Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Akpakọghịzi Ọtụtụ Ndị Ọnụ n’Ụwa A

Isi Akpakọghịzi Ọtụtụ Ndị Ọnụ n’Ụwa A

“M na-echegbu onwe m mgbe niile, ma mgbe m nọ ọdụ naanị m n’ime ụlọ.”

“Mgbe ọ bụla obi dị m ezigbo ụtọ, m na-ebido chegbuwe onwe m. Amatala m na obi tọwahaala m ezigbo ụtọ, ihe na-esochi ya bụ ezigbo obi ọjọọ.”

“Ana m agbalị iwere ụbọchị ọ bụla otú m hụrụ ya, ma mgbe ụfọdụ, nsogbu na-abịara m otu mgbe na-abụ nke ọtụtụ ụbọchị.”

Ndị kwuru ihe ndị a bụ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ. Gịnwa ị̀ na-enwe ụdị nsogbu a ha na-enwe, ka è nwere onye ị̀ hụrụ n’anya na-enwe ya?

Ya bụrụ otú ahụ, obi sie gị ike na ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Ọrịa a na-emesi ọtụtụ ndị ike n’oge a, ma ndị na-arịa ya ma ndị nwere ndị na-arịa ya.

O doro anya na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, taakwa akpụ.’ Oge a na-akpatara ọtụtụ ndị ụdị nsogbu dị iche iche. (2 Timoti 3:1) Otu nchọpụta e mere gosiri na n’ụwa niile, isi akpakọchaghị ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ asatọ ọ bụla ọnụ. N’afọ 2020, ọrịa koronavaịrọs mere ka ndị na-echegbu onwe ha na ndị na-arịa isi mgbaka jiri ihe dị ka nde mmadụ iri asaa na asatọ (78,000,000) karịa mmadụ ole nwere nke ọ bụla n’ime nsogbu ndị a n’afọ 2019.

Ọ dị mma ịmara mmadụ ole na-echegbu onwe ha taa nakwa mmadụ ole na-arịa isi mgbaka. Ma, ihe ka mkpa i kwesịrị ịmata bụ otú ahụ́ dị ma gịnwa ma ndị ị hụrụ n’anya nakwa ihe ndị unu ga-eme ka ahụ́ dị unu mma.

Olee mgbe a ga-asị na isi kpakọrọ mmadụ ọnụ?

E nwere ike ikwu na isi kpakọrọ mmadụ ọnụ ma ọ bụrụ na obi na-adịkarị onye ahụ ụtọ, ya ana-emelikwa ihe ndị o kwesịrị ime. Ọ bụrụ na nsogbu na-abịara ndị ọzọ abịara ya, ọ ga-edili ya. Ọ ga na-arụsikwa ọrụ ike ma na-enwe obi ụtọ na ọ dị ndụ.

Ọ bụrụ na isi akpakọghị mmadụ ọnụ . . .

  • Ọ PỤTAGHỊ na ọ bụ onye ahụ kpatara ya.

  • Ọ PỤTARA na o nwere ọrịa na-akpa ya aka ọjọọ nke na-emekwa ka ọ ghara ịna-eche echiche nke ọma, ka obi ghara ịna-ezu ya ike, nakwa ka ọ na-emegheri emegheri.

  • O nwere ike ịna-emekarị ka ya na ndị ọzọ ghara ịna-adị ná mma nakwa ka ọ ghara ịna-emeli ihe ndị o kwesịrị ime kwa ụbọchị.

  • Ọ bụghị afọ ole ọ dị, omenala obodo ha, agbụrụ ya, ebo o si, ma ọ bụ okpukpe ọ na-ekpe kpatara ya. Ọrịa a nwere ike ịbịa onye ọ bụla, ma ndị gụrụ akwụkwọ ma ndị na-agụghị akwụkwọ, ma ndị nwere ego ma ndị na-enweghị ego.

Inyere ndị isi na-akpakọghị ọnụ aka

Ọ bụrụ na ahụ́ anọkata gbanwee gị ma ọ bụ onye gị, gị akpawazie àgwà otú ị na-anaghị akpabu, malite ịna-ehi oké ụra ma ọ bụ ghara ịna-ehi ụra nke ọma, malite ịna-eri oké nri ma ọ bụ ghara ịna-eriru nri otú ị na-eribu, ma ọ bụkwanụ malite ịna-echegbukarị onwe gị ma ọ bụ ịna-anọ ná mwute, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gakwuru ndị nsogbu a doro anya ka a chọpụta ihe na-eme gị ma gwọọ gị. Mana, olee ebe i kwesịrị ịga ka e nyere gị aka?

Jizọs Kraịst, nwoke kacha mara ihe dịtụrụla ndụ n’ụwa, sịrị: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.” (Matiu 9:12) Ọ bụrụ na e nye ndị na-arịa ọrịa ọgwụ kwesịrị ekwesị, nsogbu ọrịa ha na-enye ha na-ebelata, o nwekwara ike ime ka ndụ ha nwee isi ma na-atọ ha ụtọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ihe na-eme mmadụ akawa njọ ma ọ bụ dịtewe aka, ọ ka mma ịchọwa otú a ga-esi agwọ onye ahụ ozugbo. a

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ ahụ́ ike, mana ihe ndị e dere na ya nwere ike inyere mmadụ aka ka isi kpakọọ ya ọnụ. Biko, gụọ isiokwu ndị na-eso nke a. Ha ga-ekwu otú Baịbụl nwere ike isi nyere mmadụ aka ma ụdị ọrịa a bịa.

a Ụlọ Nche anaghị agwa mmadụ otú a ga-esi agwọ ya. Onye ọ bụla kwesịrị ịmata ụzọ ndị e nwere ike isi gwọọ ya ọrịa, ya asazie anya na mmiri kpebie nke ọ chọrọ.