Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Gbalịrị Ịkwụsị Ịtụ Ụjọ na Inwe Obi Abụọ

Ọ Gbalịrị Ịkwụsị Ịtụ Ụjọ na Inwe Obi Abụọ

Ṅomie Okwukwe Ha

Ọ Gbalịrị Ịkwụsị Ịtụ Ụjọ na Inwe Obi Abụọ

PITA jidesiri ụmara ya ike ka ọ na-elepụ anya ịhụ ihe na-eme n’ọchịchịrị ahụ. Ihe ahụ ọ na-ahụ n’ebe ọwụwa anyanwụ ọ̀ bụ ìhè anyanwụ, nke na-egosi na chi emechaala bọwa? Azụ na ubu na-egbu ya mgbu n’ihi ụgbọ ọ kwọrọla ọtụtụ awa. Ikuku nke na-ekusasị ntutu ya emeela ka e nwee oké ebili mmiri n’Oké Osimiri Galili. Ebili mmiri nọ na-akụ n’ihu ụgbọ ahụ, na-efesa Pita mmiri oyi n’ahụ́. Ọ nọgidere na-akwọ ụgbọ ya.

Pita na ndị ibe ya hapụrụ Jizọs naanị ya n’ikpere mmiri. N’ụbọchị ahụ, ha ahụla ka Jizọs ji ogbe achịcha ole na ole na azụ̀ nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ. Nke ahụ mere ka ndị mmadụ chọọ ime Jizọs eze, ma ọ chọghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. O kpebisikwara ike ime ka ndị na-eso ụzọ ya ghara inwewe mmasị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe o zerechaara ìgwè mmadụ ahụ, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye n’ụgbọ gawa n’ofe nke ọzọ, ya agawakwanụ n’elu ugwu ikpe ekpere.—Mak 6:35-45; Jọn 6:14, 15.

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs banyere n’ụgbọ ahụ, ọnwa nke fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọ gbazuru agbazu ka na-eti; ugbu a, o jirila nwayọọ nwayọọ na-abanye n’ebe ọdịda anyanwụ. Ma, ọ ka bụ kilomita ole na ole ka ha garala. Otú ha si na-akwọsi ụgbọ ha ike na mkpọtụ ifufe na ebili mmiri nọ na-eme ekwechaghị ha kparịta ụka. Ikekwe, Pita nọ n’oké echiche.

O nwere nnọọ ọtụtụ ihe ọ ga-eche! O soola Jizọs onye Nazaret ihe karịrị afọ abụọ. Ọ mụtala ọtụtụ ihe, ma o nwere ọtụtụ ihe ọ ka ga-amụta. Njikere ọ dị ime otú ahụ, ya bụ, ịgbalị imeri nsogbu ndị dị ka ịtụ ụjọ na inwe obi abụọ, mere ka ọ bụụrụ anyị ezi ihe nlereanya. Ka anyị hụ ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ.

“Anyị Ahụwo Mesaya Ahụ”!

Pita agatụghị echefu ụbọchị mbụ ọ hụrụ Jizọs onye Nazaret. Nwanne ya nwoke, bụ́ Andru, eburula ụzọ wetara ya ozi ahụ na-atụ n’anya, bụ́: “Anyị ahụwo Mesaya ahụ.” Okwu ndị ahụ mere ka ndụ Pita malite ịgbanwe. Ndụ ya gbanwere kpamkpam.—Jọn 1:41.

Pita bi na Kapaniọm, bụ́ obodo dị n’ikpere mmiri nke ọdọ mmiri a na-aṅụ mmiri ya aṅụ, bụ́ Oké Osimiri Galili. Ya na Andru, Jems na Jọn, bụ́ ụmụ Zebedi, na-agbakọ aka n’ọrụ ịkụ azụ̀. Pita na nwunye ya na nne nwunye ya nakwa nwanne ya nwoke, bụ́ Andru, bi. Iji ọrụ ịkụ azụ̀ akpa afọ ezinụlọ há otú ahụ chọrọ nnọọ ịrụsi ọrụ ike, inwe ume, na ịdị nkọ n’echiche. Anyị nwere ike iji anya nke uche anyị hụ ọtụtụ mgbe ha na-eji abalị dum adọgbu onwe ha n’ọrụ, na-awụba ụgbụ ha n’ọdọ mmiri ahụ n’agbata ụgbọ mmiri abụọ ma na-adọpụta ihe ọ bụla banyere n’ụgbụ ha. Anyị nwekwara ike iji anya nke uche anyị hụ ebe ha na-arụsi ọrụ ike n’ụbọchị, na-ahọsị azụ̀ ndị ha gbutere ma na-ere ha, na-edozi ụgbụ ha ma na-edowe ha ọcha.

