Mmụọ Nsọ Ga-abara Gị Uru ná Ndụ Gị
Mmụọ Nsọ Ga-abara Gị Uru ná Ndụ Gị
“ACHỤPỤLA m n’ihu gị; biko, anapụkwala m mmụọ nsọ gị.” (Abụ Ọma 51:11) Ihe a bụ ekpere Eze Devid ji obi ya dum kpee mgbe o mechara mmehie dị oké njọ.
Ọ dịla anya ike nke mmụọ nsọ rụwara ọrụ ná ndụ Devid. Mgbe ọ ka dị afọ iri na ụma, o nyeere ya aka imeri Golayat, bụ́ ọchịagha siri ezigbo ike. (1 Samuel 17:45-50) O mekwara ka o nwee ike ide abụ ọma ndị so ná ndị kacha ụtọ e detụrụla. Devid kwuru, sị: “Ọ bụ mmụọ Jehova kwuru okwu site n’ọnụ m, okwu ya dịkwa n’ire m.”—2 Samuel 23:2.
Ọbụna Jizọs Kraịst kwuru na mmụọ nsọ rụrụ ọrụ ná ndụ Devid. O nwere mgbe Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Devid si n’ike mmụọ nsọ kwuo, sị: ‘Jehova gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m debere ndị iro gị n’okpuru ụkwụ gị.”’” (Mak 12:36; Abụ Ọma 110:1) Jizọs maara na mmụọ nsọ duziri Devid mgbe ọ na-ede abụ ọma ya. Otu mmụọ nsọ ahụ ò nwekwara ike inyere anyị aka?
“Na-arịọnụ, A Ga-enye Unu”
O nwere ike ị gaghị ede abụ ọma. Ma, i nwere ike inwe nsogbu ndị siri ike ka Golayat. Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee banyere Isabel. * Di ya hapụrụ ya gaa lụrụ nwa agbọghọ. Ọ hapụụrụ ya nnukwu ụgwọ ha ji ka ọ kwụọ naanị ya, o nwekwaghị ego ọ na-enye ya iji nyere ya aka ịzụ ụmụ ha nwaanyị abụọ. O kwuru, sị: “Ọ dị m ka è dupụtara m n’ụzọ fụnyụọ ọkụ ma mee m onye iberiibe. N’agbanyeghị nke ahụ, kemgbe ọ hapụrụ m, echere m na mmụọ Chineke enyerela m aka.”
Isabel ọ̀ tụrụ anya na ya ga-enweta mmụọ nsọ n’emeghị ihe ọ bụla? Mba, ọ rịọrọ Chineke kwa ụbọchị ka o nye ya mmụọ nsọ ya. Ọ maara na ike Chineke dị ya mkpa iji jiri obi ike na-ele anya ọdịnihu, iji lekọta ụmụ ya nke ọma, na iji maliteghachi ile onwe ya anya dị ka onye bara uru. O mere ihe a Jizọs kwuru: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ, a ga-emeghere unu.”—Matiu 7:7.
Roberto chekwara na mmụọ Chineke dị ya mkpa, ma ọ bụ n’ihi nsogbu dị iche. Ọ na-ese ụtaba na igbo mgbe niile, ha eriekwala ya ahụ́. Ọ nwara ịkwụsị ise igbo na ụtaba ruo afọ abụọ, ma ọ laghachiri na ya ugboro ugboro. Roberto kwuru, sị: “Ahụ́ anaghị eru mmadụ ala ma ọ kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ahụ́ ya ga na-achọ ya kwa ụbọchị.”
Roberto kwukwara, sị: “Ma, ekpebisiri m ike ịgbanwe ndụ m ka m nwee ike ife Chineke otú ọ chọrọ. M na-agbalị iche ihe ndị na-akasi obi dị na Baịbụl mgbe niile. Ekpesiri m ekpere ike kwa ụbọchị, na-arịọ Chineke ka o nye m ike ịgbanwe ndụ m. Amaara m na agaghị m emeli ya n’ike m. Ahụkwara m otú Jehova si zaa ekpere m, karịsịa mgbe m dara mbà n’obi n’ihi ise igbo ọzọ. Ekweere m na mmụọ nsọ Chineke mere ka m nwetaghachi ume; e wepụ mmụọ ya, ọ dịghị otú m gaara esi kwụsịlie ise igbo na ụtaba.”—Ndị Filipaị 4:6-8.
