Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe A Na-agaghị Enwekwa Ọdachi

Mgbe A Na-agaghị Enwekwa Ọdachi

Mgbe A Na-agaghị Enwekwa Ọdachi

Ọ BỤRỤ na mmadụ agwa gị, sị: “N’oge na-adịghị anya, a gaghị enwekwa ọdachi ndị na-emere onwe ha,” gịnị ka ị ga-ekwu? Ị̀ ga-asị ya, “Ị na-arọ nrọ? Ọdachi agaghị akwụsị akwụsị n’ụwa a.” Ka ihe ị ga-ekwu n’obi gị ọ̀ bụ, ‘Ònyekwanụ ka o chere na ọ na-aghọgbu?’

Ọ bụ eziokwu na o yiri ka ọdachi ndị na-emere onwe ha agaghị akwụsị akwụsị, e nwere ihe ndị ga-eme ka obi sie anyị ike na ha ga-akwụsị otu ụbọchị. Ma, ọ bụghị ụmụ mmadụ ga-eme ka ha kwụsị. Ụmụ mmadụ amachaghịdị ihe mere ihe ụfọdụ na-eme n’ụwa ji eme nakwa otú ha si eme, ma ya fọdụzie ịkwụsị ha. Sọlọmọn, eze Izrel oge ochie, bụ́ nwoke maara ihe, nke na-echebakwara ihe echiche, dere, sị: ‘Ụmụ mmadụ enweghị ike ịchọpụta ọrụ a rụworo n’okpuru anyanwụ; n’agbanyeghị otú ha na-agbalịsi ike ịchọ ya, ha adịghị achọpụta ya. Ọ bụrụgodị na ha asị na amamihe ha zuuru ha ịmata ya, ha agaghị enwe ike ịchọpụta ya.’—Ekliziastis 8:17.

Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ agaghị akwụsịli ọdachi ndị na-emere onwe ha, ònye ga-akwụsịli ha? Baịbụl kwuru na ọ bụ Onye kere anyị. Ọ bụ ya kere ihe niile dị n’ụwa, dị ka ugwu, oké osimiri, ifufe, na mmiri ozuzo. (Ekliziastis 1:7) Ike Chineke anaghị agwụ agwụ, ọ karịrị nnọọ nke ụmụ mmadụ. Ihe Jeremaya onye amụma kwuru gosiri na nke a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee, ọ bụ gị ji ike ukwu gị na ogwe aka ị gbatịrị agbatị kee eluigwe na ụwa. Ihe a dum anyịghị gị.” (Jeremaya 32:17) Ebe ọ bụ Chineke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, ọ maara otú ọ ga-esi hazie ihe niile ka ụmụ mmadụ ghara inwe nsogbu n’ụwa.—Abụ Ọma 37:11; 115:16.

Oleezi otú Chineke ga-esi mee ka a gharazie inwe ọdachi n’ụwa? Cheta na n’isiokwu nke abụọ na magazin a, e kwuru na ọtụtụ n’ime ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa taa bụ “ihe ịrịba ama” nke na-egosi na anyị bi n’oge “ọgwụgwụ usoro ihe a.” Jizọs sịrị: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Matiu 24:3; Luk 21:31) Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị Chineke nke ga-esi n’eluigwe na-achị, ga-agbanwe ọtụtụ ihe n’ụwa a, meedị ka ihe ndị dị ka ifufe, oké osimiri, na mmiri ozuzo gharazie ịna-emebi ihe. Ọ bụ eziokwu na Jehova Chineke ga-emeli ihe ndị a n’onwe ya, o nyere Ọkpara ya ikike ka o mee ha. Daniel onye amụma kwuru banyere Jizọs, bụ́ onye Chineke nyere ikike ime ihe ndị a, sị: “E wee nye ya ọchịchị na ùgwù na alaeze, ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi.”—Daniel 7:14.

E nyela Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, ikike idozi ihe ndị na-adịghị mma n’ụwa, ka ụwa wee ghọọ ebe dị mma obibi. Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na ya ga-emeli ka ihe ndị e kere eke ghara ịkpatara ndị mmadụ ọdachi. Otu ụbọchị, mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụgbọ n’osimiri Galili, “oké ifufe malitere ife, ebili mmiri nọkwa na-etikwasị ụgbọ ahụ ma na-abanye n’ime ya, nke mere na ọ fọrọ nke nta ka mmiri ju n’ụgbọ ahụ.” Ụjọ jidere ndị na-eso ụzọ ya. Ha chere na nke ha agwụla, ha akpọwazie Jizọs. Gịnị ka Jizọs mere? Ọ “baara ifufe ahụ mba, sịkwa oké osimiri ahụ: ‘Shịị! Daa jụụ!’ Ifufe ahụ wee kwụsị, ebe niile wee daa jụụ.” Nke a juru ndị na-eso ụzọ ya anya, ha wee sị: “Ònye n’ezie ka onye a bụ, n’ihi na ọbụna ifufe na oké osimiri na-erubere ya isi?”—Mak 4:37-41.

