Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmata Ajọ Nsogbu Ihi Ụra

Ịmata Ajọ Nsogbu Ihi Ụra

Ịmata Ajọ Nsogbu Ihi Ụra

MGBE ụfọdụ, mgbaàmà ndị mmadụ na-enwe pụrụ igosi na o nwere ajọ nsogbu ihi ụra. Nsogbu na-ekweghị ala ala nke ehighị ụra nke ọma, bụ́ nke na-adịru ihe karịrị otu ọnwa, na nsogbu ndị ka njọ, gụnyere ịda mbà n’obi, na-agakọkarị. Nsogbu na-ekweghị ala ala nke ehighị ụra nke ọma pụkwara ịbụ ihe mgbaàmà nke ọrịa anụ ahụ́ nke siri ike.

Mkpachi Okpo Iku Ume n’Oge A Na-ehi Ụra

Mario na-enwe nsogbu nke ihi oké ụra n’ụbọchị. Ya kwọwa ụgbọala ezinụlọ ya, nwunye ya na-adị elegide ya anya, ebe ọ bụ na ọ na-adịkarị echefu onwe ya ruo nwa oge, bụ́ nke ọ na-adịkarịghị echeta. Ọ na-ekwo oké ụra n’ụzọ na-adịghị agakọ agakọ site n’oge ruo n’oge kwa abalị, mgbe ụfọdụkwa, ọ na-eteta n’ike, na-eku ume ọkụ ọkụ. *

Mario nwere ihe mgbaàmà ndị bụ́ isi na-egosi na okpo iku ume ya na-akpachi n’oge ọ na-ehi ụra. Ọ bụrụ na okpo iku ume akpachie mgbe mmadụ na-ehi ụra, ọ pụrụ ịdịru ihe dị ka sekọnd iri ruo minit abụọ ma ọ bụ atọ. Onye na-enwe nsogbu ahụ na-adị adagharị n’elu ihe ndina, na-eku ume ọkụ ọkụ, e mesịakwa ya ehighachi ụra, na-enwe nsogbu ahụ ọtụtụ narị ugboro n’abalị. E nwere ụdị atọ nke nsogbu mkpachi okpo iku ume n’oge a na-ehi ụra.

Ihe na-akpata ụdị nke mbụ bụ mgbe akụkụ ụbụrụ nke na-akpali iku ume na-akpalighị mmadụ iku ume mgbe nile. A bịa n’ụdị nke abụọ, oghere iku ume bụ́ nke dị n’azụ nkọlọ na-emechi nnọọ, na-egbochi ikuku ịgafe. Ụdị nke atọ bụ njikọ nke ụdị nke mbụ na nke abụọ, ọ bụkwa nke a kasị achọpụta n’ahụ́ ụmụ mmadụ. Ahụ́ nke onye nwere ụdị nke ọ bụla n’ime nsogbu nke mkpachi okpo iku ume pụrụ ịdịtewe ya ka nke onye na-ehighị ụra n’abalị dum, kwa ụbọchị!

Ndụ nke ndị na-enwe nsogbu mkpachi okpo iku ume n’oge ha na-ehi ụra pụrụ ịdị n’ihe ize ndụ, ebe ọ bụ na ụra pụrụ iburu ha mgbe ha na-arụ ọrụ ma ọ bụ na-akwọ ụgbọala. Ha pụrụ inwe ọbara mgbali elu, obi sakwuru mbara, nakwa ohere ka ukwuu nke inwe ọrịa strok ma ọ bụ obi ha ịkwụsị ịrụ ọrụ. Dr. William Dement nke nọ na Mahadum Stanford na-eme atụmatụ na ndị America dị 38,000 na-anwụ kwa afọ n’ihi ọrịa na-emetụta obi na akwara bụ́ nke mkpachi okpo iku ume n’oge a na-ehi ụra na-akpata.

Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị ikom buru oké ibu bụ́ ndị gafeworo afọ 40 na-enwekarị nsogbu mkpachi okpo iku ume n’oge ha na-ehi ụra, ọ pụrụ ime ndị nọ n’afọ ndụ ọ bụla, ọbụna ụmụaka. E nwere ụzọ dịgasị iche iche e si agwọ ya—ọ na-akasị mma ma ọ bụrụ onye dọkịta nke bụ́ ọkachamara n’ihe metụtara ụra na-ahụ maka ha. Ụzọ kasị dị irè nke isi gwọọ onye na-enwe nsogbu a, n’awaghị ya ahụ́, bụ site n’iji ígwè ọrụ na-adịghị anyụ anyụ nke na-ekunye ikuku n’oghere imi ya, na-eme ihe. Onye nwere nsogbu ahụ na-ekpu ihe n’imi ya n’abalị, ígwè ọrụ nke na-achịkwa ikuku (nke dọkịta gbanyere otú ga-ekwekọ n’ọnọdụ onye ahụ) na-ekunye kpọmkwem ikuku hà otú kwesịrịnụ n’imi ya iji mee ka okpo iku ume ya ghara ịkpachi. Ọ bụrụ na nke a agwọtaghị nsogbu ahụ, e nwere ọtụtụ ụzọ a pụrụ isi waa onye ahụ ahụ́, gụnyere iji ngwá ọrụ na-emepụta ụzarị ọkụ wepụ uru ahụ́ karịrị akarị dị ya na nkọlọ.

Nsogbu nke Ịda Ụra na Mberede

Nsogbu ihi ụra ọzọ nke na-achọ nlebara anya nke ndị ọrụ ahụ́ ike bụ nsogbu nke ịda ụra na mberede—nsogbu na-esite n’akwara ozi bụ́ nke na-akpata ihi oké ụra n’ụbọchị. Dị ka ihe atụ, ụra na-atụkarị Buck. Ọ na-ada ụra na mberede, ọbụna n’oge ọ nọ ná nzukọ ndị dị mkpa. Ọ malitere ijide ụyọkọ mkpịsị ugodi n’aka nke ọ ga-abụ, ọ bụrụ na ọ daa ụra na mberede, ụzụ ugodi ndị ahụ ga-eme ma ọ danahụ ya, ga-emete ya. E mesịa, ọ bịara nwee nsogbu nke na-akụjisi ya ikpere ma mee ka ọ daa mgbe ọ bụla o nwere oké obi ụtọ. E mesịa, ọ bịaziri na-enwe nsogbu nke ahụ́ nkụnwụ n’oge ọ chọrọ ihi ụra ma ọ bụ n’oge o tetara n’ụra, mgbe ụfọdụ, ọ na-amụ anya arọ nrọ obere oge tupu ụra eburu ya.

Nsogbu nke ịda ụra na mberede na-amalitekarị mgbe mmadụ nọ n’agbata afọ 10 na 30. Mgbe ụfọdụ, ndị nwere nsogbu ahụ na-amalite inwe nsogbu ọzọ a na-akpọ mmadụ ichezọ onwe ya, bụ́ nke onye ahụ na-eyi ka anya ò doro ya, ma ghara icheta na oge dị ukwuu agafeela. Ihe dị njọ n’ọrịa a bụ na a dịghị achọpụtakarị ya ruo ọtụtụ afọ, ebe a na-ele onye na-arịa ya anya dị ka onye umengwụ, onye ụbụrụ ya na-adịghị nkọ, ma ọ bụ onye gbapụrụ iche. Ka ọ dị ugbu a, a na-ele ya anya dị ka ihe a na-apụghị ịgwọta agwọta, ma a pụrụ ibelata ihe mgbaàmà ya site n’ịṅụ ọgwụ na ime mgbanwe n’ụzọ e si ebi ndụ—ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ịga nke ọma a na-enweta na-adịgasịkwa iche iche. *

Nsogbu Ihi Ụra Ndị Ọzọ

Nsogbu abụọ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-abịakọ ọnụ mgbe ụfọdụ, na-emetụta aka na ụkwụ kpọmkwem, na-akpata nsogbu ehighị ụra nke na-adịghị ala ala. Otu bụ nsogbu nke imegharị ụkwụ, nakwa mgbe ụfọdụ aka, site n’oge ruo n’oge mgbe a na-ehi ụra. Tụlee banyere Michael. Ahụ́ e lere ya gosiri na nsogbu nke imegharị ụkwụ site n’oge ruo n’oge na-emete ya n’ụra ihe dị ka ugboro 350 n’abalị ọ bụla!

