Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee Ihe Na-ekwesịghị Ekwesị na Foto A?

Chọpụta ihe atọ dị na foto a bụ́ ndị na-ekwekọghị n’ihe a kọrọ na Baịbụl na Jenesis 6:15; 7:1-9, 13-16, 23; 8:15-19.

1. ․․․․․

2. ․․․․․

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Levitikọs 11:3 na Diuterọnọmi 14:4.

3. ․․․․․

IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Diuterọnọmi 14:7-19.

IHE A GA-EKWURỊTA: Olee otú ụmụ Noa na ndị nwunye ha si nyere ya aka? Olee otú i nwere ike isi ṅomie ụmụ Noa?

Site na Magazin A

Zaa ajụjụ ndị a ma denye amaokwu Baịbụl (ndị) na-adịghị na ha.

PEEJI NKE 6 Olee ihe onye hụrụ ego n’anya na-emekataghị nwee? Ekliziastis 5:․․․

PEEJI NKE 9 Olee ndị ga-enwe obi ụtọ? Matiu 5:․․․

PEEJI NKE 10 Mgbe mmadụ na-ekpe ekpere, olee ihe ọ na-ekwesịghị ime? Matiu 6:․․․

PEEJI NKE 18 Olee ihe anyị kwesịrị ime nchegbu anyị niile? 1 Pita 5:․․․

Ònye So n’Ezinụlọ Jizọs?

Tụlee ihe ndị e depụtara iji nyere gị aka. Gụọ amaokwu Baịbụl ndị e depụtara. Denyezie aha kwesịrị ekwesị n’ohere e wepụtara.

4. ․․․․․

IJI NYERE GỊ AKA: N’agbanyeghị na nna m efeghị Jehova, abụ m eze nke ‘rapaara Jehova n’ahụ́.’

Gụọ 2 Ndị Eze 18:1-6.

5. ․․․․․

IJI NYERE GỊ AKA: Eji m ikike m nwere mee ihe na-adịghị mma site n’ịwụfu ọbara na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe ọ dị nnọọ ukwuu.

Gụọ 2 Ndị Eze 21:16.

6. ․․․․․

IJI NYERE GỊ AKA: Esooro m ihe nlereanya ọjọọ nke nna m, ndị na-ejere m ozi gbukwara m.

Gụọ 2 Ndị Eze 21:19-23.

AZỊZA

1. Ihu na azụ nke ụgbọ ahụ apịghị apị.

2. Noa chịịrị asaa n’ime anụ ọ bụla “dị ọcha,” dị ka atụrụ, banye n’ime ụgbọ ahụ.

3. Noa chịịrị naanị abụọ n’ime anụ ọ bụla “na-adịghị ọcha” banye n’ime ụgbọ ahụ.

4. Hezekaya.—Matiu 1:9.

5. Manase.—Matiu 1:10.

6. Emọn.—Matiu 1:10.