Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Chere na Ọ Bụ Naanị Ha Na-ekpere Chineke Otú Ọ Chọrọ?

Ndịàmà Jehova Hà Chere na Ọ Bụ Naanị Ha Na-ekpere Chineke Otú Ọ Chọrọ?

 Ndị ji obi ha niile na-ekpere Chineke ga na-eche na ebe ha na-aga ekpere Chineke dị Chineke na Jizọs mma. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-akwụsị ịga ebe ahụ.

 Jizọs Kraịst asịghị na a ga-azọpụta onye nọ ebe ọ bụla masịrị ya ma ọ bụ onye si ụzọ ọ bụla masịrị ya na-efe Chineke. Kama, ọ sịrị na “ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:14) Obi siri Ndịàmà Jehova ike na ha achọtala ụzọ ahụ, ọ bụ ya mere ha ji nọsie ike ebe ha nọ.