Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Adam na Iv Hà Dịrị Ndụ n’Ụwa n’Ezie?

Adam na Iv Hà Dịrị Ndụ n’Ụwa n’Ezie?

Adam na Iv Hà Dịrị Ndụ n’Ụwa n’Ezie?

ỌTỤTỤ ndị chere na ihe akwụkwọ Jenesis kọrọ banyere Adam na Iv bụ nnọọ akụkọ na-atọ ụtọ ná ntị. Otu akwụkwọ ozi e degaara onye editọ magazin bụ́ Time kwuru, sị: “Ọ dịla anya ọtụtụ ndị ụka lewere akụkọ ndị a kọrọ na Jenesis, dị ka nke Adam na Iv, anya ka akụkọ ifo.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Katọlik, ndị Protestant, na ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu kweere nke a. Ha na-ekwu na ọtụtụ n’ime ihe e dere na Jenesis ekwekọghị n’ihe mere eme ma ọ bụ na sayensị.

Gịnị ka i chere? Ì kweere na Adam na Iv dịrị ndụ n’ụwa n’ezie? È nwere ihe akaebe ọ bụla na-egosi na ha dịrị nnọọ ndụ n’ụwa? Ya bụrụkwanụ na anyị ekwere na akụkọ ndị dị na Jenesis bụ naanị akụkọ ifo, gịnị ka ọ ga-apụta?

Ihe A Kọrọ na Jenesis—Ò Kwekọrọ na Nkà Mmụta Sayensị?

Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe ndị bụ́ isi e kwuru banyere otú e si kee nwoke mbụ. Baịbụl kwuru banyere Adam, sị: “Jehova bụ́ Chineke wee jiri ájá si n’ala kpụọ mmadụ ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya, mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) Ihe a Baịbụl kwuru ò kwekọrọ na sayensị?

Akwụkwọ bụ́ Nanomedicine kwuru na e nwere ụdị ihe iri anọ na otu dị mkpa dị n’ahụ́ mmadụ. Ihe ndị ahụ dị mkpa, dị ka carbon, iron, ikuku oxygen, na ihe ndị ọzọ, dịcha ‘n’ájá’ dị n’ala. Ya mere, dị ka Jenesis kwuru, e ‘ji ájá si n’ala’ kpụọ mmadụ n’ezie.

Olee otú ihe ndị ahụ na-adịghị ndụ si bịakọta ọnụ ma ghọọ mmadụ dị ndụ? Iji ghọta otú nke a si sie ike, ka anyị tụlee ụgbọ mbara igwe ndị NASA, bụ́ otu n’ime ígwè ọrụ ndị kacha mgbagwoju anya a rụtụrụla. Ígwè ọrụ a dị ịtụnanya nwere akụkụ ahụ́ dị nde abụọ na ọkara. O were ìgwè ndị injinia rụrụ ya ọtụtụ afọ ịrụ ya. Tụlezie ahụ́ mmadụ. Ahụ́ mmadụ nwere ihe dị ka otu narị puku ijeri atọm ụzọ iri puku ijeri asaa, otu narị puku ijeri mkpụrụ ndụ, ọtụtụ akụkụ ahụ́, nakwa ọ dịkarịa ala, usoro itoolu bụ́ isi akụkụ ahụ́ ndị a si arụ ọrụ. Olee otú ahụ́ mmadụ a dị mgbagwoju anya, bụ́ nke a rụrụ nke ọma, si malite ịdị? Ọ̀ pụtara nnọọ n’onwe ya ka ọ̀ bụ onye nwere ọgụgụ isi kere ya?

Ajụjụ ọzọ bụ, olee ihe na-eme ka mmadụ dịrị ndụ? Olee ebe ndụ si? Ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na ha amaghị. N’ezie, ha enwedịghị otu olu n’ịkọwa ihe ndụ bụ. Ma, ndị kweere na e nwere Onye Okike maara nnọọ ebe ndụ si. N’ezie, o si n’aka Chineke. *

Oleekwanụ maka ihe ahụ e kwuru na Jenesis, nke bụ́ na e si n’ọgịrịga Adam kee Iv? (Jenesis 2:21-23) Tupu gị asị na ọ bụ akụkọ ifo, chebara ihe a mere eme echiche: Na January 2008, ndị ọkà mmụta sayensị nọ na California, U.S.A., ji mkpụrụ ndụ si n’akpụkpọ ahụ́ mmadụ torolo eto mepụta nwa ọhụrụ mbụ a na-atụghị ime ya otú e si atụ ime mmadụ. N’ezie, ndị ọkà mmụta sayensị esila otú ahụ mepụta ụmụ anụmanụ iri abụọ ma ọ dịkarịa ala. Nke ndị mmadụ kacha mara n’ime ha bụ atụrụ a kpọrọ Dolly, bụ́ nke e ji mkpụrụ ndụ si n’ara nne atụrụ mepụta n’afọ 1996. *

