Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE BAỊBỤL KWURU

Okpukpe

Okpukpe

Gịnị mere okpukpe ji ju ebe niile?

“Unu na-ahapụ iwu Chineke ma na-agbasosi ọdịnala ụmụ mmadụ ike.”—Mak 7:8.

IHE BAỊBỤL KWURU

E kere ndị mmadụ otú ife ofufe ga na-agụ ha agụụ. (Matiu 5:3) Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji ekpe ọtụtụ okpukpe. Ihe ha na-ezi n’okpukpe ndị a bụ ozizi ụmụ mmadụ ọ bụghị nke si n’aka Chineke.

Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru banyere ndị nọ n’otu okpukpe e nwere n’oge ochie, sị: “Ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị; n’ihi na, ebe ha na-amaghị ezi omume Chineke, kama na-achọ ime ka ezi omume nke ha guzosie ike, ha edoghị onwe ha n’okpuru ezi omume Chineke.” (Ndị Rom 10:2, 3) Taa, e nwekwara ọtụtụ okpukpe “ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.”—Mak 7:7.

 Ọ̀ bụ iwu na mmadụ ga-enwe okpukpe ọ na-ekpe?

‘Ka anyị na-echebara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.’—Ndị Hibru 10:24, 25.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ndị Hibru isi iri amaokwu iri abụọ na ise sịrị “ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.” O gosiri na Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya nọrọ n’otu okpukpe. Ma, onye nke ọ bụla n’ime ha ò kwesịrị ịna-ekwu ihe o chepụtara gbasara Chineke ma ọ bụkwanụ chepụta otú o chere na Chineke chọrọ ka anyị si na-efe ya? Mba. Baịbụl kwuru na ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ ga “na-ekwu otu ihe,” dịkwa “n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu obi na n’otu echiche.” (1 Ndị Kọrịnt 1:10) A ga-ahazi ha ka ha nọrọ n’ọgbakọ dị iche iche nke okpukpe ahụ. Ha ga-ahụkwa ụmụnna ha dum n’ụwa n’anya. (1 Pita 2:17; 1 Ndị Kọrịnt 11:16) Onye chọrọ ife Chineke nke ọma kwesịrị ịnọ n’okpukpe a haziri nke ọma, nke ndị nọ na ya dịkwa n’otu.

Ànyị nwere ike ịmata okpukpe bụ nke ezigbo ya?

“Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:35.

IHE BAỊBỤL KWURU

Jizọs mere otu ihe atụ ga-enyere anyị aka ịmata okpukpe nke bụ ezigbo ya. Ọ sịrị: “Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha. Ọ dịghị mgbe ndị mmadụ na-aghọrọ mkpụrụ vaịn n’ogwu ma ọ bụ mkpụrụ fig n’uke, ka hà na-eme otú ahụ?” (Matiu 7:16) Mmadụ agaghị ebu ụzọ mụọ banyere osisi niile tupu ya amata ihe dị iche ná mkpụrụ fig na uke. N’otu aka ahụ, ị chọọ ịmata okpukpe bụ nke ezigbo ya, ị gaghị ebu ụzọ mụọ banyere okpukpe niile tupu ị mata ya. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị ga-eji mata okpukpe bụ nke ezigbo ya?

  • Ezigbo okpukpe na-akụzi eziokwu dị na Baịbụl. (Jọn 4:24; 17:17) Ha anaghị akụziri ndị mmadụ ozizi mmadụ.

  • Ezigbo okpukpe na-enyere ndị mmadụ aka ịmata Chineke nke ọma nakwa na aha ya bụ Jehova.—Jọn 17:3, 6.

  • Ọ na-akụziri ndị mmadụ na ọ bụ Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ bie na ọ bụghị ọchịchị ụmụ mmadụ.—Matiu 10:7; 24:14.

  • Ọ na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi na-ahụ ibe ha n’anya. (Jọn 13:35) Ọ na-akụziri ndị mmadụ ka ha hụ ndị si n’agbụrụ dị iche iche n’anya, ka ha jiri oge ha na ihe ndị ha nwere na-enyere ndị ọzọ aka, nakwa ka ha ghara ịna-alụ agha.—Maịka 4:1-4.

  • Ndị nọ n’ezigbo okpukpe na-akpa ezigbo àgwà mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe ha na-eme ihe gbasara Chineke. Ha abụghị ndị okwu ọzọ eme ọzọ.—Ndị Rom 2:21; 1 Jọn 3:18.

Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara magazin a. Ha na-agbalị ka ihe ha na-ekwu na àgwà ha na-akpa na-ewetara Chineke otuto. Gbaa mbọ gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova ka i jiri anya gị hụ.