Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

È nwere mgbe a ga-enwe ikpe ziri ezi n’ụwa?

Gịnị ka ị ga-aza?

  • Ee

  • Mba

  • O nwere ike

Ihe Baịbụl kwuru

“Amaara m nke ọma na Jehova ga-eme ka onye nọ n’ahụhụ nweta ihe ruuru ya, ka ndị ogbenye nweta ikpe ziri ezi.” (Abụ Ọma 140:12) Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi n’ụwa.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Chineke na-ahụ mmegbu a na-emegbu ndị mmadụ n’ụwa a, ọ ga-akwụsịkwa ya.—Ekliziastis 5:8.

  • Mgbe Chineke ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi n’ụwa, udo ga-adị ebe niile, obi eruokwa ndị mmadụ ala.—Aịzaya 32:16-18.

È nwere mba Chineke hụrụ n’anya karịa ibe ya?

Ụfọdụ ndị na-ekwu na Chineke bụrụ mba ụfọdụ ọnụ, gọziekwanụ ụfọdụ, ndị ọzọ ana-ekwu na Chineke hụrụ mba niile n’anya. Gịnị ka i chere?

Ihe Baịbụl kwuru

“Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) N’anya Chineke, mmadụ niile hà otu.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Baịbụl nwere “ozi ọma” maka “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile.”—Mkpughe 14:6.