Baịbụl gwara anyị na Andru bụ onye na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim. O doro anya na Pita gere nnọọ ntị n’akụkọ nwanne ya nwoke kọọrọ ya banyere ozi Jọn na-ezisa. Otu ụbọchị, Andru hụrụ ka Jọn tụrụ Jizọs onye Nazaret aka ma kwuo, sị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke!” Andru ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs ozugbo ma jiri obi ụtọ kọọrọ Pita akụkọ a na-atọ ụtọ: Mesaya abịala! (Jọn 1:35-40) Mgbe Adam na Iv nupụchara isi n’Iden ihe dị ka puku afọ anọ tupu mgbe ahụ, Jehova Chineke kwere nkwa na onye pụrụ iche ga-abịa iwetara ụmụ mmadụ olileanya e ji n’aka. (Jenesis 3:15) Andru ahụla nnọọ Onye Nnapụta a, bụ́ Mesaya ahụ! Pita mekwara ngwa ngwa ịga hụ Jizọs.

Ihe a na-akpọ Pita ruo ụbọchị ahụ bụ Saịmọn ma ọ bụ Simiọn. Ma Jizọs lere ya anya, sị: “‘Ị bụ Saịmọn nwa Jọn; a ga-akpọ gị Sifas’ (nke bụ́ Pita ma a sụgharịa ya).” (Jọn 1:42) Okwu bụ́ “Sifas” pụtara “nkume,” ma ọ bụ “oké nkume.” O doro anya na ihe Jizọs na-ebu mgbe ahụ bụ amụma. O lepụrụ anya n’ihu hụ na Pita ga-adị ka oké nkume, ya bụ, onye gbasiri ike, kwụrụ chịm, nakwa onye kwesịrị ntụkwasị obi nke ga-abụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst ezi ihe nlereanya. Pita ò lere onwe ya anya otú ahụ? O yiri ka o leghị onwe ya anya otú ahụ. Ọbụna ụfọdụ ndị na-agụ Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn n’oge a ahụghị ihe mere a ga-eji kpọọ Pita oké nkume. Ụfọdụ ndị ekwuola na o yiri onye na-akwụsighị ike, onye na-anaghị emeli mkpebi n’onwe ya, na onye na-enwekarị obi abụọ.

Pita nwere ebe ndị ọ na-anaghị emezi emezi. Jizọs makwaara banyere ha. Ma, Jizọs, dị ka Nna ya, bụ́ Jehova, na-achọ mgbe niile ịhụ ebe ndị mmadụ na-eme nke ọma. Jizọs hụrụ ọtụtụ àgwà ọma Pita nwere, chọọkwa inyere ya aka inwekwu àgwà ọma ndị ọzọ. Taakwa, Jehova na Ọkpara ya na-achọ ịhụ ebe anyị na-eme nke ọma. O nwere ike isiri anyị nnọọ ike ikwere na ha ga-ahụ ọtụtụ ebe anyị na-emezi emezi. Ma, ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị ha obi na ha maara onye bụ́ ezi mmadụ na onye na-abụghị ma gosi na anyị dị njikere ka ha zụọ anyị ma kpụzie anyị dị ka ọ dị Pita.—1 Jọn 3:19, 20.

“Kwụsị Ịtụ Egwu”

Ọ ga-abụ na Pita so Jizọs gaa ebe ụfọdụ ọ gara kwusaa ozi ọma mgbe nke ahụ gasịrị. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ọ nọ mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube mbụ ya, bụ́ ime mmiri ka ọ ghọọ mmanya n’oriri alụmdi na nwunye e nwere na Kena. Nke ka mkpa bụ na ọ nụrụ ozi magburu onwe ya na-enye olileanya Jizọs ziri banyere Alaeze Chineke. N’agbanyeghị nke a, ọ hapụrụ Jizọs ma laghachi n’ọrụ ịkụ azụ̀ ya. Ma, mgbe ọnwa ole na ole gachara, Pita na Jizọs hụrụ ọzọ, na nke ugbu a kwa, Jizọs gwara Pita ka ọ hapụ ọrụ ya ma sowezie ya mgbe niile.

Pita ka rụpụrụ ọrụ abalị mere ya obi ọjọọ. Ya na ndị ọkụ azụ̀ ibe ya wụnyere ụgbụ ha ná mmiri ugboro ugboro, ma ọ dịghị otu azụ̀ ha gbutere. O doro anya na Pita mere ihe niile ọ mụtarala kemgbe ọ kụwara azụ̀ iji gbute azụ̀, na-awụnye ụgbụ ya n’ebe dị iche iche iji chọta ebe azụ̀ nọ na-akpa nri n’ọdọ mmiri ahụ. N’ezie, dị ka ọ na-adị ọtụtụ ndị ọkụ azụ̀, mgbe ụfọdụ, ọ dị Pita ka ya bụrụ na ọ ga-enyonye anya na mmiri ahụ gbara ọchịchị ma hụ ebe ìgwè azụ̀ ndị ahụ nọ ma ọ bụkwanụ ya enwee otú ọ ga-esi mee ka ha banye n’ụgbụ ya. Ma, naanị ihe ụdị echiche ahụ ga-eme bụ ime ka obi jọkwuo ya njọ. Pita abịaghị ebe ahụ igwuri egwu; o nwere ndị ga-esi n’azụ̀ ọ ga-egbute nweta ihe oriri. N’ikpeazụ, ọ gba aka pụta na mmiri ahụ. N’agbanyeghị nke a, ọ ga-asacha ụgbụ ya. N’ihi ya, o ji nnọọ ọrụ n’aka mgbe Jizọs bịakwutere ya.

Ìgwè mmadụ nọ na-adagide Jizọs, na-ege ihe niile ọ na-agwa ha. Ebe ọ bụ na ìgwè mmadụ ahụ enyeghị Jizọs ohere, ọ banyere n’ụgbọ Pita ma gwa ya ka o si n’elu ala kwọpụtụ. Jizọs nọ ebe ahụ kụziere ìgwè mmadụ ahụ ihe n’ihi na mmiri ahụ mere ka ha na-anụ olu ya nke ọma. Pita gere nnọọ ntị, dị ka ndị ahụ nọ n’ikpere mmiri ahụ mere. Ọ dịtụghị mgbe ike gwụrụ ya ige Jizọs ntị mgbe ọ na-ekwu okwu n’isiokwu nke ozi ọma ya, bụ́ Alaeze Chineke. Ọ ga-abụrụ nnọọ Pita ihe ùgwù dị ukwuu inyere Kraịst aka kwusaa ozi olileanya a ná mba ahụ dum! Ma, nke ahụ ọ̀ ga-ekwe omume? Olee ihe ha ga na-eri? Ikekwe, Pita chere echiche ọzọ banyere abalị ahụ ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ n’efu.—Luk 5:1-3.

Mgbe Jizọs kwuchara okwu, ọ gwara Pita, sị: “Kwọrọ ụgbọ a banye n’ebe dị omimi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu wee gbute azụ̀.” Pita nwere obi abụọ. O kwuru, sị: “Onye ozizi, anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ abalị dum n’egbuteghị ihe ọ bụla, ma ebe i kwuru ya, aga m awụnye ụgbụ.” O doro anya na Pita achọghị ịwụnye ụgbụ ndị ahụ ọzọ na mmiri, nke ka nke, ugbu a azụ̀ na-anaghị akpa nri! N’agbanyeghị nke ahụ, o rubere isi, ma eleghị anya, gwa ndị ibe ya nọ n’ụgbọ nke ọzọ ka ha soro ha.—Luk 5:4, 5.

Ụgbụ ahụ nyịwara Pita arọ n’aka ka ọ malitere ịdọlite ya. O juru ya anya, ya adọsikwuo ya ike, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ hụrụ ọtụtụ azụ̀ ka ha na-agba lịka lịka n’ụgbụ ahụ! O feere ndị ibe ya nọ n’ụgbọ nke ọzọ aka ozugbo ka ha bịa nyere ya aka. Mgbe ha bịara, ha chọpụtaziri na azụ̀ niile ahụ agaghị aba n’otu ụgbọ. Ha kpojuru ụgbọ abụọ ahụ ma azụ̀ ndị ahụ karịrị akarị, ụgbọ ndị ahụ malitekwara imi n’ihi ịdị arọ ha. Ihe a enyeghị Pita ọnụ okwu. Ọ hụla ebe Jizọs ji ike ya rụọ ọrụ, ma nke ugbu a metụtara ya! Ọ hụla onye nwedịrị ike ime ka azụ̀ banye n’ụgbụ! Ụjọ jidere Pita. O gbusara ikpere n’ala ma kwuo, sị: “Onyenwe anyị, si n’ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.” Olee otú ọ ga-esi ruo eruo iso Onye ji ike Chineke arụ ụdị ọrụ ahụ?—Luk 5:6-9.

