Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỤLỌ NCHE Nke 3 n'Afọ 2017 | Otú Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Si Gbasa Gị

OLEE IHE I CHERE?

Akụkọ gbasara ndị na-agba ịnyịnya anọ ndị ahụ na otú ha si na-agba so n’otu n’ime akụkọ ndị magburu onwe ya a kọrọ n’akwụkwọ Mkpughe. Ọ na-atụ ụfọdụ ndị ụjọ, na-atọkwanụ ndị ọzọ ụtọ. Gụọ ihe Baịbụl kwuru banyere amụma ndị ahụ. Ọ sịrị:

Obi ụtọ na-adịrị onye na-agụpụta na ndị na-anụ okwu amụma nke a.”Mkpughe 1:3.

Ụlọ Nche a kwuru na otú ndị ịnyịnya anọ ahụ si na-agba nwere ike ịbara gị uru, meekwa gị obi ụtọ.

 

ISIOKWU TETA! A

Otú Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Si Gbasa Gị

Baịbụl kwuru banyere ịnyịnya anọ, nke ọcha, nke uhie uhie, nke ojii, na nke chanwụrụ achanwụ. Akụkọ ha so n’akụkọ ndị magburu onwe ya dị ná Mkpughe.

ISIOKWU TETA! A

Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?

Gụọ isiokwu a ka ị chọpụta ihe ọhụụ a pụtara.

Ihe Ọzọ Gosiri na Ihe Ndị A Kọrọ na Baịbụl Bụ Eziokwu

O nwere ike ịbụ na ị maghị onye Tatenaị bụ. Ma, aha ya a hụrụ n’ihe ndị e gwupụtara n’ala gosiri na ihe ndị a kọrọ na Baịbụl bụ eziokwu.

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

E Nweghị Ihe Na-atọ M Ụtọ Ka Ịkụ Bezbọl.

E nweghị ihe na-echubu Samuel Hamilton ụra ka ịkụ bezbọl. Ma, Baịbụl ọ mụwara gbanwere ndụ ya.

ṄOMIE OKWUKWE HA

“Ị Bụ Nwaanyị Mara Mma”

Mgbe ha ruru Ijipt, ụfọdụ ndị Fero mere ndị isi hụrụ na Sera mara mma dị egwu. Ihe ha meziri nwere ike iju gị anya.

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Chineke ọ̀ bụrụ mba ụfọdụ ọnụ, gọziekwanụ ụfọdụ?

Ihe Ndị Ọzọ Anyị Nwere

Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?

Akwụkwọ Mkpughe kwuru na obi ụtọ ga-adịrị onye ọ bụla na-agụ ihe ndị e dere na ya, na-aghọta ha ma na-eme ha eme.