Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE ONYEÀMÀ JEHOVA NA ONYE AGBATA OBI YA KPARỊTARA

Ahụhụ Anyị Na-ata Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Obi?

Ahụhụ Anyị Na-ata Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Obi?

N’okpuru ebe a, e dere ihe Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike ịkparịta. Ka anyị were ya na Onyeàmà Jehova aha ya bụ Mary gara n’ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Sarah.

GỊNỊ MERE O JI KWE KA IHE A MEE?

Mary: Aha m bụ Mary. Obi dị m ụtọ ịhụ gị.

Sarah: Aha mụnwa bụ Sarah. Nnọọ.

Mary: M na-eke ndị niile m hụrụ taa traktị a isiokwu ya bụ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Lee nke gị.

Sarah: Traktị a ọ̀ na-ekwu banyere Chineke?

Mary: Ee. Ị ga-ahụ na e nwere ajụjụ isii e dere n’ihu ya. Olee ajụjụ nke—

Sarah: Biko, cheregodị. Ihe a ị chọrọ ịgwa m bụ igbu oge.

Mary: Gịnị mere i ji kwuo otú ahụ?

Sarah: Ịgwa gị eziokwu, ekwechaghị m na Chineke dị.

Mary: Obi dị m ụtọ na ị gwara m eziokwu. Ma, ka m jụgodị gị, Ị̀ na-ekwu na kemgbe a mụrụ gị na i kwechaghị na Chineke dị?

Sarah: Ọ bụghị ihe m na-ekwu. M na-agabu chọọchị. Ma, o teela m kwụsịrị ịga.

Mary: Sarah, abịaghị m ebe a ka m mee ka i kweta ihe mụnwa kweere. Ma, m ga-achọ ịghọtakwu ihe ị na-ekwu. Ò nwere ihe mere iji chewezie na Chineke adịghị?

Sarah: Ee, o nwere.

Mary: Ọ̀ bụ gịnị?

Sarah: Mama m nwere ihe mberede ụgbọala afọ iri na asaa gara aga.

Mary: Eziokwu? Ndo oo! Ò merụrụ ahụ́?

Sarah: Ee, ọ naghị agalikwa ije kemgbe ahụ.

Mary: Ihe a ị kọọrọ m ewutela m. Ama m na obi gbawara gị mgbe ihe a mere.

Sarah: À na-ajụkwa ajụ? Ajụjụ m nọ na-ajụ n’obi m bụ na ọ bụrụ na Chineke dị adị, gịnị mere o ji kwe ka ihe a mee? Gịnị mere Chineke ji kwe ka anyị na-ata ụdị ahụhụ a?

MMADỤ ỊJỤ CHINEKE IHE MERE IHE ỌJỌỌ JI NA-EME Ọ̀ DỊ NJỌ?

Mary: Otú ahụ obi dị gị bụ otú ọ na-adị onye ọ bụla ụdị ihe ahụ mere. Ajụjụ ndị ahụ ị jụrụ n’obi gị adịghịkwa njọ. Onye na-ata ahụhụ ga na-ajụ ihe mere ya ji ata ahụhụ. Na Baịbụl, e nwedịrị ndị fere Chineke, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, jụrụ ụdị ajụjụ ndị ahụ.

Sarah: Eziokwu?

Mary: Ee. Biko, ka m gosinụ gị otu onye n’ime ha na Baịbụl.

Sarah: Ngwanụ.

Mary: Legodị ihe onye amụma Chineke bụ́ Habakọk jụrụ Chineke n’akwụkwọ Habakọk 1:2, 3. Ebe ahụ sịrị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-eti mkpu enyemaka, ma ị dịghị anụ ya? Ruo ole mgbe ka m ga na-akpọku gị ka i nyere m aka napụta m n’ihe ike, ma ị dịghị azọpụta m? Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ihe ọjọọ?” Ajụjụ ndị a hà yiri ndị nke ahụ ị na-ajụ?

Sarah: Ee, ha yiri.

Mary: Chineke abaraghị Habakọk mba maka na ọ jụrụ ya ajụjụ ndị a ma ọ bụkwanụ gwa Habakọk na okwukwe ya esikwaghị ike.

Sarah: Ihe a i kwuru atọgbuola m.

AHỤHỤ NDỊ MMADỤ NA-ATA NA-EWUTE JEHOVA

Mary: Baịbụl kwuru na Chineke na-ahụ ahụhụ niile anyị na-ata, nakwa na ọ na-ewute ya.

Sarah: Gịnị ka ị na-ekwu?

Mary: Ka m gosigodị gị ihe mere m ji kwuo otú ahụ. Legodị ihe e kwuru n’Ọpụpụ 3:7. Biko, gụọ ya.

Sarah: Ọ dị mma. Ọ sịrị: “Jehova kwukwara, sị: ‘N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m bụ́ ndị nọ n’Ijipt, anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti n’ihi ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ; n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.’”

