị ka Baịbụl kwuru, bụ na ọnwụ ‘na-achị ụmụ mmadụ dị ka eze’ obi tara mmiri. N’eziokwu, ọnwụ bụ nnukwu onye iro, nke ọ dị ụmụ mmadụ mkpa ka a napụta ha n’aka ya. (Ndị Rom 5:14; 1 Ndị Kọrịnt 15:26) O nweghị ndị ga-agbatara gị ọsọ enyemaka wee napụta gị kpamkpam n’aka ọnwụ, n’agbanyeghị otú e si zụọ ha na ụdị ngwá ọrụ ha nwere. Ma, Onye kere ụmụ mmadụ, bụ́ Jehova Chineke, emewo ndokwa ịnapụta gị.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 3]

Ọ bụ Gene J. Puskar-Pool/Getty Images sere foto a