Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Nwere Okpukpe nke Bụ́ Ezigbo Okpukpe?

È Nwere Okpukpe nke Bụ́ Ezigbo Okpukpe?

Ọ bụrụ na e nweela okpukpe ma ọ bụ chọọchị mere ihe na-adịghị gị mma, o nwere ike isiri gị ike ikweta na e nwere okpukpe nke bụ́ ezigbo ya. Ma, ka obi sie gị ike na e nwere okpukpe nke bụ́ ezigbo ya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nwere ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ kụziiri ha ka ha na-eme ihe Chineke kwuru. A ka nwere ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst, ya bụ, ndị na-agba mbọ ka ha na-ebi ndụ otú Ndị Kraịst kwesịrị ibi. Ma, olee ndị ha bụ?

Estelle, bụ́ onye e kwuburu okwu ya, sịrị: “M mechara mụwa Baịbụl mgbe Ndịàmà Jehova bịara na-akụziri m ya. Obere oge mụ na ha malitere ịmụ Baịbụl, aghọtara m ihe e dere na Jọn 8:32. Ebe ahụ sịrị: ‘Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.’”

Ray, bụ́ onye ọzọ e kwuburu okwu ya, sịrị: “Mgbe mụ na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl, amụtara m na ọ bụghị Chineke kpatara ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. Obi tọrọ m ụtọ ịmara na n’agbanyeghị na e nwere ezigbo ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ na-eme, o kwere nkwa na ya ga-akwụsị ya n’oge na-adịghị anya.”

O doro anya na ọ naghị adịrị mmadụ mfe ime ihe ọma mgbe ọtụtụ ndị na-anaghị eme otú ahụ. Ma, onye chọrọ ime ihe ziri ezi ga-emeli ya. E nwere ọtụtụ ndị chọrọ ka e nyere ha aka ka ha mụta ihe Baịbụl na-akụzi na ịna-eme ya eme. Ọ bụ ya mere Ndịàmà Jehova ji akụziri ọtụtụ nde mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego ọ bụla. N’izu ọ bụla, ọtụtụ ndị na-amụta ihe Baịbụl na-akụzi. Nke a emeela ka ha na Chineke malite ịdị ná mma ma na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ. *

Ọ́ gaghị adị mma ka ị jụọ Ndịàmà Jehova ihe mere ha ji kwere na okpukpe ha bụ nke ezigbo ya?

Mgbe ọzọ ị hụrụ Ndịàmà Jehova ọ́ gaghị adị mma ka ị jụọ ha ihe mere ha ji kwere na okpukpe ha bụ nke ezigbo ya? Chọpụta ihe ha na-akụzi na ihe ndị mmadụ ji mara ha, gị ekpebizie ma è nwere okpukpe nke bụ́ ezigbo ya.

^ para. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu otú ị ga-esi nwekwuo obi ụtọ, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.