Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ito nke Ọma n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike

Ito nke Ọma n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike

Ito nke Ọma n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike

Dị ka e buru n’amụma na Bible, anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) Oké ọgba aghara ezinụlọ, nsogbu ahụ́ ike, na nchegbu banyere ego bụ nanị ụfọdụ n’ime ihe isi ike ndị ị pụrụ inwe. Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ iche na ị gaghị anagideli ha. Ka o sina dị, ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’agbanyeghị ihe isi ike. Tụlee ihe atụ na-esonụ.

Okooko osisi bụ́ Teide violet na-eto n’ebe ịdị elu ya fọrọ nke nta ka o ruo mita 3,700 n’àgwàetiti Tenerife ná mpụga ụsọ oké osimiri nke Ebe Ugwu Africa. Pico de Teide, bụ́ elu elu ugwu na-eme mgbọwa, nke e si na ya nweta aha e nyere okooko osisi ahụ, kpọliri nnọọ elu n’àgwàetiti ahụ dịdebere ebe okpomọkụ. O yiri ka ahịhịa ndụ adịghị n’ebe mgbago nke ugwu ahụ. Ma n’oge opupu ihe ubi, snow ndị na-agbaze agbaze bụ́ ndị na-ada n’oge oyi, na-eme ka e nwee mmiri zuru ezu iji mee ka okooko osisi violet ndị a na-adịghị anwụ ngwa ngwa dịghachi ndụ ma were okooko osisi na-acha odo odo chọọ ebe mgbago nke ugwu ahụ na-eme mgbọwa, mma. Ee, okooko osisi a pụrụ iyi ihe na-esichaghị ike, ma ọ na-agbalịsi ike ịdị ndụ ọbụnakwa na-eto nke ọma n’ebe a ọnọdụ tara akpụ, bụ́ nke ihe na-adịghị eto na ya.

Dịkwa ka Teide violet, ị pụrụ ịtachi obi n’ọnọdụ ndị tara akpụ. Bible enyeworo ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova aka ime otú ahụ ọbụna n’oge ihe kasị taa akpụ. Dị ka ihe atụ, ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi Germany jisiri nnọọ ike nwee ihe ịga nke ọma. “E mesoro ha omume ọjọọ karịa ìgwè ọ bụla ọzọ,” ka odeakụkọ bụ́ Björn Hallström nke Sweden na-ekwu, “ma site n’okwukwe ha nwere n’ebe Chineke nọ, ha gbalịsiri nnọọ ike ịdịgide ndụ karịa ndị ọ bụla ọzọ.”

Ọnọdụ ọ sọrọ gị nọrọ na ya, Bible pụrụ inyere gị aka inwe ihe ịga nke ọma n’agbanyeghị ihe isi ike. Kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị, ma ọ bụ deta akwụkwọ n’adres dị na peeji nke 5 nke magazin a maka inweta ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.