Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ekpenta e kwuru okwu ya na Baịbụl ọ̀ bụ ụdị nke na-arịa ndị mmadụ taa?

Ọrịa a na-akpọ “ekpenta” taa bụ ọrịa nje nke na-arịa ụmụ mmadụ. Onye mbụ chọpụtara nje ahụ (nke a na-akpọ Mycobacterium leprae) bụ Dr. G.A. Hansen, n’afọ 1873. Ndị na-eme nchọpụta achọpụtala na ọ bụrụ na nje ahụ dị n’imi mmadụ ziri, o nwere ike dịrị ndụ ruo abalị itoolu. Ha achọpụtakwala na ọ bụrụ na mmadụ ana-akpa onye na-arịa ọrịa ekpenta nso, o yikarịrị ka ọ̀ ga-ebute ya. Ha kwukwara na mmadụ nwere ike isi n’uwe onye na-arịa ọrịa ahụ bute ya. Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na mmadụ ole malitere ịrịa ọrịa ekpenta n’afọ 2007 dị ihe karịrị narị puku abụọ na puku iri abụọ.

O doro anya na n’oge Baịbụl, e nwere ndị rịara ekpenta n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu, Iwu Mozis kwukwara ka a kpọpụ onye ekpenta iche. (Levitikọs 13:4, 5) Ma, okwu Hibru bú tsa·raʹʽath, nke a sụgharịrị “ekpenta” apụtaghị naanị ọrịa na-arịa mmadụ. Tsa·raʹʽath na-emekwa ma n’uwe ma n’ụlọ. Ụdị ekpenta ahụ nwere ike ịpụta n’uwe e ji ajị anụ mee ma ọ bụ uwe ákwà linin ma ọ bụkwanụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ rụọ. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike iji mmiri sachapụ ya. Ma, ọ bụrụ na “nke na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ ọbara ọbara” ekweghị apụ, a na-akpọ uwe ahụ ma ọ bụ akpụkpọ anụ ahụ ọkụ. (Levitikọs 13:47-52) Ọ bụrụ na ọrịa ahụ dị n’ahụ́ ụlọ, ebe ọ dị ‘na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ ọbara ọbara, dakpuokwa ime.’ A na-ewepụ nkume na ụrọ ọrịa ahụ pụtara na ya, kpofuo ha n’ebe ndị mmadụ na-ebighị. Ọ bụrụ na ọrịa ahụ apụta ọzọ, a na-akwatu ụlọ ahụ, kpofuokwa ihe niile e ji rụọ ya. (Levitikọs 14:33-45) Ụfọdụ ndị ekwuola na ekpenta ahụ na-apụta n’uwe na n’ụlọ nwere ike ịbụ ihe a na-akpọ ebù ugbu a. Ma, e jighị nke ahụ n’aka.

Gịnị mere ozi ọma Pọl onyeozi ziri n’Efesọs ji mee ka ndị na-eji ọlaọcha akpụ ihe kpasuo ọgba aghara?

N’Efesọs, ndị na-eji ọlaọcha akpụ ihe ‘na-eji ọlaọcha akpụ ụlọ arụsị Atemis,’ ha na-ejikwa ya akpata ezigbo ego. Ndị Efesọs kweere na Atemis ahụ na-echebe ndị na-efe ya, bụrụkwa chi na-ahụ maka ịchụ nta, ịtụrụ ime na ịmụ nwa. (Ọrụ 19:24) Ndị na-efe ya sịrị na ihe oyiyi ya “si n’eluigwe” daa, ha dewekwara ya n’ụlọ nsọ Atemis nke dị n’Efesọs. (Ọrụ 19:35) E weere na ụlọ nsọ ahụ so n’ihe ịtụnanya asaa a rụrụ n’ụwa n’oge ochie. Ọtụtụ ndị na-efe chi ahụ na-abịa n’Efesọs n’agbata ọnwa March na April kwa afọ maka ememme e ji asọpụrụ Atemis. Ọtụtụ ndị ọbịa na-abịanụ na-azụrụ ọtụtụ ihe oyiyi, bụ́ ndị ha ji emere ihe ncheta, ọtụmọkpọ ma ọ bụ ihe ha ji achụrụ chi nwaanyị ha àjà ma ọ bụkwanụ ihe ezinụlọ ha ga-eji na-efe ofufe ma ha laa. Ihe odide e dere n’oge ochie n’Efesọs kwuru na a na-eji ọlaedo na ọlaọcha akpụ ihe oyiyi Atemis. Ihe ndị ọzọ e dere kwukwara kpọmkwem na e nwere òtù ndị na-eji ọlaọcha akpụ ihe.

Pọl kụziri na ihe oyiyi “ndị e ji aka mee abụghị chi.” (Ọrụ 19:26) N’ihi ya, ndị na-eji ọlaọcha akpụ ihe hụrụ na okwu Pọl ga-emechiri ha ebe ha si eri ihe, ha akpasuo ọgba aghara ka Pọl ghara ikwusakwa ozi ọma ya. Dimitriọs, bụ́ otu n’ime ndị ahụ na-eji ọlaọcha akpụ ihe, kwuru iwe ha, sị: “Ihe ize ndụ dị na ya abụghị naanị na ọrụ anyị agakwaghị enwe ùgwù, kamakwa, a ga-ewere ụlọ nsọ nke nnukwu chi nwaanyị bụ́ Atemis dị ka ihe efu, a na-agakwa ime ka ọbụna ịdị ebube ya, bụ́ nke ógbè Eshia na elu ụwa dum mmadụ bi na-efe ofufe, bụrụ ihe efu.”—Ọrụ 19:27.