Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime ma M Mechaa Baptizim?​—Nke 2: Nọgide Na-erubere Chineke Isi

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime ma M Mechaa Baptizim?​—Nke 2: Nọgide Na-erubere Chineke Isi

 Baịbụl kwuru na “Jehova agaghị ajụ inye ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ihe ọ bụla dị mma.” (Abụ Ọma 84:11) Gịnị ka mmadụ ‘enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta’ pụtara? Ọ pụtara mmadụ ịna-ebi ndụ otú ga-egosi na ọ na-emezu nkwa o kwere Jehova oge o nyefere ya onwe ya. (Ekliziastis 5:4, 5) Olee otú ị ga-esi nọgide na-erubere Chineke isi mgbe i mechara baptizim?

Ihe ndị a ga-ekwu n’isiokwu a

 Na-edi nsogbu

 Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Ọtụtụ nsogbu ga-abịara anyị tupu anyị abanye n’Alaeze Chineke.”​—Ọrụ Ndịozi 14:22.

 Ihe ọ pụtara: Nke bụ́ eziokwu bụ na nsogbu ga-abịara Ndị Kraịst niile. Ụfọdụ nsogbu ndị ga-abịara gị ga-abụ n’ihi na ị bụ Onye Kraịst, dị ka, iji gị eme ihe ọchị ma ọ bụ imegide gị. Nsogbu ndị ọzọ, dị ka, ụkọ ego ma ọ bụ ọrịa, na-abịara mmadụ niile.

 Ihe ị ga-atụ anya ya: Oge ụfọdụ, ihe nwere ike ịgbanwe ná ndụ gị, ha nwekwara ike ịgbanwe otú na-agaghị amasị gị. Baịbụl kwuru na ihe ọjọọ nwere ike ime onye ọ bụla, ma Onye Kraịst ma onye na-abụghị Onye Kraịst.​—Ekliziastis 9:11.

 Ihe i nwere ike ime: Ebe ọ bụ na ị ma na nsogbu ga-abịara gị, jikere imeri ha. Nsogbu bịara gị, were ya na ọ bụ oge ị ga-eji mee ka okwukwe gị sikwuo ike nakwa oge ị ga-eji atụkwasikwu Jehova obi. (Jems 1:2, 3) Ka oge na-aga, ị ga-enwe ike ikwu ihe Pọl onyeozi kwuru, ya bụ, “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.”​—Ndị Filipaị 4:13.

 AKỤKỌ MERE EME. “Obere oge m mechara baptizim, ụmụnne m ndị nwoke kwụsịrị ịbụ Ndịàmà Jehova, nne na nna m amalite ịrịa ọrịa, mụnwa arịawakwa ọrịa. Ọ gaara adịrị m mfe ịkwụsị ife Jehova ma chefuo na mgbe m nyefere ya onwe m, m kwere ya nkwa na ife ya ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ m. Ma, ihe nyeere m aka imeri nsogbu ndị ahụ niile bụ na m nyefere Jehova onwe m.”​—Karen.

 Ihe ga-enyere gị aka: Mụọ banyere Josef. I nwere ike ịgụ akụkọ ya na Jenesis isi 37 na isi 39 ruo 41. Chebara ihe ndị a echiche: Olee nsogbu ndị ọ na-atụghị anya ha bịaara ya? Olee otú o si merie ha? Oleekwa otú Jehova si nyere ya aka?

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka?

 Na-ezere ọnwụnwa

 Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Ọ bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ na-anwa onye ahụ, nwata ya.”​—Jems 1:14.

 Ihe ọ pụtara: Oge ụfọdụ, ihe ndị na-agụ anyị agụụ nwere ike ịbụrụ anyị ọnwụnwa. Ọ bụrụ na anyị ejideghị onwe anyị, o nwere ike ime ka anyị mee ihe ọjọọ.

 Ihe ị ga-atụ anya ya: I mechaa baptizim, ihe ọjọọ ka nwere ike ịgụ gị agụụ. (2 Pita 2:18) Ọnwụnwa nwedịrị ike ịbịara gị ka i nwee mmekọahụ tupu ị lụọ di ma ọ bụ nwunye.

 Ihe i nwere ike ime: Kpebie ugbu a, tupu ọnwụnwa abịara gị, na ị gaghị eme ihe ọjọọ ọ bụla ga-agụ gị agụụ. Cheta na Jizọs kwuru na “o nweghị onye ga-abụli ohu nna ukwu abụọ.” (Matiu 6:24) Ọ bụ gị ga-ekpebi onye ga-abụ nna gị ukwu. Kpebie na ọ bụ Jehova ka ị ga na-ege ntị. N’agbanyeghị otú ihe ọjọọ si na-agụ gị agụụ, ị ga-ekpebili ijide onwe gị.​—Ndị Galeshia 5:16.

 Ihe ga-enyere gị aka: Chọpụta ebe ị na-eme nke ọma na ebe ị na-emejọ. Mete ndị ga-enyere gị aka ịna-akpa ezigbo àgwà enyi. Zere ndị ga-eme ka ime ihe dị mma siere gị ike, agakwala ebe ga-eme ka ime ihe dị mma siere gị ike.​—Abụ Ọma 26:4, 5.

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka

 Na-anụkwu ọkụ n’obi

 Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Na-arụsi ọrụ ike otú ahụ . . . ruo ọgwụgwụ. . . . Anyị achọghị ka unu dịrị umengwụ.”​—Ndị Hibru 6:11, 12.

 Ihe ọ pụtara: Ọ bụrụ na uche mmadụ adịghị na ihe ọ na-arụ, ọ dị mfe ike ọrụ ịgwụ onye ahụ ma ọ bụ ya arụwa ya umengwụ umengwụ.

 Ihe ị ga-atụ anya ya: Ọ ga-abụ na obi tọrọ gị nnukwu ụtọ mgbe i mechara baptizim, gị ana-anụsikwu ọkụ ike n’obi. I ji obi gị niile hụ Jehova n’anya. Ma ka oge na-aga, o nwere ike ịna-esiri gị ike irubere Jehova isi n’ihe niile. Ihe a nwekwara ike ime ka ị daa mbà, mee ka ị ghara ịna-anụzi ọkụ n’obi.​—Ndị Galeshia 5:7.

 Ihe i nwere ike ime: Akwụsịla ịna-eme ihe ndị i kwesịrị ịna-eme, ọ bụrụgodị na obi gị adịchaghị na ha. (1 Ndị Kọrịnt 9:27) Na-abịarukwa Nna gị nke eluigwe nso. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-amụ banyere ya na ịna-ekpe ekpere. Na-emetekwu ndị hụrụ Jehova n’anya enyi.

 Ihe ga-enyere gị aka: Cheta na Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu, dịkwa njikere inyere gị aka. Echela na Jehova na-ewere gị iwe ma ọ bụrụ na ị kwụsịtụ ịnụ ọkụ n’obi. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike. Ọ na-emekwa ka ume ju onye na-enweghị ume obi.” (Aịzaya 40:29) Ka oge na-aga, ọ ga-agọzi mbọ ị na-agba ka ị malitekwa ịnụ okụ n’obi.

 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka

 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ị na-erubere Jehova isi, ị ga-eme ya obi ụtọ. (Ilu 27:11) Obi ga-adị ya ụtọ maka na i kpebiri ịkwado ya, ọ ga-enyekwa gị ihe niile ga-enyere gị aka imeri n’ọgụ Setan na-alụso gị.