Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee otú m nwere ike isi mee ka ekpere m ka mma?

Olee otú m nwere ike isi mee ka ekpere m ka mma?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee otú m nwere ike isi mee ka ekpere m ka mma?

“Mgbe ụfọdụ, i nwee ọtụtụ ihe ime n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ, ma ọ bụ mgbe gị na ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị nwere ọtụtụ ihe unu ga-eme, ị na-echefu onye kasị mkpa—ya bụ Chineke.”—Faviola, onye dị afọ iri na ise, nke si United States.

“NA-EKPENỤ ekpere n’akwụsịghị akwụsị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) “Nọgidesienụ ike n’ekpere.” (Ndị Rom 12:12) “[Meenụ] ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” (Ndị Filipaị 4:6) Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst, o nwere ike ịbụ na ị maara amaokwu ndị a nke ọma. O nwekwara ike ịbụ na ị ghọtara na ekpere bụ ụzọ kasị mma e si enwe nkwurịta okwu. Chegodị echiche—i nwere ike ịgwa Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile okwu n’oge ọ bụla n’ụbọchị! Baịbụl kwukwara, sị: “Ọ na-anụ olu anyị.” *1 Jọn 5:14.

N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka onye ahụ na-eto eto e kwuru ihe o kwuru ná mmalite isiokwu a, o nwere ike ịbụ na ikpe ekpere na-esiri gị ike. Ya bụrụ otú ahụ, gịnị ka i nwere ike ime banyere ya? Isiokwu a ga-enyere gị aka (1) ịchọpụta ihe bụ́ nsogbu gị, (2) inwe ihe mgbaru ọsọ n’ihe metụtara ekpere gị, na (3) ịkpọghe “ọnụ ụzọ” nke ekpere ka i wee nwee ike iru ihe mgbaru ọsọ gị.

Nke mbụ, ka anyị chọpụta ihe bụ́ nsogbu gị. Olee ihe kasị esiri gị ike n’ihe banyere ekpere? Dee azịza gị n’okpuru ebe a.

․․․․․

Ihe ọzọ ị ga-eme bụ inwe ihe mgbaru ọsọ. N’okpuru ebe a, kanye ihe n’ihe mgbaru ọsọ nke ị ga-achọ iru, ma ọ bụ dee nke ị ga-achọ iru n’akara ahụ na-esote “Ihe Ọzọ.”

□ M ga-achọ ịdị na-ekpechikwu ekpere anya.

□ M ga-achọ ịdị na-ekpekwu ekpere banyere ihe dị iche iche.

□ M ga-achọ ka ekpere m na-esikwu m n’obi.

□ Ihe Ọzọ ․․․․․

Ịkpọghe “Ọnụ Ụzọ” Ahụ

Ekpere dị ka ọnụ ụzọ i nwere ike imeghe n’oge ọ bụla. Ma, ọtụtụ ndị ntorobịa ga-asị na ha anaghị emeghe ọnụ ụzọ ahụ mgbe mgbe dị ka ha kwesịrị, nakwa na ọ naghị adịrị ha mfe imeghe ya dị ka ha kwesịrị. Ya bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, ike agwụla gị! Ị chọpụtala ihe bụ́ nsogbu gị ma nwee ihe mgbaru ọsọ. Ihe dịzi gị mkpa bụ ịmata ihe ga-agwọta nsogbu gị. Tụlee ụfọdụ n’ime nsogbu ndị i nwere ike inwe nakwa aro ndị a tụrụ banyere otú ị ga-esi merie ha.

Nsogbu: NLEGHARA ANYA. “Mgbe ụfọdụ, n’ihi ọtụtụ ihe m nwere ime, m na-eleghara ekpere anya.”—Preeti, onye dị afọ iri abụọ, nke si Britain.

Ọgwụgwọ Ya: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.”—Ndị Efesọs 5:15, 16.

Aro: Buru ụzọ họrọ oge o yiri ka ọ̀ ga-akasị mma iji na-ekpe ekpere kwa ụbọchị. I nwedịrị ike idetu ya n’akwụkwọ, dị nnọọ ka ị na-edetu agba gị na mmadụ yiri iji nwee ike icheta ya. Yoshiko, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ nke bi na Japan kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ewepụtaghị m otu oge m ga-eji kpee ekpere, ihe ndị ọzọ na-ewekọrọ oge m niile.”

Nsogbu: IHE NDỌPỤ UCHE. “Ihe ọzọ na-adọpụkarị uche m, obi m na-apụkwa n’ihe m na-ekwu.”—Pamela, onye dị afọ iri na asaa, nke si Mexico.