Nsogbu ọzọ nke na-abịa nanị ya bụ nke ụkwụ anọghị jii, * bụ́ nke mmetụta ndị a na-enwe n’uru ahụ́ ndị dị n’ụkwụ nakwa n’ikpere na-eme ka ụkwụ nwee mkpali dị egwu nke imegharị emegharị, si otú ahụ na-egbochi onye nwere nsogbu ahụ ihi ụra. Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, a na-ekwu na ọ bụ enweghị mmega ahụ́ ma ọ bụ ọbara agagharịghị nke ọma n’ahụ́ na-akpata ọnọdụ a, o yiri ka ọ̀ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ ndị nwere caffeine na-akpata ya mgbe ụfọdụ. A maara ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya dị ka ihe so eme ka nsogbu a ka njọ mgbe ụfọdụ.

Nsogbu ọzọ bụ ịta ikikere ezé n’oge a na-ehi ụra. Ọ bụrụ na mmadụ na-ata ikikere ezé mgbe nile, ọ pụrụ ime ka ezé ya kwọchaa n’ụzọ dị njọ ma mee ka agbà na-egbu ya mgbu nke ukwuu, bụ́ nke ga-eme ka ọ ghara nnọọ ihi ụra nke ọma. Dabere n’otú nsogbu ahụ siruru n’ike, ụzọ ndị e si agwọ ya na-adịgasị iche, site n’ịwa onye ahụ ahụ́ n’ọnụ ruo n’ịkwụnye ya ihe n’ọnụ n’abalị.

Obere ntụle e mere banyere nsogbu ndị a na-enwe n’ihi ụra na-egosi na ileghara ha anya pụrụ ịdị ize ndụ. Ụzọ ndị e si agwọ ha pụrụ ịdị mfe ma ọ bụ sie ike, ma ọ na-adịkarị oké mkpa. Ọ bụrụ na gị ma ọ bụ onye ị hụrụ n’anya nwere nsogbu nke ehighị ụra nke ọma bụ́ nke na-ekweghị ala ala ma ọ bụkwanụ nwee mgbaàmà ndị na-egosipụta ajọ nsogbu ihi ụra, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya inweta enyemaka ndị ọkachamara n’egbughị oge. A sịgodị na ọgwụgwọ ahụ akwụsịghị nsogbu ndị ahụ kpam kpam, ọ pụrụ ibelata ihe ize ndụ ndị dị na ya ma mee ka ọnọdụ ahụ dịrị mmadụ nile mfe ịnagide. E mesịa, n’ọdịnihu, mgbe nkwa Bible ga-emezu, “onye obibi [Alaeze ahụ] agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” A ga-ewepụ nrịanrịa nile kpam kpam ka Chineke na-eme “ihe nile ka ha dị ọhụrụ.”—Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:3-5.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 E kwesịghị iwere ya na ụra a na-ekwo n’ụzọ na-adịghị agakọ agakọ bụ́ nke mkpachi okpo iku ume na-akpata bụ otu ihe ya na obere ụra a na-ekwo n’ụzọ na-agakọ agakọ bụ́ nke ọtụtụ ndị na-ekwo—nke nsogbu bụ́ isi ọ na-akpata bụ na ọ na-egbochi ndị ọzọ nọ n’ime ụlọ ahụ ihi ụra.

^ par. 11 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere nsogbu nke ịda ụra na mberede, lee Teta! (Bekee) nke April 8, 1991, peeji nke 19-21.

^ par. 14 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere nsogbu a, lee mbipụta Teta! nke December 8, 2000.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ọ bụ onye dọkịta kwesịrị iduzi ọgwụgwọ nke nsogbu ihi ụra

[Foto dị na peeji nke 10]

Ikwo ụra pụrụ ịbụ ihe mgbaàmà nke mkpachi okpo iku ume n’oge a na-ehi ụra

[Foto dị na peeji nke 11]

A na-aghọtahiekarị nsogbu nke ịda ụra na mberede dị ka umengwụ

[Foto dị na peeji nke 12]

Ígwè ọrụ ndị na-achịkwa ikuku pụrụ inye aka n’ibelata mkpachi okpo iku ume n’oge a na-ehi ụra