Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Ụdị Ọbara I Nwere Na-ekpebi Ụdị Mmadụ Ị Ga-abụ?

Ọ̀ Bụ Ụdị Ọbara I Nwere Na-ekpebi Ụdị Mmadụ Ị Ga-abụ?

Echiche nke Bible

Ọ̀ Bụ Ụdị Ọbara I Nwere Na-ekpebi Ụdị Mmadụ Ị Ga-abụ?

IJI ụdị ọbara mmadụ nwere ekpebi ụdị onye ọ ga-abụ bụ ihe na-ewu ewu ná mba ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, na Japan, mgbe ndị ụfọdụ na-amalite nkwurịta okwu, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịjụ, sị, “Olee ụdị ọbara i nwere?” Ndị na-akwado echiche a na-ekwu na ndị nwere ụdị ọbara nke A na-adịkarị nwayọọ, na-eche echiche nke ọma, ma na-enyokarị ihe enyo; ndị nwere ụdị nke B na-enwekarị ezi obi, na-emesapụ aka, na-ajụ oyi, na-adị mfe nghọgbu; nakwa ihe ndị yiri ha. A na-ekwukwa na ọ pụrụ isiri onye nwere otu ụdị ọbara ike—ma ọ bụ dịrị ya mfe—iso onye nwere ụdị ọbara ọzọ na-emekọ ihe.

Dabere n’echiche a, ụfọdụ na-ele ụdị ọbara mmadụ nwere anya dị ka ihe dị mkpa mgbe ha na-atụle ìgwè nke ha ga-etinyegasị ụmụ akwụkwọ na ha n’ụlọ akwụkwọ, ndị ha ga-ahọrọ dị ka ndị isi n’ụlọ ọrụ, ma ọ bụ ọbụna onye ha ga-alụ. Ọ̀ dị ihe àmà ọ bụla e nwere na-egosi n’ezie na ụdị ọbara anyị nwere na-ekpebi ụdị mmadụ anyị ga-abụ? È nwere ozizi Bible ndị metụtara okwu a?

Olee Ụdị Ọbara Ndị E Nwere?

Akwụkwọ bụ́ The World Book Multimedia Encyclopedia na-akọwa, sị: “E nwere akụkụ mkpụrụ ndụ ọbara uhie nke nwere ụdị protein a na-akpọ antigen. A chọpụtawo ihe karịrị antigen 300 ná mkpụrụ ndụ ọbara uhie.” Ebe ụfọdụ ndị nwere ụdị antigen ụfọdụ, ndị ọzọ enweghị ha, ụfọdụ antigen enweghịkwa ike ịdị n’ebe ibe ha dị. N’ihi ya, dị ka akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ kwukwasịrị, “dabere n’ụdị antigen ọbara nwere ma ọ bụ nke ọ na-enweghị, ndị ọkà ihe ọmụma ekegasịwo ọbara mmadụ gaa n’ụdị dịgasị iche iche.”

A bịa n’ụzọ e si kegasịa ọbara, usoro a kasị anabata ebe nile bụ nke a kpọrọ ABO, bụ́ nke kewasịrị ọbara mmadụ gaa n’ụdị anọ —A, B, AB, nakwa O. Tụkwasị na nke a, a na-ejikarị usoro Rh eme ihe. N’ezie, e nwere ihe dị ka usoro 20 a maara e kegasịrị ọbara gaa na ha. N’ihi ya, o doro anya na ọbara nwere nnọọ ọtụtụ ihe mejupụtara ya. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke antigen ndị na-adị ná mkpụrụ ndụ ọbara uhie na-eme ka o sie nnọọ ike mmadụ abụọ ịbụ ndị ihe mejupụtara ọbara ha bụ otu ihe, ọ gwụla ma ha bụ ejima ndị yiri ibe ha.”

N’ikwu ya n’ụzọ doro anya, nke a na-enye echiche na onye ọ bụla nwere “ụdị ọbara” dị iche. N’ihi ya, ikwu na ndị nwere ụdị ọbara ụfọdụ na-akpa otu àgwà, yiri ka ò nwechaghị ihe mgbakwasị ụkwụ. O doro anya na ọtụtụ ihe na-eso ekpebi ụdị mmadụ anyị ga-abụ.

Gịnị Na-ekpebi Ụdị Mmadụ Anyị Ga-abụ?

‘Mgbe a na-ekwu ụdị onye mmadụ bụ, ihe a na-ekwu bụ àgwà ndị o bu pụta ụwa na ndị ọ mụtara amụta bụ́ ndị mere ka ọ dị iche n’ebe ndị ọzọ nọ,’ ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-akọwa. Ee, tụkwasị n’ihe ndị anyị ketara eketa, e nwekwara ihe ndị ọzọ—dị ka ebe ezinụlọ bi, agụmakwụkwọ, mkpakọrịta, na ahụmahụ, ma ndị dị mma ma ndị na-adịghị mma—na-emetụta ụdị mmadụ anyị ga-abụ. Ya mere, ọ bụghị nanị mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị na-ekpebi ụdị mmadụ anyị ga-abụ. Ọbụna ejima ndị yiri ibe ha, bụ́ ndị nwere otu ụdị mkpụrụ ndụ ihe nketa, na-akpakarị àgwà iche iche.

Eziokwu ọzọ dị mkpa bụ na mmadụ pụrụ ịgbanwe àgwà ya ma ọ bụ ihe ọzọ agbanwee ya. Pọl onyeozi mere ka ike ozizi Ndị Kraịst nwere n’ịgbanwe ndị mmadụ pụta ìhè. O dere, sị: “Yikwasịnụ onwe unu ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ, bụ́ nke a na-esite n’ezi ihe ọmụma na-eme ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ kere ya si dị.” (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ndị Kraịst maara na ha bụ ndị mmehie na ndị ketara ọchịchọ mmehie. Ka ha wee bụrụ ndị Chineke ga-anara nke ọma, àgwà ha aghaghị ịgbanwe.

Gịnị na-eme ka mgbanwe ndị dị otú ahụ kwee omume? Ọ bụ ike nke Okwu, ma ọ bụ ozi, Chineke. Banyere mmetụta siri ike okwu Chineke nwere, bụ́ nke a na-achọta ugbu a na Bible, Pọl dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, na-amapukwa amapu ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, nakwa nkwonkwo na ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Mgbe mmadụ kwere ka mmụọ Chineke nwee mmetụta n’ahụ́ ya ma na-agbalị ime ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ omume ọma ndị e dere na Bible, àgwà ya pụrụ iji nwayọọ nwayọọ gbanwee. Àgwà Ndị Kraịst ndị a na-azụlite n’ụzọ dị otú a na-agụnye “mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:12.

Ezi Uche nke Onye Kraịst

N’ezie, ọ dịghị ụkpụrụ Bible nke machibidoro mmadụ ịmụ banyere ụdị ọbara e nwere. Ma njikọ ọ bụla nke a pụrụ inwe n’akparamàgwà mmadụ bụ okwu ọzọ. Dịkwa ka ọ dị n’ihe nile a na-eme ná ndụ, anyị aghaghị ikwe ka Okwu Chineke na-eduzi nzọụkwụ anyị. (Abụ Ọma 119:105) Ezi uche dịkwa oké mkpa.—Ndị Filipaị 4:5.

N’ezie, ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya bụ́ mmadụ iji ụdị ọbara o nwere emere ihe ngọpụ maka ịghara ịgbalị imezi ebe àgwà ya gbara ọrụ. N’agbanyeghị ụdị mkpụrụ ndụ ihe nketa ha nwere, Ndị Kraịst aghaghị ịnọgide na-enwe ọganihu n’ịkpụzi àgwà ha ka ọ bụrụ nke na-egosipụta àgwà Jehova na Jizọs ruo ókè o kwere ha mee.—Ndị Efesọs 5:1.

Tụkwasị na nke a, Ndị Kraịst na-agbalịsi ike ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha. “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ 10:34, 35) Jehova na-eji obi ụtọ anabata ụdị mmadụ dị iche iche. N’ihi ya, ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya, na ihe na-abụghị omume Ndị Kraịst, bụ́ mmadụ izere iso ndị ụfọdụ na-akpakọrịta nanị n’ihi ụdị ọbara ha nwere. Ọ ga-adịkwa otú ahụ ma ọ bụrụ na mmadụ na-eso nanị ndị ọbara ya na ha “kwekọrọ” na-akpakọrịta. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na unu anọgide na-emelara mmadụ ihe, unu na-eme mmehie.”—Jems 2:9.

Ka sayensị na nkà na ụzụ na-enwe ọganihu, e nwere ọtụtụ ihe ọhụrụ ndị a na-achọpụta ma na-echepụta banyere ahụ́ mmadụ. Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ inwe mmasị banyere nchọpụta ndị a. Otú ọ dị, Ndị Kraịst kwesịrị ikwe ka Bible—ọ bụghị ihe mmadụ chepụtara—na-eduzi echiche ha. N’ihe nile ha na-eme ná ndụ, ọ dị Ndị Kraịst mkpa ‘ịnwapụta ihe nile’ nakwa ‘ijisi aka ike n’ihe dị mma.’—1 Ndị Tesalonaịka 5:21.