Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ihe Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-eme Si Gbasa Anyị?

Olee Otú Ihe Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-eme Si Gbasa Anyị?

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Olee Otú Ihe Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-eme Si Gbasa Anyị?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Ole ndị bụ ndị mmụọ ozi?

Ndị mmụọ ozi bụ ndị mmụọ bi n’eluigwe. Ha ka ụmụ mmadụ ike. Chineke n’onwe ya bụkwa mmụọ, o kere ndị mmụọ ozi tupu ya ekee ụwa. (Job 38:4, 7; Matiu 18:10) E nwere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi ndị na-ejere Jehova ozi n’eluigwe.—Gụọ Abụ Ọma 103:20, 21; Daniel 7:9, 10.

2. Ndị mmụọ ozi hà na-enyere ndị mmadụ aka?

Ndị mmụọ ozi nyeere Lọt aka. Lọt bụ onye ezi omume. O biri n’otu obodo nke Chineke kwuru na ya ga-ebibi n’ihi ihe ọjọọ ndị obodo ahụ na-eme. Ndị mmụọ ozi abụọ Chineke zitere gwara Lọt na ezinụlọ ya ka ha gbapụ n’obodo ahụ. Ụfọdụ ndị Lọt gwara na a ga-ebibi obodo ahụ chere na ọ bụ egwuregwu ka Lọt na-egwu, ha agbapụghịkwa. Ma Lọt na ụmụ ya gbapụrụ. Chineke chebekwara ha n’ihi na ha gere ntị n’ihe ndị mmụọ ozi ahụ gwara ha.—Gụọ Jenesis 19:1, 13-17, 26.

Baịbụl kwuru na ndị mmụọ ozi na-enyekwara ndị mmadụ aka taa. Ha na-eduzi ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) E si n’ozi ọma a a na-ekwusa taa na-agwa ndị mmadụ na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume. Ọtụtụ ndị na-eche na ihe a ndị na-ekwusa ozi ọma na-agwa ha bụ egwuregwu otú ahụ ndị mmadụ chere n’oge Lọt, ma ọ bụghị egwuregwu. Ọ bụ Chineke si n’ọnụ ndị mmụọ ozi kwuo na ya ga-ebibi ndị ajọ omume.—Gụọ Mkpughe 1:1; 14:6, 7.

Chineke nwekwara ike isi n’aka ndị mmụọ ozi gbaa anyị ume mgbe anyị nọ ná nsogbu. O ji mmụọ ozi gbaa Jizọs ume mgbe ọ chọrọ enyemaka.—Gụọ Luk 22:41-43.

N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eji ndị mmụọ ozi bibie ndị ajọ omume bụ́ ndị na-akpatara ndị mmadụ ahụhụ. E bibichaa ha, ụmụ mmadụ ga-ekuru ume ndụ.—Gụọ 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8.

3. Ole ndị bụ ndị mmụọ ọjọọ?

Otú a e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-enupụrụ Chineke isi, e nwekwara ọtụtụ ndị mmụọ ozi ndị nupụụrụ Chineke isi. (2 Pita 2:4) Ihe a na-akpọ ha bụ ndị mmụọ ọjọọ. Onye mbụ ná ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi bụ Setan, bụ́ Ekwensu. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eduhie ndị mmadụ.—Gụọ Mkpughe 12:9.

Ihe Setan ji eduhie ndị mmadụ bụ ọchịchị, okpukpe ụgha, na azụmahịa aghụghọ. O ji ihe ndị a eme ka ndị mmadụ hapụ ife Chineke. N’ihi ya, ọ bụ Setan ka a ga-ata ụta maka mmegbu, ime ihe ike, na ahụhụ juru n’ụwa a.—Gụọ 1 Jọn 5:19.

4. Olee otú ndị mmụọ ọjọọ si eduhie ndị mmadụ?

Otu ụzọ Setan si eduhie ọtụtụ ndị bụ ịkụziri ha na ndị mmadụ na-aghọ ndị mmụọ ma ha nwụọ nakwa na ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ nwere ike ikwurịta okwu. Ma Baịbụl kwuru na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. (Ekliziastis 9:5) Ọtụtụ mgbe, ndị mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu ka à ga-asị na ha bụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ka ha wee ghọgbuo anyị. (Aịzaya 8:19) Ndị mmụọ ọjọọ na-esikwa n’aka ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, ndị na-eme anwansi, ndị dibịa afa, na ndị na-agụ kpakpando eduhie ndị mmadụ. Okwu Chineke gwara anyị ka anyị ghara ime nke ọ bụla n’ihe ndị a. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị nwere ihe ọ bụla gbasara ndị mmụọ ọjọọ na ndị na-eme anwansi, anyị kwesịrị ịtụfu ya.—Gụọ Diuterọnọmi 18:10, 11; Ọrụ Ndịozi 19:19.

Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị ekwesịghị ịtụ ndị mmụọ ọjọọ ụjọ. Mgbe anyị na-amụ Okwu Chineke ma na-eme ihe o kwuru, anyị na-eguzogide Ekwensu ma na-abịaru Chineke nso. Jehova ka ndị mmụọ ọjọọ ike. Ndị mmụọ ozi ya ga-enyere anyị aka mgbe anyị chọrọ enyemaka.—Gụọ Abụ Ọma 34:7; Jems 4:7, 8.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 10 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.