Iji “Nku Fegoo n’Elu Dị Ka Ugo”
Ike nke mmụọ nsọ arụọla ọrụ ná ndụ ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova, dị ka ọ rụrụ ná ndụ Isabel na Roberto. Ike Jehova nọ n’ọrụ, bụ́ ike o ji kee eluigwe na ụwa, nwere ike iru gị aka ma ị chọọ. Chineke dị njikere ma nwee mmasị inye gị mmụọ ya ma ọ bụrụ na ị rịọsie ya ike maka ya. Ma, iji nweta mmụọ ahụ, ọ dị mkpa ka ị mụta eziokwu banyere Ya ma jiri obi gị niile chọọ ime uche Ya.—Aịzaya 55:6; Ndị Hibru 11:6.
Ike mmụọ nsọ na-enye nwere ike inyere gị aka ife Chineke nke ọma na imeri ihe isi ike ọ bụla i nwere ike inwe ná ndụ gị. Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “[Jehova] na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike; ọ na-emekwa ka onye na-enweghị ike nwee ume nke ukwuu. . . . Ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enwetaghachi ike. Ha ga-eji nku fegoo n’elu dị ka ugo. Ha ga-agba ọsọ ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-eje ije ma ha agaghị ada mbà.”—Aịzaya 40:28-31.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 8]
‘Ekpesiri m ekpere ike kwa ụbọchị, na-arịọ Chineke ka o nye m ike. Amaara m na agaghị m emeli ya n’ike m. Ahụkwara m otú o si zaa ekpere m’
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]
ỌRỤ NDỊ MMỤỌ NSỌ RỤRỤ
Chineke ji mmụọ nsọ kee eluigwe na ụwa. Otu ọbụ abụ tiri mkpu, sị: “Jehova, lee ka ọrụ gị si dị ọtụtụ! I ji amamihe rụọ ha niile. Ụwa jupụtara n’ihe ị rụrụ. Ọ bụrụ na i zipụ mmụọ gị, a na-eke ha.”—Abụ Ọma 104:24, 30; Jenesis 1:2; Job 33:4.
Mmụọ nsọ nyere ndị ikom na-asọpụrụ Chineke ike ide Baịbụl. Pọl onyeozi dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru.” (2 Timoti 3:16) Otú e si dee okwu Grik a sụgharịrị “si n’ike mmụọ nsọ Chineke” bụ “Chineke kunyere ume n’ime ya.” Ume Jehova kupụrụ, ma ọ bụ mmụọ ya, duziri echiche ndị dere Baịbụl, nke mere ka ihe ha dere bụrụ “okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
Mmụọ nsọ nyere ndị ohu Chineke ike ikwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu n’ehieghị ụzọ. Pita onyeozi kọwara, sị: “Ọ dịghị amụma Akwụkwọ Nsọ nke si ná nkọwa mmadụ pụta. N’ihi na ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”—2 Pita 1:20, 21; Joel 2:28.
Mmụọ nsọ nyeere Jizọs na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke aka ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ịrụ ọrụ ebube. Jizọs kwuru, sị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma, o zitere m ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha, na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ.”—Luk 4:18; Matiu 12:28.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]
ỤZỌ NDỊ MMỤỌ NSỌ NWERE IKE ISI NYERE ANYỊ AKA
Mmụọ nsọ nwere ike inye gị ike imeri ọnwụnwa na ịhapụ àgwà ọjọọ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ idi, kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrịnt 10:13
Mmụọ nsọ nwere ike inyere gị aka ịmụta àgwà ndị na-amasị Chineke. “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”—Ndị Galeshia 5:22, 23.
Mmụọ nsọ nwere ike inye gị ike idi ihe isi ike. “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13.