Jizọs mechara laghachi n’eluigwe, e nyekwala ya ikike karịrị nke o nweburu. Ebe ọ bụ Eze nke Alaeze Chineke, ọ bụ ya ga-eme ka nsogbu niile dị n’ụwa kwụsị, ka obi wee ruo ndị mmadụ ala. O dokwara anya na ọ ga-emeli ya.

Dị ka anyị hụrụla, ọ bụ ụmụ mmadụ na-akpata ọtụtụ ọdachi ndị na-emenụ ma ọ bụkwanu na-eme ka ha na-aka njọ n’ihi anyaukwu ha na ịchọ naanị ọdịmma onwe ha. Ma, gịnị ka Alaeze Chineke ga-eme ndị na-ekweghị akwụsị àgwà ọjọọ ndị a? Baịbụl kwuru na Onyenwe anyị Jizọs ga-esi “n’eluigwe [bịa], ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike, n’ọkụ na-enwu enwu, mgbe ọ na-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị na-amaghị Chineke, na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” N’eziokwu, Jizọs ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—2 Ndị Tesalonaịka 1:7, 8; Mkpughe 11:18.

Jizọs Kraịst, bụ́ “Eze nke ndị eze,” ga-emechazi mee ka ihe ndị e kere eke gharazie ịna-emebi ihe. (Mkpughe 19:16) Ọ ga-eme ka ọdachi ọ bụla ghara ịdakwasị ndị Alaeze ahụ ga-achị. Ọ ga-eji ike ya mee ka mmiri ozuzo, oké osimiri, ifufe na ihe ndị ọzọ rụwa ọrụ otú ha kwesịrị ịrụ, ka nsogbu ndị ha na-akpatara ụmụ mmadụ gharazie ịdị. Ọ bụ mgbe ahụ ka ihe Jehova Chineke gwara ndị ya n’oge ochie ga-emezu. Ọ sịrị ha: “M ga-enye unu mmiri ozuzo n’oge kwesịrị ekwesị, ala unu ga-emepụtakwa ihe, osisi ndị dị n’ubi ga-amịkwa mkpụrụ.” (Levitikọs 26:4) Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ewu ụlọ, ha agaghịkwa atụwa ụjọ na oké ifufe ma ọ bụ ọdachi ndị ọzọ ga-emebi ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.”—Aịzaya 65:21.

Gịnị Ka I Kwesịrị Ime?

O doro anya na i so n’ọtụtụ ndị ọ na-agụ agụụ ibi n’ụwa mgbe a na-agaghị enwekwa ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ma, gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ibi n’ụwa mgbe ahụ? Ebe ọ bụ na “ndị na-amaghị Chineke” na “ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma” agaghị ebi n’ụwa mgbe a na-agaghị enwekwa ọdachi, o doro anya na ihe mmadụ kwesịrị ime ugbu a bụ ịmụta banyere Chineke ma na-eme ihe ọ na-achọ. Chineke chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ ma na-erube isi n’ozi ọma Alaeze ahụ, nke Ọkpara ya bụ onyeisi ya.

Otú kacha mma ị ga-esi amụta ya bụ ịmụ Baịbụl nke ọma. Baịbụl kwuru ihe ndị ị ga-eme ka i soro ná ndị ga-ebi n’ụwa mgbe Alaeze ahụ ga-eme ka nsogbu gharazie ịdị. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha nyere gị aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi? Obi ga-adị ha ụtọ inyere gị aka. Otu ihe ị ga-eburu n’uche bụ na ọ bụrụ na ị gbaa mbọ mata onye Chineke bụ ma na-erube isi n’ozi ọma Alaeze Chineke, ihe e dere n’Ilu 1:33 ga-emezu n’isi gị. Ebe ahụ sịrị: “Ma onye na-ege m ntị ga-ebi n’obi iru ala, ụjọ ọdachi agaghịkwa enye ya nsogbu.”