Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Ihe Aha A Gụrụ Mmadụ Pụtara?

Ò Nwere Ihe Aha A Gụrụ Mmadụ Pụtara?

Ò Nwere Ihe Aha A Gụrụ Mmadụ Pụtara?

Otu nwaanyị Itiopia mụrụ nwa nwoke, ṅụrịwa ọṅụ. Ma, obi ụtọ ya lara mgbe ọ hụrụ na nwa ya anaghị emegharị ahụ́. Nne di nwaanyị ahụ kuuru nwatakịrị ahụ ka ọ saa ya ahụ́, nwa ahụ amalite imegharị ahụ́ na mberede, kuwe ume ma bewe ákwá! Aha nna nwatakịrị ahụ pụtara “Ọrụ Ebube.” N’ihi ya, ndị mụrụ ya wetara otu okwu ọzọ bụ́ asụsụ Amharic, jikọta ya n’aha nna nwa ahụ, gụzie ya aha pụtara A Rụọla Ọrụ Ebube.

Na Burundi, otu nwa okorobịa gbanahụrụ ndị soja chọrọ igbu ya. Ka o zoro n’ime ọhịa, o kwere Chineke nkwa na ọ bụrụ na ọ zọpụta ya, na ya ga-agụ nwa mbụ ya Manirakiza, nke pụtara “Ọ Bụ Chineke Na-azọpụta.” Mgbe afọ ise gafere, nwa okorobịa ahụ mụrụ nwa nwoke, gụọ ya aha ahụ iji kelee Chineke maka idewe ya ndụ.

O NWERE ike ịtụ ụfọdụ ndị n’anya ịnụ na a na-agụ ụmụaka aha ndị nwere ihe ha pụtara. Ma, o teela e mewere ya. N’eziokwu, ụdị aha ahụ juru na Baịbụl. Ịghọta ihe aha ndị ahụ pụtara ga-eme ka ị na-eritekwu uru mgbe ị na-agụ Baịbụl. Lebagodị anya n’ụfọdụ n’ime ha.

Aha Ndị Nwere Ihe Ha Pụtara Bụ́ Ndị Dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru

Otu n’ime aha mbụ ndị e dere na Baịbụl bụ Set. Ọ pụtara “Onye A Họpụtara Ahọpụta.” Nne Set, bụ́ Iv, kwuru ihe mere o ji gụọ nwa ya aha ahụ. Ọ sịrị: “Chineke ahọpụtaworo m mkpụrụ ọzọ n’ọnọdụ Ebel, n’ihi na Ken gburu ya.” (Jenesis 4:25) Nwa nwa Set, bụ́ Lemek, gụrụ nwa ya nwoke Noa, nke pụtara “Ezumike” ma ọ bụ “Ngụgụ Obi.” Lemek kwuru na ihe mere ya ji gụọ nwa ya aha ahụ bụ na ‘ọ ga-ewetara ha nkasi obi n’ọrụ ha nakwa ná ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ihi ọnụ Jehova bụrụ ala.’—Jenesis 5:29.

Chineke ji aka ya gụgharịa ụfọdụ ndị toro eto aha iji buo amụma ihe ga-eme. Dị ka ihe atụ, ọ gbanwere aha Ebram, nke pụtara “Nna Bụ Ihe Ukwu,” kpọzie ya Ebreham, nke pụtara “Nna nke Ìgwè Mba.” Ebreham mechara ghọọ nna ọtụtụ mba, nke dabara n’aha ya. (Jenesis 17:5, 6) Ọ ga-abụkwa na aha nwunye Ebreham, bụ́ Seraị, pụtara “Esemokwu.” O doro anya na obi tọrọ ya ezigbo ụtọ mgbe Chineke gụgharịrị ya aha, kpọọ ya “Sera,” nke pụtara “Nwunye Eze,” bụ́ nke na-egosi na ụmụ ụmụ ya ga-abụ ndị eze.—Jenesis 17:15, 16.

Chineke jikwa aka ya họrọ aha a gụrụ ụmụaka ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Ebreham na Sera ka ha gụọ nwa ha nwoke Aịzik, nke pụtara “Ọchị.” Aha ahụ ga na-echetara di na nwunye ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ihe ha mere mgbe a gwara ha na ha ga-amụ nwa nwoke n’agadi. Mgbe Aịzik toro, bụrụ ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ ga-abụ na aha ya nọ na-eme ka Ebreham na Sera na-amụmụ ọnụ ọchị ma ha na nwa ha ha hụrụ n’anya nọrọ.—Jenesis 17:17, 19; 18:12, 15; 21:6.

Nwunye nwa Aịzik, bụ́ Rechel, nwere ihe dị iche mere o ji gụọ nwa ikpeazụ ya aha. Mgbe Rechel nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ gụrụ nwa ahụ Ben-onaị, nke pụtara “Nwa Iru Uju M.” Jekọb, bụ́ di ya ọ hapụrụ, gbanwetụrụ aha nwa ahụ, kpọzie ya Benjamin, nke pụtara “Nwa Aka Nri.” Aha ahụ gosiri na nwa ahụ ga-enweta ihu ọma ndị ọzọ, nyekwa ndị ọzọ nkwado.—Jenesis 35:16-19; 44:20.

Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-aza aha ma ọ bụ a gụọ ya aha n’ihi otú ahụ́ ya dị. Dị ka ihe atụ, Aịzik na Ribeka mụrụ nwa nwoke ajị na-acha ọbara ọbara, nke yiri uwe e ji ajị anụ mee, juru n’ahụ́. N’ihi ya, ha gụrụ ya Isọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na aha Hibru ahụ pụtara “Onye Gbara Ajị.” (Jenesis 25:25) Akwụkwọ Rut kwuru na Neomi mụrụ ụmụ nwoke abụọ. A gụrụ otu n’ime ha Malọn, nke pụtara “Onye Ọrịa, Onye Ahụ́ Na-adịghị,” gụọkwa onye nke ọzọ Kilịọn, nke pụtara “Onye Na-esighị Ike.” E kwughị ma ọ̀ bụ mgbe a mụrụ ha ka a gụrụ ha aha ndị ahụ ka ọ̀ bụ mgbe ha toro. Ma o yiri ka aha ndị ahụ hà dabara adaba ebe ọ bụ na ha nwụchuru ọnwụ.—Rut 1:5.

Ihe ọzọ a na-eme n’oge ochie bụ ịgbanwe aha mmadụ ma ọ bụ gbanwetụ ihe na ya. Mgbe di Neomi na ụmụ ya nwụrụ, ọ gba aka lọta Betlehem. N’ihi ya, ọ chọkwaghị ka a kpọọ ya Neomi, nke pụtara “Ihe Obi Ụtọ M.” Kama nke ahụ, o kwusiri ike, sị: “Unu akpọla m Neomi. Kpọwanụ m Mera [nke pụtara “Ihe Ilu”], n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emewo m ihe obi ilu dị ukwuu.”—Rut 1:20, 21.

Ihe ọzọkwa a na-eme bụ ịgụ mmadụ aha iji na-echeta ihe pụrụ iche mere n’oge a mụrụ ya. Dị ka ihe atụ, aha Hagaị onye amụma pụtara “Onye A Mụrụ n’Oge Ememme.” *

Aha Ndị Nwere Ihe Ha Pụtara n’Oge Ndị Kraịst

O nwere ihe pụrụ iche aha Jizọs pụtara. Tupu a mụọ ya, Chineke gwara nne na nna ya, sị: ‘Unu ga-agụ ya Jizọs’ nke pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” Ọ̀ bụ maka gịnị? Mmụọ ozi ahụ nke gwara Josef okwu, kwuru, sị: “Ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.” (Matiu 1:21) N’oge e mere Jizọs baptizim, e ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ, a gbakwụnyezie okwu Hibru bụ́ “Mesaya” n’aha ya. Otú e si akpọ aha Hibru ahụ n’asụsụ Grik bụ “Kraịst.” Ha abụọ pụtara “Onye E Tere Mmanụ.”—Matiu 2:4.

Jizọs gụkwara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya aha na-egosi ụdị ndị ha bụ. Dị ka ihe atụ, ọ gụrụ Saịmọn aha Arameik bụ́ Sifas, nke pụtara “Oké Nkume.” Sifas bụ “Pita” ma a sụgharịa ya n’asụsụ Grik. O mechakwara bụrụ Pita ka ọtụtụ ndị ji mara ya. (Jọn 1:42) Aha Jizọs gụrụ Jems na Jọn, bụ́ ụmụnne abụọ na-anụ ọkụ n’obi, bụ “Boanajis,” nke pụtara “Ụmụ Égbè Eluigwe.”—Mak 3:16, 17.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọgidere na-agụ ndị mmadụ aha na-egosi ụdị ndị ha bụ. Dị ka ihe atụ, ndịozi gụrụ Josef, onye na-eso ụzọ Jizọs, Banabas, nke pụtara “Nwa Nkasi Obi.” Banabas mere ihe aha ya pụtara. Ọ kasiri ọtụtụ ndị obi, ma n’inye ha ihe onwunwe ma n’inyere ha aka ife Chineke.—Ọrụ 4:34-37; 9:27; 15:25, 26.

Aha Gị Dị Mkpa

Ọ bụghị anyị họọrọ aha a gụrụ anyị mgbe a mụrụ anyị. Ma, ọ bụ naanị anyị ga-ekpebi ihe ndị mmadụ ga-eji amara anyị. (Ilu 20:11) Jụgodị onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na Jizọs na ndịozi ya nọ ugbu a, olee aha ha ga-agụ m? Olee aha dabara adaba nke ga-egosi ụdị àgwà m nwere ma ọ bụ ụdị onye m bụ?’

Anyị kwesịrị ichebara ajụjụ a echiche nke ọma. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na Eze Sọlọmọn, bụ́ onye maara ihe, dere, sị: “Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu.” (Ilu 22:1) N’eziokwu, anyị nwere ezigbo ihe ma ọ bụrụ na anyị nwere ezi aha n’ebe anyị bi ma ọ bụ ma e jiri aha ọma mara anyị. Ma nke ka mkpa bụ na anyị ga-enweta akụ̀ ga-adịru ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị emeere onwe anyị ezi aha n’ebe Chineke nọ. Olee otú anyị ga-esi enweta ya? Chineke kwere nkwa na ya ga-edeba aha ndị na-atụ egwu ya ‘n’akwụkwọ ncheta,’ ọ ga-enyekwa ha ndụ ebighị ebi.—Malakaị 3:16; Mkpughe 3:5; 20:12-15.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ọtụtụ Ndịàmà Jehova bi n’Africa na-aza aha ndị na-egosi isiokwu mgbakọ Ndịàmà nwere n’oge a mụrụ ha.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 15]

Olee aha dabara adaba nke ga-egosi ụdị onye m bụ?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

Ònye Bụ Ịmanuel?

Aha a gụrụ ụfọdụ ndị na Baịbụl bụ aha ndị e ji buo amụma, ndị gosiri ọrụ ha ga-arụ. Dị ka ihe atụ, Aịzaya onye amụma si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Lee! Nwa agbọghọ ahụ ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke, ọ ga-agụ ya Ịmanuel.” (Aịzaya 7:14) Aha a pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.” Ụfọdụ ndị na-akọwa Baịbụl ekwuola na onye mbụ amụma ahụ mezuru n’isi ya bụ otu n’ime ndị eze Izrel ma ọ bụ otu n’ime ụmụ Aịzaya. Ma, Matiu, onye so dee Oziọma Jizọs, kwuru na amụma ahụ Aịzaya buru mezuru kpamkpam n’isi Jizọs.—Matiu 1:22, 23.

Ụfọdụ ndị ekwuola na ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na Jizọs bụ Ịmanuel, ihe ọ pụtara bụ na Baịbụl na-akụzi na Jizọs bụ Chineke. Ma, ọ bụrụ otú ahụ, ihe ọ pụtara bụ na Elaịhu, bụ́ onye kasiri Job obi ma gbazie ya olu, bụkwa Chineke. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na aha ya pụtara “Ọ Bụ Chineke M.”

O nweghị mgbe Jizọs kwuru na ya bụ Chineke. (Jọn 14:28; Ndị Filipaị 2:5, 6) Ma, o ṅomiri Nna ya nke ọma, mezuokwa ihe niile Chineke kwuru na Mesaya ahụ ga-eme. (Jọn 14:9; 2 Ndị Kọrịnt 1:20) Aha ahụ bụ́ Ịmanuel na-egosi nke ọma ọrụ Jizọs ga-arụ dị ka Mkpụrụ bụ́ Mesaya, ya bụ, nwa Devid, onye ga-egosi na Chineke nọnyeere ndị na-efe Ya ofufe.

[Foto]

ỊMANUEL “Chineke Nọnyeere Anyị”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

Aha Nwere Ihe Kacha Mkpa Ọ Pụtara

Aha Chineke pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa n’ime Baịbụl. Ọ bụ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ bụ́ יהוה, nke ọtụtụ ndị na-akpọ “Jehova” n’asụsụ Igbo. Gịnị ka Jehova pụtara? Mgbe Mozis jụrụ Chineke banyere aha ya, Jehova zara ya, sị: “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụpụ 3:14) N’ihi ya, aha Chineke na-emesi anyị obi ike na Ọ ga-abụ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo ihe niile o zubere. (Aịzaya 55:8-11) Mgbe ọ bụla Chineke kwere nkwa, anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi ma mee ka ndụ anyị hiwe isi ná nkwa ya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na aha ya bụ Jehova.

[Foto dị na peeji nke 13]

EBREHAM “Nna nke Ìgwè Mba”

[Foto dị na peeji nke 13]

SERA “Nwunye Eze”