Jizọs ji obiọma gwa ya, sị: “Kwụsị ịtụ egwu. Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.” (Luk 5:10, 11) Nke a abụghị oge inwe obi abụọ ma ọ bụ ịtụ ụjọ. Obi abụọ Pita na-enwe banyere ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị, dị ka ịkụ azụ̀, enweghị isi; ụjọ ọ na-atụ n’ihi adịghị ike na erughị eru ya abaghịkwa uru. Jizọs nwere nnukwu ọrụ ọ ga-arụ, ọrụ ga-emetụta ọdịnihu ụmụ mmadụ. Ọ na-ejere Chineke nke “ga-agbaghara . . . mmehie . . . n’ụzọ dị ukwuu” ozi. (Aịzaya 55:7) Jehova ga-egboro ha mkpa ha, ma nke anụ ahụ́ ma nke ime mmụọ.—Matiu 6:33.

Pita sooro Jizọs ozugbo, otú ahụkwa ka Jems na Jọn mere. “Ha kwọọrọ ụgbọ ndị ahụ gaghachi n’elu ala. Ha gbahapụkwara ihe niile ma soro ya.” (Luk 5:11) Pita nwere okwukwe na Jizọs na n’Onye zitere ya. Ọ bụ mkpebi kacha mma o nwere ike ime. Ndị Kraịst taa, bụ́ ndị kwụsịrị ịtụ ụjọ na inwe obi abụọ iji jewere Chineke ozi nwekwara okwukwe. Ọ dịghị mgbe ịtụkwasị Jehova obi otú ahụ ga-aghọ mmadụ ahịa.—Abụ Ọma 22:4, 5.

“Gịnị Mere I Ji Nwewe Obi Abụọ?”

Ihe dị ka afọ abụọ Pita matachara Jizọs, Pita kwọrọ ụgbọ n’abalị ahụ oké ifufe na-efesi ike n’Oké Osimiri Galili, bụ́ nke a kọrọ ná mmalite. N’ezie, anyị enweghị ike ịma ihe ndị o chere n’echiche n’abalị ahụ. O nwere ọtụtụ ihe o nwere ike iche! Jizọs agwọọla nne nwunye Pita. O ziela Ozizi Elu Ugwu ahụ. Ugboro ugboro, Jizọs ejirila ozizi ya na ọrụ ndị dị ike ọ na-arụ gosi na ya bụ Onye Jehova Họpụtara, ya bụ, Mesaya ahụ. Ka ọtụtụ ọnwa gachara, o doro anya na adịghị ike Pita, dị ka ịtụ ụjọ na inwe obi abụọ kwusịlatatụrụ. Jizọs ahọrọdịla Pita ịbụ otu n’ime ndịozi iri na abụọ ya! N’agbanyeghị nke ahụ, Pita ga-amata n’oge na-adịghị anya na ya emerichabeghị ụjọ na obi abụọ.

N’oge nche nke anọ n’abalị ahụ, ma ọ bụ n’ihe dị ka n’agbata elekere atọ nke isi ụtụtụ na mgbe anwụ malitere ịwa, Pita kwụsịrị ịkwọ ụgbọ na mberede ma nọrọ kwem n’ebe ọ nọ ọdụ. Ọ hụrụ na e nwere ihe na-agafenụ n’osimiri ahụ ebili mmiri na-enugharị! Ọ̀ ga-abụ mmiri ebili mmiri nke ìhè ọnwa mụkwasịrị? Mbanụ, ọ kwụ nnọọ ọtọ, ma guzo kwem. Ọ bụ mmadụ! Ee, ọ bụ mmadụ, ọ na-ejekwa ije n’elu oké osimiri! Ka onye ahụ na-erute nso, o yiri nnọọ ka ọ̀ na-abịa ịgafe ha. Ndị na-eso Jizọs tụrụ ụjọ ma chee na ọ bụ onyinyo ụgha. Onye ahụ kwuru okwu, sị: “Nweenụ obi ike, ọ bụ m; unu atụla egwu.” Ọ bụ Jizọs!—Matiu 14:25-28.