O nweghị onye ma ihe ga-esi n’ihe a ha na-eme pụta. Ma, ihe anyị na-ekwu bụ: Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ nwere ike isi n’ihe e wepụtara n’ahụ́ otu ihe dị ndụ mepụta ọzọ yiri ya, ọ̀ bụ na Onye Okike pụrụ ime ihe niile enweghị ike iji ihe si n’ahụ́ mmadụ kee mmadụ ọzọ? Ọ ga-amasị gị ịnụ na ndị dọkịta na-awa ahụ́ na-ejikarị ọgịrịga mmadụ arụzi ebe mebiri emebi n’ahụ́ mmadụ n’ihi otú o si eto ngwa ngwa ma na-erupụta nke ọhụrụ.

Ihe Àmà Ndị Dị na Baịbụl

Ọ na-eju ụfọdụ ndị anya ịhụ na a kpọrọ Adam na Iv aha n’ọtụtụ ebe na Baịbụl. Olee otú nke a si egosi na ihe ndị a kọrọ na Jenesis mere eme n’ezie?

Dị ka ihe atụ, tụlee usoro ọmụmụ ndị Juu ndị e dere na Baịbụl n’akwụkwọ Ihe E Mere nke Mbụ, isi 1 ruo nke 9, nakwa n’Oziọma Luk, isi 3. E depụtara nnọọ usoro ọmụmụ ọgbọ iri anọ na asatọ n’Ihe E Mere nke Mbụ, depụtakwa usoro ọmụmụ ọgbọ iri asaa na ise n’Oziọma Luk. Luk depụtara usoro ọmụmụ Jizọs Kraịst, akwụkwọ Ihe E Mere edepụta usoro ọmụmụ ndị eze na ndị nchụàjà nke ụmụ Izrel. E dere aha ndị a ma ama, ndị dị ka Sọlọmọn, Devid, Jekọb, Aịzik, Ebreham, Noa, nakwa Adam, na ha abụọ. Ndị niile e dere aha ha n’usoro ọmụmụ ndị ahụ bụ ndị mmadụ dịrị ndụ, Adam bụkwa mmadụ mbụ dịrị ndụ e dere aha ya na nke ọ bụla n’ime ha.

E wezụga nke ahụ, Baịbụl kọwara Adam na Iv ọtụtụ ugboro dị ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ n’ezie, ọ bụghị ndị a kọrọ n’akụkọ ifo. Lee ihe atụ ụfọdụ:

• “[Chineke] sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ.”—ỌRỤ 17:26.

• “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, . . . ọnwụ chịrị dị ka eze malite n’Adam ruo na Mozis.”—NDỊ ROM 5:12, 14.

• “Nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.”—1 NDỊ KỌRỊNT 15:45.

• “Adam ka e bu ụzọ kpụọ, e mesịa kpụọ Iv.”—1 TIMOTI 2:13.

• “Inọk, bụ́ onye nke asaa n’agbụrụ Adam, bukwara amụma banyere [ndị ajọ omume].”—JUD 14.

Nke ka mkpa bụ na Jizọs Kraịst, bụ́ onye akaebe kacha kwesị ntụkwasị obi e kwuru banyere ya na Baịbụl, gosiri na Adam na Iv dịrị ndụ n’ezie. Mgbe a jụrụ Jizọs ajụjụ banyere ịgba alụkwaghịm, ọ zara, sị: “Malite n’oge e kere ihe, ‘[Chineke] kere ha nwoke na nwaanyị. N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ́’ . . . Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mak 10:6-9) Jizọs ọ̀ ga-eji ndị a kọrọ n’akụkọ ifo kọwaa iwu Chineke chọrọ ka anyị rubere isi? Mba! Jizọs kwuru ihe dị na Jenesis dị ka ihe mere eme.

Mgbe akwụkwọ bụ́ The New Bible Dictionary kwusịrị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke gosiri na Adam na Iv dịrị ndụ n’ezie, o kwuziri, sị: “Agba Ọhụrụ gosiri na akụkọ ndị a kọrọ n’isi ndị mbụ nke akwụkwọ Jenesis mere eme n’ezie.”

Ihe Ọ Ga-apụta

Ọtụtụ ndị ji ezi obi na-aga chọọchị chere na ikwere na Adam na Iv dịrị ndụ n’ezie adịghị ha mkpa iji bụrụ ezigbo Ndị Kraịst. I lee ya anya elu elu, o nwere ike iyi eziokwu. Ma, ka anyị tụlegodị echiche a ma hụ ebe ọ ga-eduga anyị.

Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee ozizi Baịbụl nke ihe ka ọtụtụ ná ndị na-aga chọọchị ji kpọrọ nnọọ ihe, ya bụ, ihe mgbapụta. Ozizi a kwuru na Jizọs Kraịst nyere ndụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta iji zọpụta ndị mmadụ ná mmehie ha. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Dị ka anyị maara, ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ iji nwetaghachi ma ọ bụ zụtaghachi ihe furu efu, bụ́ nke ya na ihe ahụ furu efu hà. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ Jizọs “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ.” (1 Timoti 2:6) Anyị nwere ike ịjụ, sị, Ihe mgbapụta kwekọrọ na gịnị? Baịbụl zara ya, sị: “Dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.” (1 Ndị Kọrịnt 15:22) Ndụ zuru okè Jizọs ji chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ na-erube isi kwekọrọ ná ndụ ahụ zuru okè Adam tụfuru n’ihi mmehie mbụ ahụ e mere n’Iden. (Ndị Rom 5:12) O doro anya na ọ bụrụ na Adam abụghị onye dịrị ndụ n’ụwa, àjà mgbapụta Kraịst chụrụ agaghị aba uru ọ bụla.

Iwere ihe Jenesis kọrọ banyere Adam na Iv dị ka ihe na-adịghị mkpa ma ọ bụ ikwere na o meghị eme ga-eme ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozizi niile bụ́ isi dị na Baịbụl yie ụgha! * Isi otú ahụ eche echiche ga-eme ka e nwee ọtụtụ ajụjụ na-enweghị azịza, meekwa ka okwukwe ndị mmadụ ghara inwe ihe mgbakwasị ụkwụ.—Ndị Hibru 11:1.

Ndụ—Ò Nwere Isi Ka Ọ̀ Bụ Ihe Na-enweghị Isi?

Ka anyị lebazie anya n’ajụjụ a dị mkpa: Ịjụ ihe ndị a kọrọ na Jenesis ọ̀ na-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha nke bụ́ inwe obi ụtọ na ịmata nzube nke ndụ? Dị ka Richard Dawkins, bụ́ onye a ma ama kweere n’ozizi evolushọn nke na-ekweghịkwa na Chineke, si kwuo, eluigwe na ala “enweghị ụkpụrụ, o nweghị nzube, o nweghị ihe ọma, o nweghịkwa ihe ọjọọ, ọ chọghịkwa ịma ihe nwere ike ime n’ime ya.” Ụdị echiche a na-akụda nnọọ mmụọ, o kwekọghịkwa n’otú e si kee mmadụ!

Ma, Baịbụl zara ajụjụ ndị kacha ụmụ mmadụ mkpa ná ndụ n’ụzọ na-eju afọ, ndị dị ka: Olee otú ndụ anyị si malite? Gịnị bụ nzube nke ndụ? Olee ihe mere ihe ọjọọ na ahụhụ ji ju ebe niile n’ụwa? Ò nwere mgbe ihe ọjọọ ga-akwụsị? na ọtụtụ ajụjụ ndị ọzọ. E wezụga nke ahụ, inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst na-eme ka mmadụ nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs, dị ka ọ dị n’Iden, bụ́ ebe Chineke debere nwoke na nwaanyị mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv. (Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3-5) Nke a bụ nnọọ olileanya magburu onwe ya! *

Ọ bụ ezie na o nwere ike ịbụ na akụkọ Adam na Iv ekwekọghị n’ozizi evolushọn, ọ dabara nnọọ n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala. O kwekọkwara nnọọ n’ihe ndị ọzọ e si n’ike mmụọ nsọ dee n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, nke na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ ma mata nzube nke ndụ.

Ọ́ gaghị adị mma ka i jiri aka gị mụkwuo Baịbụl? Ndịàmà Jehova nwere mmasị ma dị njikere inyere gị aka.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu nke a, gụọ akwụkwọ ndị bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? na Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha abụọ.

^ par. 9 O doro anya na ihe ndị ọkà mmụta a mere abụghị ikepụta ndụ. Kama nke ahụ, ihe ha ji arụ ọrụ bụ mkpụrụ ndụ ndị dị ndụ e nwerela enwe.

^ par. 25 Ụfọdụ n’ime ha bụ ozizi banyere ọbụbụeze Chineke, ikwesị ntụkwasị obi ụmụ mmadụ, ihe ọma na ihe ọjọọ, mmadụ ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme, ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, alụmdi na nwunye, Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, ụwa paradaịs, Alaeze Chineke, na ọtụtụ ndị ọzọ.

^ par. 28 Iji ghọtakwuo nke a, gụọ isi nke 3 bụ́ “Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?” na isi nke 5 bụ́ “Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere,” n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 14]

O doro anya na ọ bụrụ na Adam abụghị onye dịrị ndụ n’ụwa, àjà mgbapụta Kraịst chụrụ agaghị aba uru ọ bụla

[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]

Otú ahụ e si jiri nlezianya rụọ ụgbọ mbara igwe, e jikwa nlezianya kee ahụ́ mmadụ

[Foto dị na peeji nke 15]

Jizọs gosiri na Adam na Iv bụ ndị dịrị ndụ n’ezie