Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere E Ji Enwekarịzi Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha?

Gịnị Mere E Ji Enwekarịzi Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha?

Gịnị Mere E Ji Enwekarịzi Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha?

ỌDACHI ndị na-emere onwe ha yiziri ka ọ̀ bụ okwu akpụ n’ọnụ na tiivi nakwa na redio. Ndị na-anwụ na ndị na-emerụ ahụ́ n’ọdachi ndị a na-akarịzi akarị. Otu ụlọ ọrụ dị na Beljọm nke na-eme nnyocha banyere ọdachi ndị na-emere onwe ha kwuru na narị ọdachi atọ na iri asaa na atọ mere naanị n’afọ 2010, kwuokwa na ọ dịkarịa ala, narị puku mmadụ abụọ, puku iri itoolu na puku isii nwụrụ n’ọdachi ndị ahụ.

Ọdachi ndị a na-anụ na ha na-eme na-akarịkwu akarị kemgbe iri afọ ole na ole gara aga. Dị ka ihe atụ, n’agbata afọ 1975 na afọ 1999, ọdachi ndị a nụrụ na ha mere n’afọ nke ọ bụla erughị narị atọ. Ma, n’agbata afọ 2000 na afọ 2010, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị ọdachi anọ mere n’afọ nke ọ bụla. O nwere ike ịbụ na i so ná ndị na-ajụ, sị, ‘Gịnị mere ọdachi ndị na-emere onwe ha ji emekarịzi n’oge a?’

N’agbanyeghị na ndị mmadụ na-ekwukarị na ọ bụ Chineke na-akpata ọdachi ndị a, ọ bụghị eziokwu. Chineke anaghị akpata ọdachi ndị na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ taa. Ma, Baịbụl kwuru na a ga na-enwe ọdachi n’oge anyị a. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru na Matiu 24:7, 8, sị: “A ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche. Ihe ndị a niile bụ mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.” Gịnị mere Jizọs ji kwuo na ihe ndị a ga-eme, gịnịkwa ka ha na-egosi anyị?

Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs kwuru ihe ahụ mgbe ọ na-aza ajụjụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya. Ha jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọgwụgwụ usoro ihe a?’ (Matiu 24:3) O kwuru ihe dị iche iche ga-emenụ, ọdachi ndị ahụ anyị kwuru okwu ha sokwa na ha. O kwuziri, sị: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:31) N’ihi ya, o nwere ihe dị mkpa ọdachi ndị a na-emere onwe ha na-egosi anyị. Ha na-egosi anyị na oge a ga-enwe ezigbo mgbanwe n’ụwa adịla nso.

Ihe Ndị So Akpata Ọdachi

Ma ọtụtụ ndị ka na-ajụ, sị, Ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke na-akpata ọdachi ndị a na-emenụ, ònye na-akpata ha ma ọ bụkwanụ gịnị na-akpata ha? Ihe ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya bụ ịmata otu ihe dị mkpa Baịbụl kwuru. Ọ sịrị na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Amaokwu a na-egosi na ọ bụghị Chineke na-akpata nsogbu ndị dị n’ụwa, kama onye na-akpatakarị ha bụ “ajọ onye ahụ,” bụ́ onye iro Chineke, onye Baịbụl kpọkwara “Ekwensu.”—Mkpughe 12:9, 12.

Onye iro Chineke a, bụ́ onye na-achọ naanị ọdịmma onwe ya, enweghị ihe o ji ụmụ mmadụ kpọrọ. Ebe ọ bụ ya na-achị ụwa niile, o meela ka ndị mmadụ chọwakwa naanị ọdịmma onwe ha. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na “n’oge ikpeazụ,” ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako.” (2 Timoti 3:1, 2) N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na Ekwensu emeela ka ọtụtụ ndị na-eme omume ndị ahụ nakwa omume ọjọọ ndị ọzọ. Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-achọ naanị ọdịmma onwe ha ma na-erigbu ndị ọzọ, bụ́kwanụ nke na-akpatakarịrị ndị mmadụ nsogbu.

Olee otú anyaukwu a juru n’ụwa si eme ka a na-enwe ọdachi? Otu ozi si n’aka Òtù Mba Ụwa, nke kwuru banyere ọdachi ndị na-eme n’ụwa niile, kwuru, sị: ‘Ihe isi ike na-eme ka ndị mmadụ na-ebiju n’ebe ndị a na-enwekarị ọdachi, dị ka n’ebe a na-enwe idei mmiri. Ihe ọzọ bụ na otú e si egbutusi osisi ndị dị n’ọhịa ma na-ekpochi ebe mmiri na-adọ na-eme ka a gharazie inwe ihe ndị ga-egbochi ọdachi. Nke ka nke bụ na anwụrụ ọkụ na ikuku ọjọọ ndị na-esi n’ụlọ ọrụ dị iche iche na ihe ndị ọzọ apụta na-emezi ka ụwa na-ekpokwu ọkụ, oké osimiri ana-etokwa karịa otú ha na-eto ná mbụ.’ Ọ bụ eziokwu na a sịrị na ụlọ ọrụ ndị ahụ na-enye obodo ego, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha na ndị anyaukwu, bụ́ ndị juru n’ụwa, ji ha na-aba ọgaranya.

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta achọpụtala ugbu a na otú ahụ ndị mmadụ si na-emebisị ụwa emeela ka ọdachi ndị na-emenụ na-akpakwu ụmụ mmadụ aka ọjọọ. N’eziokwu, ụmụ mmadụ ekwerela ka Ekwensu jiri ha na-eme ka ọdachi ndị na-emere onwe ha na-aka njọ.

O doola anya na ọ bụ ndị mmadụ ji aka ha akpata ọtụtụ ọdachi ndị na-emenụ. Ọdachi ụfọdụ agaraghị akparu ndị mmadụ aka ọjọọ otú ha kpara ma a sị na ndị mmadụ ebijughị n’ebe ọdachi ndị ahụ mere. N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ọdachi ndị na-emere onwe ha na-aka njọ n’ihi anyaukwu ụfọdụ ndị ma ọ bụkwanụ n’ihi otú ihe isi ike si eme ka ndị mmadụ ga na-ebiju n’ebe ndị ọdachi na-emekarị. Ma, e nwekwara ndị na-ata ahụhụ n’ihi ọdachi ndị ọ na-abụghị mmadụ kpatara, kama n’ihi na ‘oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya bịakwasịrị ha.’—Ekliziastis 9:11.

Ọ bụrụ na ọdachi emee n’ebe i bi, ma ọ̀ bụ mmadụ kpatara ya, ma ò meere onwe ya, gịnị ka ị ga-eme? Ka anyị leba anya ugbu a n’ihe mmadụ nwere ike ime ka ihe dịtụrụ ya mfe ma e nwee ọdachi.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ndị mmadụ ibiju otu ebe

[Foto dị na peeji nke 5]

Igbutusi osisi

[Foto dị na peeji nke 5]

Imebi ikuku

[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 5]

Nke dị n’aka ekpe: © Mark Henley/Panos Pictures

Nke dị n’etiti: © Jeroen Oerlemans/Panos Pictures