Pita kwuru, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri.” Ihe mbụ gbatara ya n’uche ime bụ ihe na-egosi na o nwere obi ike. Ebe ọ bụ na ọrụ ebube a pụrụ iche masịrị nnọọ Pita, ọ chọrọ otú ọ ga-esi mee ka okwukwe ya sikwuo ike. Ọ chọrọ iso Jizọs jee ije n’elu mmiri. Jizọs sịrị ya bịa. Pita si n’akụkụ ụgbọ ahụ rịdata ma zọnye ụkwụ n’oké osimiri ahụ ebili mmiri na-enugharị. Chegodị otú obi dị Pita mgbe ụkwụ ya na-emighị na mmiri, ya eguzoro ọtọ n’elu mmiri ma gawa ije. Ọ ga-abụrịrị na o juru ya anya ka ọ na-agakwuru Jizọs. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ihe ọzọ batara ya n’obi.—Matiu 14:29.

Ọ dị mkpa ka Pita legide Jizọs anya. Ọ bụ Jizọs ji ike Jehova mee ka Pita nọgide na-eje ije n’elu mmiri. Ihe mekwaranụ Jizọs ji eme ya bụ okwukwe Pita nwere n’ebe ọ nọ. Ma uche Pita pụrụ n’ebe Jizọs nọ. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya.” Pita lere anya n’ebili mmiri ahụ na-akụ n’ụgbọ ahụ, na-agbali mmiri na ụfụfụ elu, ụjọ wee tụọ ya. O yiri ka o ji anya nke uche ya hụ onwe ya ebe ọ na-emikpu na mmiri ahụ, mmiri erie ya. Ka ụjọ malitere ịtụ ya, okwukwe ya dawara mbà. Nwoke a a kpọrọ Oké Nkume n’ihi na o nwere àgwà ndị nwere ike ime ka ọ kwụsie ike, malitere imikpu na mmiri dị ka obere okwute n’ihi na okwukwe ya esizighị ike. Pita bụ aka ochie n’igwu mmiri, ma na nke ugbu a, ọ sịghị ka ya gwupụtawa. O tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta m!” Jizọs jidere aka ya ma dọpụta ya. Mgbe Jizọs na Pita ka nọ n’elu mmiri ahụ, ọ kụziiri Pita ihe a dị mkpa: “Gị onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”—Matiu 14:30, 31.

“Gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”—nke ahụ bụ nnọọ ajụjụ dabara adaba! Obi abụọ nwere nnọọ ike imebiri mmadụ ihe. Ọ bụrụ na anyị enwee ya, o nwere ike ime ka okwukwe anyị gharazie isi ike ma mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ nyụwa ka ọkụ. Ọ dị mkpa ka anyị gbasie mgba ike megide ụdị echiche ahụ! Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ site n’ilekwasị anya n’ebe kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eche banyere ihe na-emenye anyị ụjọ, ihe na-akụda anyị mmụọ na ihe na-adọpụ uche anyị n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ, anyị ga-enwekwu obi abụọ. Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere Jehova na Ọkpara ya, ihe ha meerela anyị, ihe ha na-emere anyị, na ihe ha ga-emere ndị hụrụ ha n’anya, obi abụọ anyị na-enwe ga-ebelata.

Ka Pita so Jizọs banyeghachi n’ụgbọ ahụ, ọ hụrụ ka oké ifufe ahụ kwụsịrị. Oké Osimiri Galili dara jụụ. Pita so ndị na-eso ụzọ ibe ya kwuo, sị, “Ị bụ Ọkpara Chineke n’ezie.” (Matiu 14:33) Ka chi bọrọ n’ọdọ mmiri ahụ, o doro anya na obi tọrọ Pita ụtọ. Ọ kwụsịrị inwe obi abụọ na ịtụ ụjọ. N’ezie, ọ ka nwere ọtụtụ mgbanwe ndị ọ ga-eme ná ndụ ya tupu ya aghọọ Onye Kraịst yiri oké nkume Jizọs lepụrụ anya n’ihu hụ. Ma o kpebisiri ike ịnọgide na-agbalị, ịnọgide na-eme mgbanwe. Ì meela mkpebi siri ike otú ahụ? N’ezie, ị ga-achọpụta na okwukwe Pita kwesịrị nṅomi.

[Foto dị na peeji nke 22, 23]

Jizọs hụrụ na onye ọkụ azụ̀ a dị umeala n’obi nwere ọtụtụ àgwà ọma

[Foto dị na peeji nke 23]

“Onyenwe anyi, . . . abụ m onye mmehie”

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

“Mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya”