Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Banyere Gị Na-emetụ Chineke n’Obi

Ihe Banyere Gị Na-emetụ Chineke n’Obi

Ọ BỤ Baịbụl ga-enye anyị ndụmọdụ ga-akacha abara anyị uru n’ihi na o si n’aka Chineke. Ọ bụghị akwụkwọ ahụ́ ike. Ma, e nwere ụzọ dị iche iche ọ ga-esi nyere anyị aka ka anyị mee ihe anyị kwesịrị ime n’oge ihe siiri anyị ike, n’oge isi na-agba anyị ghara ghara, n’oge obi na-ajọ anyị njọ, n’oge ahụ́ na-enye anyị nsogbu, nakwa n’oge isi na-akpakọchaghị anyị ọnụ.

Nke kacha mkpa bụ na Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na Onye kere anyị, bụ́ Jehova Chineke, a ghọtara ihe anyị na-eche n’echiche nakwa otú obi dị anyị karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ na-agụ ya agụụ inyere anyị aka ka anyị merie nsogbu ndị na-abịara anyị. Dị ka ihe atụ, legodị ihe na-akasi obi e kwuru n’amaokwu abụọ a na Baịbụl:

“Jehova nọ ndị obi gbawara nso. Ọ na-azọpụta ndị ike ụwa gwụrụ.”​—ABỤ ỌMA 34:18.

“Mụnwa, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m na-asị gị, ‘Atụla egwu. M ga-enyere gị aka.’”​—AỊZAYA 41:13.

Ma, olee otú Jehova si enyere anyị aka ime ihe anyị kwesịrị ime mgbe isi na-akpakọchaghị anyị ọnụ? N’isiokwu ndị na-eso nke a, anyị ga-ahụ ụzọ dị iche iche bara uru Jehova si egosi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.

a Jehova bụ ezigbo aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.