Ọgwụgwọ Ya: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.”—Matiu 12:34.

Aro: Ọ bụrụ na obi gị ka na-awagharị n’ihe ndị ọzọ ma i kpewe ekpere, na-egbu ekpere gị nkenke—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ruo mgbe ị mụtara itinyekwu uche gị n’ihe ị na-ekwu. Aro ọzọ: Kpee ekpere banyere ihe ndị na-emetụ gị nnọọ n’obi. Marina, bụ́ onye dị afọ iri na anọ nke bi na Russia, kwuru, sị: “Ka m ruru afọ iri na atọ, amalitere m ịgwa onwe m na ekpere bụkwanụ mmadụ ịgwa Chineke okwu. Nke a mere ka m na-agwa Chineke obi m n’ekpere.”

Nsogbu: IKWU OTU IHE UGBORO UGBORO. “Achọpụtara m na m na-ekwu otu ihe ọtụtụ ugboro ma m kpewe ekpere.”—Dupe, onye dị afọ iri na asaa, nke si mba Benin.

Ọgwụgwọ Ya: “M ga-atụgharị uche n’ọrụ gị dum, m ga na-echebara ihe niile i mere echiche.”—Abụ Ọma 77:12.

Aro: Ọ bụrụ na ekpere gị aghọọla ekpere e bu n’isi, kwa ụbọchị, detuo otu ngọzi i nwetara ná ndụ gị. Kelezie Jehova maka ngọzi ahụ. Na-eme nke a ruo otu izu, ị ga-ahụkwa na i kpeela ekpere banyere ihe asaa dị iche iche n’ekwughachighị ihe ndị i kwurula mbụ. Na-emekwa otu ihe ahụ banyere ihe ndị mere n’ụbọchị. Bruno, bụ́ onye dị afọ iri abụọ na otu nke bi na Brazil, kwuru, sị: “M kpewe ekpere, m na-agbalị ikpe banyere ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ.” Samantha, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ nke bi na United States, na-emekwa otu ihe ahụ. O kwuru, sị: “M na-agbalị icheta ihe niile mere taa bụ́ ndị dị iche n’ihe ndị mere n’ụbọchị ndị ọzọ ma kpezie ekpere banyere ha. Nke ahụ na-enyere m aka ịghara ịdị na-ekwughachi otu ihe ugboro ugboro.” *

Nsogbu: OBI ABỤỌ. “Otu mgbe, ekpere m ekpere banyere otu nsogbu m na-enwe n’ụlọ akwụkwọ, ma nsogbu ahụ akwụsịghị. M nwekwudịrị nsogbu ndị ọzọ. Echere m, sị, ‘Ọ̀ ka bara uru ikpewe ekpere? Jehova anaghịnụ ege m ntị!’”—Minori, onye dị afọ iri na ise, nke si Japan.

Ọgwụgwọ Ya: “Mgbe ọnwụnwa bịara, [Jehova Chineke] ga-emere unu ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrịnt 10:13.

Aro: Otu ihe doro anya: Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ya mere, mgbe i kpechara ekpere banyere otu nsogbu, meghekwuo anya gị ịhụ ihe na-emenụ. Kama ịnọ na-eche inweta azịza ị na-atụ anya ya, lee ma ị̀ ga-ahụ nke a zarala aza. Ebe ọ bụ na ị ka na-atachi obi dị ka Onye Kraịst, o nwere nnọọ ike ịbụ na Jehova zara ekpere gị—ọ bụghị site n’iwepụ nsogbu ahụ kama site n’inye gị ike iji die ya.—Ndị Filipaị 4:13.

Nsogbu: IHERE. “Ọ na-abụ m chee ihe ụmụ klas anyị ga-ekwu ma ha hụ m ka m na-ekpe ekpere tupu mụ eriwe nri ehihie, ihere onwe m emewe m.”—Hikaru, onye dị afọ iri na asaa, nke si Japan.

Ọgwụgwọ Ya: “E nwere . . . oge kwesịrị ekwesị maka ihe niile anyị chọrọ ime.”—Ekliziastis 3:1, Beck.

Aro: Ọ bụ ezie na ikpe ekpere n’ime obi gị ebe ndị mmadụ na-ahụ gị nwere ike ime ka ha jaa gị mma, ọ bụghị iwu na ị ga-ekpe ekpere ebe ndị mmadụ ga-ahụ gị. Dị ka ihe atụ, o doro anya na nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Nehemaya ekpepụtaghị ekpere o kpere n’ihu Eze Atazaksis ekpepụta, ọ dịdịghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke gosiri na eze ahụ madị na ọ na-ekpe ekpere. (Nehemaya 2:1-5) Gị onwe gị kwa nwere ike ikpegara Jehova ekpere n’obi gị n’emeghị ka ndị mmadụ mara na ị na-ekpe ekpere.—Ndị Filipaị 4:5.

Nsogbu: MMADỤ ICHE NA YA ERUGHỊ ERU. “Jehova amarala nsogbu m. Ya bụrụkwa na ike nsogbu ndị ahụ agwụla m, echere m na o nwekwara ike ịbụ na ike ha agwụkwala ya! Mgbe ụfọdụ, ọ naghị adị m nnọọ ka m̀ ruru eru ịgwa ya okwu.”—Elizabeth, onye dị afọ iri abụọ, nke si Ireland.

Ọgwụgwọ Ya: “Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.

Aro: Wepụta oge nyochaa amaokwu Baịbụl ndị a ma tụgharịa uche na ha: Luk 12:6, 7; Jọn 6:44; Ndị Hibru 4:16; 6:10; 2 Pita 3:9. Amaokwu ndị a ga-eme ka ị ghọta na Jehova chọrọ ịnụ ekpere gị nakwa na ị gaghị abụ onye oké ezi omume tupu Chineke anụ ekpere gị. Ọbụ abụ bụ́ Devid—bụ́ onye maara otú nchegbu na ahụhụ na-adị—kwuru na obi siri ya ike na “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.” *Abụ Ọma 34:18.

Na Jehova na-ege ntị n’ekpere gị n’onwe ya kwesịrị ịgwa gị na o nwere mmasị n’ebe ị nọ. Nicole, bụ́ onye dị afọ iri na asaa nke si Ịtali kwuru, sị: “Jehova enyeghị ndị mmụọ ozi ọrụ ịṅa ntị n’ekpere anyị. Ebe ọ bụ na ọ na-aṅa ntị n’ekpere anyị n’onwe ya, ọ ga-abụrịrị na o ji ha kpọrọ ihe.”

Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ebe ọ bụ na ihe na-ekpebi ma Onye Okike ọ̀ ga-anụ ihe anyị na-ekwu abụghị ma ọ̀ dara ụda ma ọ bụ na ọ daghị, o nwedịrị ike “ịnụ” ekpere anyị kpere n’obi anyị n’ekwupụtaghị ya ekwupụta.—Abụ Ọma 19:14.

^ par. 32 Ya bụrụ na i chere na mmehie dị oké njọ i mere emeela ka Chineke ghara ịdị na-anụ ekpere gị, gbaa mbọ hụ na ị gwara ya ndị mụrụ gị. Ọzọkwa, “kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ [ka ha nyere gị aka].” (Jems 5:14) Ndị okenye nwere ike inyere gị aka mee ka gị na Chineke dịghachi ná mma.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee ihe ụfọdụ Jehova ji kpọrọ ihe bụ́ ndị i nwere ike ikpe ekpere banyere ha?

▪ Olee ihe ndị metụtara ndị ọzọ bụ́ ndị i nwere ike ịgwa Jehova n’ekpere?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

IHE NDỊ ỌGBỌ GỊ KWURU

“Ekpere dị ka ihe i deturu n’akwụkwọ nke naanị gị na Jehova na-ahụ.”—Olayinka, Nigeria.

“Ka e were ya na i nwere otu enyi gị na ya dị nnọọ ná mma, i nyekwala ya ọtụtụ onyinye. Otu ụbọchị, enyi gị ahụ akwụsịzie ighe gị ọnụ. Ọ bụ otú ahụ ka Jehova ga-esi lee ya anya ma anyị kwụsị ikpegara ya ekpere.”—Chinta, Australia.

“Kemgbe ụwa, ana m eche na ekwesịghị m ikwupụta otú obi dị m. Ihe ùgwù nke ikpe ekpere emeela ka m ghọta na o nweghị ihe o mere ma ọ bụrụ na mụ enwee obi ụtọ, nwee mwute, nweekwa ihe ndị gbagwojuru m anya ma gwa ha Jehova. Ugbu a, m na-ama ihe m ga-eme ma iwe jide m ma ọ bụ ma m nwee obi ụtọ ka m nwee ike ime ihe ga-abara m uru.”—Amber, United States.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ya bụrụ na ọnụ ụzọ nke ekpere yiri ka ọ̀ kpọchiri akpọchi, jiri ndụmọdụ ndị dị n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kpọghee ya