 Mary: I meela. Ị̀ hụrụ na ebe a ị gụrụ gosiri na Chineke na-ahụ ahụhụ ndị na-efe ya na-ata?

Sarah: Ee, ọọ ihe o kwuru.

Mary: Ma, ebe a ekwughị na ọ na-ahụtụ ahụhụ anyị na-ata. Legodị ihe e kwuru ná ngwụcha amaokwu ahụ. Chineke sịrị: “M maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.” Ihe a Chineke kwuru ọ̀ na-egosi na Chineke achọghị ịma gbasara anyị na ahụhụ anyị na-ata?

Sarah: Mba.

Mary: Ma, otu ihe dị mkpa bụ na ọ bụghị naanị na Chineke na-ahụ ahụhụ anyị na-ata, kama ọ na-ewutekwa ya.

Sarah: Èee?

Mary: Ka anyị gụọ otu ebe ọzọ na Baịbụl ka ị hụ ihe mere m ji kwuo otú ahụ. Ebe anyị ga-agụ bụ Aịzaya 63:9. Ebe ahụ kwuru otú obi dị Chineke mgbe ndị ya na-ata ahụhụ. Mmalite ya sịrị: “N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.” Ọ̀ bụ na ebe a egosighị na ahụhụ ndị na-efe Chineke na-ata na-emetụ Chineke n’obi?

Sarah: Ọọ ihe ọ na-egosi.

Mary: Sarah, ihe i kwuru dị mma. Chineke hụrụ anyị n’anya, ahụhụ anyị na-ata na-ewutekwa ya. Mgbe ihe na-enye anyị nsogbu n’obi, ọ na-enyekwa yanwa nsogbu n’obi.

GỊNỊ MERE O JI GBA NKỊTỊ KEMGBE?

Mary: Tupu mụ alawa, o nwere ihe ọzọ m chọrọ ịgwa gị.

Sarah: Ngwanụ, kwuwe.

Mary: Legodị ihe Baịbụl kwuru banyere ike Chineke nwere. Ihe m na-ekwu dị na Jeremaya 10:12. Biko, gụọ ya.

Sarah: Nsogbu adịghị. Ọ sịrị: “Ọ bụ ya bụ Onye ji ike ya kee ụwa, Onye jikwa amamihe ya mee ka elu ala guzosie ike, Onye jikwa nghọta ya setịa eluigwe.”

Mary: I meela. Ka anyị chebagodịrị amaokwu a echiche. Ọ bụ maka na Chineke nwere ike dị ukwuu mere o ji nwee ike ike eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime ha, ọ́ bụghị ya?

Sarah: Ọọ ya.

Mary: Ọ bụrụ na Chineke nwere ike o ji kee ihe ndị anyị na-ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụ anya na o nwekwara ike ọ ga-eji kwụsị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata?

Sarah: Anyị kwesịrị.

Mary: Chegodị echiche banyere mama gị ahụ ị kọọrọ m akụkọ ya. Gịnị mere o ji na-ewute gị na ọ na-ata ahụhụ?

Sarah: Ọ bụ maka na m hụrụ ya n’anya. Ọọ mama m.

Mary: Ọ bụrụ na ị ga-akwụsịli ahụhụ ahụ ọ na-ata, ị́ gaghị akwụsị ya?

Sarah: M ga-akwụsị ya.

Mary: Ị̀ ghọtara ihe ihe a i kwuru pụtara? Baịbụl kwuru na Chineke na-ahụ ahụhụ anyị na-ata, na ọ na-emetụ ya n’obi, nakwa na o nwere ikike dị ukwuu. Ebe ọ dị otú ahụ, í cheghị na e nwere ezigbo ihe mere Chineke ji gba nkịtị ma hapụ anyị ka anyị na-ata ahụhụ?

Sarah: Ihe a i kwuru bụ eziokwu, ma echebatụbereghị m ya echiche.

Mary: Nke a na-egosi na e nwere ezigbo ihe mere Chineke na-akwụsịbeghị ahụhụ anyị na-ata. *

Sarah: I kwuru eziokwu.

Mary: Ọ dị ka fon gị ọ̀ na-akụ. Gaa zaa ya. M ga-abịa ụbọchị ọzọ ka anyị kwurịtakwuo gbasara ya.

Sarah: I meela. M ga-achọ ka ị bịaghachi. *

Ò nwere ihe Baịbụl kwuru na-edoghị gị anya? Ka ò nwere ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi ma ọ bụ na-eme nke ị na-aghọtaghị? Ọ bụrụ na ọ dị, jụọ ya Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ. Obi ga-atọ Onyeàmà Jehova ahụ ụtọ ka gị na ya kwụrịta ya.

^ para. 61 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 64 Mgbe ọ bụla ọzọ anyị ga-ebipụta isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere Chineke ji kwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ.