Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 15

Ònye Bụ Jizọs?

Ònye Bụ Jizọs?

Jizọs bụ otu n’ime ndị a ma ama dịrị ndụ n’ụwa. Ma, e wezụga aha ya, e nweghị oké ihe gbasara ya ọtụtụ ndị mmadụ ma. Ọtụtụ ndị na-ekwukwa ihe dị iche iche gbasara onye ọ bụ n’eziokwu. Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara Jizọs?

1. Ònye bụ Jizọs?

Jizọs bụ mmụọ ozi dị ike bi n’eluigwe. Jehova Chineke kere ya tupu ya ekewe ihe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:​15) Baịbụl kpọrọ Jizọs “Ọkpara [Chineke] mụrụ naanị ya” maka na ọ bụ naanị ya ka Jehova kere n’onwe ya. (Jọn 3:​16) Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova rụkọrọ ọrụ, Jizọs enyere ya aka kee ihe ọzọ niile. (Gụọ Ilu 8:​30.) Jehova na Jizọs ka na-arụkọ ọrụ ruo taa. Jizọs ji obi ya niile na-ekwuchite ọnụ Chineke, ya bụ, ọ na-akụziri ndị mmadụ ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “Okwu ahụ.”​—Jọn 1:​14.

2. Gịnị mere Jizọs ji bịa n’ụwa?

Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Jehova rụrụ ọrụ ebube mgbe o ji mmụọ nsọ ya mee ka Jizọs, bụ́ mmụọ ozi dị ike bi n’eluigwe, bụrụzie nwa ọhụrụ n’ime afọ otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Meri. Otú a ka e si mụọ Jizọs n’ụwa, ya abụrụ mmadụ. (Gụọ Luk 1:​34, 35.) Jizọs bịara n’ụwa bụrụ Mezaya Chineke kwere ná nkwa, ma ọ bụ Kraịst. Ọ bịara ka ọ zọpụta ụmụ mmadụ. a Amụma niile Baịbụl buru gbasara onye ga-abụ Mezaya mezuchara n’isi Jizọs. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji mata na ọ bụ ya bụ “Kraịst, Ọkpara Chineke dị ndụ.”​—Matiu 16:16.

3. Olee ebe Jizọs nọ ugbu a?

Mgbe Jizọs nwụrụ, Chineke kpọlitere ya, ya abụrụ mmụọ ozi laghachi n’eluigwe. N’ebe ahụ, ‘Chineke bugoro ya n’ọkwá ka elu.’ (Ndị Filipaị 2:9) Ugbu a, Jizọs bụ mmụọ ozi dị ezigbo ike. Ọ bụ naanị Jehova ka ya ike.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo onye Jizọs bụ n’eziokwu nakwa ihe mere ịmụ gbasara ya ji dị ezigbo mkpa.

4. Jizọs abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile

Baịbụl kwuru na Jizọs bụ mmụọ ozi dị ike bi n’eluigwe. Ma, ọ na-erubere Jehova Chineke, bụ́ Nna ya, isi. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ihe Baịbụl kwuru gbasara otú Jizọs si dị iche na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile.

Amaokwu Baịbụl ndị a na-enyere anyị aka ịmata otú Jehova si dị iche na Jizọs. Gụọnụ ebe ndị a. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ ndị na-eso ya:

Gụọnụ Luk 1:​30-​32.

  • Ònye ka mmụọ ozi ahụ kwuru na Jizọs bụ? Ònyekwa ka o kwuru na Jehova Chineke, “Onye Kacha Elu,” bụ?

Gụọnụ Matiu 3:​16, 17.

  • Mgbe Jizọs mechara baptizim, gịnị ka otu olu si n’eluigwe kwuo?

  • Ònye ka i chere na ọ bụ ya nwe olu ahụ?

Gụọnụ Jọn 14:28.

  • Nna na nwa, ònye tọrọ ibe ya? Ònyekwa ka ibe ya?

  • Jizọs kpọrọ Jehova Nna ya, gịnị ka ihe a na-akụziri anyị?

Gụọnụ Jọn 12:49.

  • Jizọs ò chere na ya na Nna ya bụ otu onye? Gịnị ka i chere?

5. Ihe gosiri na Jizọs bụ Mezaya

E nwere amụma dị iche iche dị na Baịbụl ga-enyere ndị mmadụ aka ịmata onye bụ Mezaya, ya bụ, onye Chineke họọrọ ka ọ zọpụta ụmụ mmadụ. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ụfọdụ n’ime amụma ndị mezuru n’isi Jizọs mgbe ọ bịara n’ụwa.

Gụọnụ amụma ndị a dị na Baịbụl. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị na-eso ha:

Gụọnụ Maịka 5:2 ka unu hụ ebe e kwuru na a ga-amụ Mezaya. b

  • Amụma a ò mezuru mgbe a mụrụ Jizọs? ​—Matiu 2:1.

Gụọnụ Abụ Ọma 34:20 na Zekaraya 12:10 ka unu hụ amụma ndị e buru gbasara ọnwụ Mezaya.

  • Amụma ndị a hà mezuru?​—Jọn 19:​33-​37.

  • Ì chere na e nwere otú Jizọs si rụrụọ aka ka amụma a niile nwee ike imezu?

  • Gịnị ka ihe a na-akụziri gị gbasara Jizọs?

6. Ịmụ banyere Jizọs baara anyị uru

Baịbụl kwuru ihe mere ịmụ banyere Jizọs na ịmụ ihe Chineke chọrọ ka o mee ji dị ezigbo mkpa. Gụọnụ Jọn 14:6 na 17:3. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere ịmụ gbasara Jizọs ji dị mkpa?

Jizọs mepere ụzọ ga-eme ka anyị na Chineke bụrụ enyi. Ọ kụziri eziokwu gbasara Jehova, anyị nwekwara ike isi n’aka ya nweta ndụ ebighị ebi

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na Ndịàmà Jehova ekweghị na Jizọs.

  • Gịnị ka ị ga-agwa onye kwuru ụdị ihe a?

NCHỊKỌTA

Jizọs bụ mmụọ ozi dị ike. Ọ bụ Ọkpara Chineke, bụrụkwa Mezaya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere e ji akpọ Jizọs “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke”?

  • Gịnị bụ ọrụ Jizọs n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa?

  • Olee otú anyị si mara na ọ bụ Jizọs bụ Mezaya?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ma Baịbụl ọ̀ na-akụzi na Chineke mụrụ Jizọs otú ahụ ụmụ mmadụ si amụ ụmụ.

“Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú o si bụrụ na Baịbụl anaghị akụzi na Chineke dị Atọ n’Ime Otu.

“Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?” (Ụlọ Nche, Eprel 1, 2009)

Gụọ gbasara otú ndụ otu nwaanyị si gbanwee mgbe ọ chọpụtara ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Jizọs.

“Otú Otu Nwaanyị Si Kwụsị Ikpe Okpukpe Ndị Juu” (Teta!, Mee 2013)

a N’isi nke 26 na 27 anyị ga-amụta ihe mere e ji kwesị ịzọpụta ụmụ mmadụ nakwa otú Jizọs si zọpụta anyị.

b Gụọnụ Ihe nke 2 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A ka unu hụ mgbe e buru n’amụma na Mezaya ga-abịa n’ụwa.